bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 10
Luke 10
Igbo 1988
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 11 →
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs họpụtara iri mmadụ asaa ọzọ, zipụ ha abụọ abụọ, ka ha gaa nꞌobodo ukwu nile na nꞌobodo nta nile nke ọ na-ejikere ịbịa nꞌonwe ya.
2
Ọ gwara ha sị, “Mkpụrụ a ga-aghọ dị ukwuu ma ndị ọrụ dị nanị ole na ole. Kpeenụ ekpere rịọ Chineke onye nwe mkpụrụ ndị a ka o zite ndị ọrụ nꞌubi a.
3
Gaanụ, ma mgbe unu na-aga, chetanụ na ana m eziga unu dị ka unu bụ ụmụ atụrụ nọ nꞌetiti agụ.
4
Unu ewela ego ma ọ bụ akpa onye arịrịọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ. Unu ekelekwala onye ọ bụla unu zutere nꞌụzọ.
5
“Mgbe unu batara nꞌụlọ ọ bụla, ka okwu mbụ unu ga-ekwu bụrụ, ‘Udo dịrị ndị bi nꞌụlọ a.’
6
Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nꞌụlọ ahụ, mgbe ahụ udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nꞌụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitere unu.
7
“Mgbe unu batara nꞌobodo ọ bụla, unu esitela nꞌotu ụlọ gaa na nke ọzọ. Nọdụnụ nꞌotu ebe rie ma ṅụọkwa ihe ha nyere unu, nꞌihi na onye ọrụ ọ bụla kwesịrị ịnata ụgwọ ọrụ ya.
8
“Ọ bụrụ na ndị bi nꞌobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọ bụla ha nyere unu.
9
Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nꞌebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke abịala unu nso.’
10
“Kama ọ bụrụ na obodo ọ bụla ajụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nꞌokporo ụzọ obodo ahụ kwuo sị,
11
‘Anyị na-ehichapụ aja obodo a nyapagidere anyị nꞌụkwụ, na-ahapụrụ unu ya. Matakwanụ nꞌeziokwu na alaeze Chineke abịala unu nso.’
12
Eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, Chineke ga-emere obodo Sodọm ebere karịa obodo ndị jụrụ ịnabata unu.
13
Ahụhụ dị ukwuu na-eche gị, gị obodo Korazin. Ahụhụ dị ukwuu dịkwa na-eche gị, gị obodo Betsaida. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ nile m rụrụ nꞌime unu nꞌobodo Taịa na Saidọn, ha gaara echegharị kemgbe. Ha gaara eyi uwe nkịkara, wụkwasị onwe ha ntụ nꞌisi igosi na ha esitela na mmehie ha chegharịa.
14
Ka m gwa unu eziokwu, Chineke ga-emere Taịa na Saidọn ebere karịa obodo Korazin na Betsaida.
15
Ma gị obodo Kapanọm! Ị̀ na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịdaru ala mmụọ!”
16
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọ bụla gere ntị nꞌihe unu gwara ya, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọ bụla kwa jụrụ ịnabata unu, ọ bụ m ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọ bụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata Chineke onye zitere m.”
17
Emesịa, iri mmadụ asaa ahụ Jisọs zipụrụ jiri ọṅụ lọta gwa Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ọ bụladị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị sitere nꞌaha gị nye ha iwu ka ha pụta.”
18
Mgbe ahụ Jisọs kwuru okwu sị, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nꞌeluigwe daa dị ka mgbe amụma na-egbu na mbara eluigwe.
19
Geenụ ntị. Enyela m unu ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, ha agaghị emerụkwa unu ahụ. Enyekwala m unu ike imegide ike nile nke onye iro.
20
Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nꞌihi na mmụọ ọjọọ rubere isi mee ihe unu nyere ha nꞌiwu, kama ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi na e deela aha unu nꞌeluigwe.”
21
Mgbe ahụ, Jisọs, onye jupụtara nꞌọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuru okwu sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ekelee m gị nꞌihi na i zonarịrị ihe ndị a nꞌebe ndị ọkachamara na ndị ukwu nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a nile nye ndị na-amaghị ihe ọ bụla. Ee, Nna, ọ bụ gị siri otu a mee ya, nꞌihi na otu ahụ bụ ụzọ i siri chọọ ya.
22
Nna m enyela m ihe nile. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara Nna bụ, karịa Nna. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara Nna na ndị ahụ Ọkpara Nna chọrọ igosi onye Nna bụ.”
