bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Job 9
Job 9
Igbo 2006
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 10 →
1
Job we za, si,
2
N'ezie amawom na ọ di otú a: Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?
3
Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.
4
O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?
5
Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya, Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya.
6
Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya, Ogidi-ya nile we ma jijiji.
7
Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa; Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.
8
Onye nání Ya nēseti elu-igwe, Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu.
9
Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida.
10
Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi; Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi.
11
Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya: Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya.
12
Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu? Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?
13
Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi; Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya.
14
Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya, Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?
15
Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya; Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.
16
Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam; M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;
17
Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru, Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.
18
Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu, Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.
19
Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya! Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?
20
Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe: Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.
21
Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim; Ajum ndum.
22
Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri, Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.
23
Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya, Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.
24
Enyewo uwa n'aka onye-nmehie: Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya; Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?
25
Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ: Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.
26
Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì: Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.
27
Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum, Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:
28
Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile, Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
29
Agama mu onwem ikpe; N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?
30
Ọ buru na ewerem miri snow sa arum, Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;
31
Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù, Uwem gākpọkwam ihe-árú.
32
N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya, Na ayi gābiakota n'ikpé.
33
Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi, Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.
34
Ya wezuga nkpa-n'aka-Ya n'arum, Ka oké ujọ-Ya ghara ime ka m'tua egwu nke-uku:
35
Ka m'kwue okwu, ghara itu egwu Ya; N'ihi na ọ bughi otú a ka m'di n'ebe mu onwem nọ.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42