bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Job 41
Job 41
Igbo 2006
← Chapter 40
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 42 →
1
Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi? Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?
2
Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya? Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?
3
Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara? Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?
4
Ò gēso gi b͕a ndu? Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?
5
Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu? Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?
6
Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia? Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia?
7
Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya? Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?
8
Tukwasi ya ọbu-aka-gi; Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.
9
Le, nchere-ya bu ihe-ugha: Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya?
10
Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya: Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum?
11
Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.
12
M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru, Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya.
13
Ònye kpugheworo iru uwe-ya? Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?
14
Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya? Ezé-ya di oké ujọ buruburu.
15
Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya, Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.
16
Dika otù si nọ ibe-ya nso, Ifufe adighi-abà n'etiti ha.
17
Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya; Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.
18
Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu, Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.
19
N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa, Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.
20
N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa, Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.
21
Iku-ume-ya nāmunye icheku, Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.
22
N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya, Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.
23
Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha: O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.
24
Obi-ya siri ike dika nkume; O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.
25
Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ: Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.
26
Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike; Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.
27
Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka, Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.
28
Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga: Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.
29
Anāgu ndele n'ahihia-ọka: Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.
30
Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ: Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.
31
Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite: Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.
32
Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya; Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.
33
Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa, Nke emeworo nēnweghi ujọ.
34
Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu: Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.
← Chapter 40
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 42 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42