23
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Unu bụ ndị Chineke gọzịri nꞌihi na o mere ka unu hụ ihe ndị a unu na-ahụ ugbu a.
24
Nꞌezie, ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe unu na-anụ ugbu a, ma e nyeghị ha ohere ịhụ ya na ịnụ ya.”
25
Otu ụbọchị otu onye ozizi iwu bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị ya: “Onye ozizi, gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọọ iketa eluigwe?”
26
Jisọs zara ya sị, “Gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru banyere ajụjụ a? Gịnị ka ị gụtara?”
27
Nwoke ahụ zara ya sị, “Iwu ahụ sịrị, Ì kwesịrị iji obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na ike gị nile, na mmụọ gị nile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nꞌanya. I kwesịkwara ịhụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.”
28
Jisọs zara ya sị, “Ị zara nke ọma. Ugbu a, laa, gaa mee nke a: ị ga-enwekwa ogologo ndụ.”
29
Ma ebe nwoke ahụ na-ezi iwu chọrọ igosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye kwanụ bụ onye agbata obi m?”
30
Jisọs zara sị, “Ọ dị otu nwoke sitere nꞌobodo Jerusalem na-aga nꞌobodo Jeriko. Mgbe ọ na-aga nꞌụzọ, o zutere ndị ohi na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike, ndị napụrụ ya ihe nile o nwere, tie ya ihe, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụ ọnwụkamma laa.
31
“Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja nke ụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem sitere ụzọ ahụ na-aga njem ya. Mgbe ọ hụrụ nwoke a, o sitere nꞌakụkụ ụzọ ahụ gafee.
32
Otu a kwa, otu onye Livayị na-enyere ndị nchụaja aka nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke bịarutekwara nꞌebe nwoke ahụ tọgbọ nꞌala hụ ya. Ma o sitere nꞌakụkụ ụzọ ahụ gafeekwa.
33
“Ma otu onye Sameria, onye mba ọzọ, onye ndị Juu kpọrọ asị, sitere nꞌụzọ ahụ na-agakwa njem ya. Mgbe ọ bịarutere hụ ebe nwoke a tọgbọ nꞌala, o nwere ọmiko nꞌahụ ya.
34
O sitere nꞌelu inyinya ibu ya rịdata, gaa nso nꞌebe nwoke ahụ dina. O ji mmanya saa ọnya ya, tee ya mmanụ, were akwa kechie ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o buliri nwoke ahụ elu, tụkwasị ya nꞌelu inyinya ibu ya, buru ya gaa nꞌụlọ ndị ije, ebe ọ nọ lekọtazie ya anya nke ọma.
35
Nꞌechi ya, mgbe ọ na-akwado ịpụ, o wepụtara naịra abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie nwoke a anya nke ọma. Ọ bụrụ na i mefuo ego ọzọ karịrị ego a m nyere gị, mgbe m lọghachiri, aga m akwụ gị ya.’ ”
36
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ onye ozizi iwu ahụ sị, “Ònye nꞌime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbata obi nwoke ahụ ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike merụrụ ahụ?”
37
Onye ozizi iwu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ onye ahụ lekọtaziri ya anya nke ọma.” Mgbe ahụ Jisọs zara ya sị, “Ugbu a laa, gaa mee dị ka nwoke ahụ siri mee.”
38
Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gakwara nꞌihu nꞌije ha ịga Jerusalem. Emesịa, ha rutere obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata bi. Nwanyị a nabatakwara ha nꞌụlọ ya.
39
Mgbe Jisọs batara nꞌụlọ ahụ nọdụ ala, Meri nwanne Mata, bịara nọdụ nꞌala na-ege ntị nꞌihe Jisọs na-ekwu.
40
Mgbe ihe ndị a na-eme, Mata nọrị na-agbalị ikwado nri Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ga-eri. Ọ dịghị anya ọrụ a bidoro ịgbakasị ya ahụ nꞌihi na ọ bụ ọrụ dị ukwuu. Mgbe Mata na-enweghị ike idi ịrụ ọrụ a nanị ya, ọ pụtara jụọ Jisọs sị, “Onyenwe m, ọ̀ dị mma na Meri ga-ahapụrụ nanị m ọrụ ndị a nile? Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.”
41
Ma Jisọs zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-atụfu nnọọ oge ịdọgbu onwe gị nꞌọrụ dị iche iche.
42
Ma ọ bụ nanị otu ihe dị mkpa nꞌụwa, Meri nwanne gị achọtala ihe ahụ. Agaghị m anapụkwa ya ihe ahụ ọ chọtara!”
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24