bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 21
Luke 21
Igbo 1988
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 22 →
1
Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ dị na Jerusalem, o lere anya hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nꞌigbe onyinye.
2
Ọ hụkwara otu nwanyị onye ogbenye di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara nꞌebe ahụ tụnye nanị afụ abụọ.
3
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nꞌezie, ego nwanyị ogbenye a tinyere karịrị nke ndị ọzọ nile tinyere.
4
Nꞌihi na ọtụtụ ndị ọzọ sitere nꞌego mapụtaara ha nye onyinye ha, ma nwanyị ogbenye a sitere nꞌọnọdụ ogbenye ya tinye ego nile o nwere.”
5
Ụfọdụ nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ bidoro ikwu okwu banyere ụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ. Ha nọ na-ekwu okwu banyere otu ụlọ ahụ si maa mma, na nkume ọma e ji wuo ya. Ha kwukwara okwu banyere ụdị onyinye ndị mmadụ na-eche nꞌihu Chineke nꞌime ya.
6
Ma Jisọs zara ha sị, “Oge na-abịa mgbe ihe ndị a nile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. O nweghị otu nkume dị nꞌebe a nke ga-adịkwa nꞌelu ibe ya. A ga-akwatụ ihe nile.”
7
Ndị mmadụ ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụ ihe ga-eme tupuu anyị amata na ihe ndị a na-aga ime?”
8
Jisọs zara ha sị, “Kpacharanụ anya unu, ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa nꞌoge dị nꞌihu, ndị ga-asị na ha bụ Kraịst, onye nzọpụta ahụ. Ha ga-asịkwa na oge ahụ eruola. Ma unu esokwala ha.
9
Unu ga-anụ akụkọ agha na ọgba aghara nꞌebe nile, ma ka ụjọ ghara ịtụ unu. Nꞌihi na ihe ndị a nile ga-ebu ụzọ mezuo, ma nke a egosighị na ọgwụgwụ ihe nile abịala.
10
Otu mba ga-ebili ịlụ ọgụ megide mba ọzọ, otu alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ.
11
A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nꞌebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe ga-eweta egwu na mbara eluigwe na ihe ngosi dị egwu.
12
“Ma tupuu ihe ndị a nile emezuo, ndị mmadụ ga-ejide unu, kpagbuokwa unu. Ha ga-akpọrọ unu gaa nꞌụlọ ekpere ikpe unu ikpe. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-ebo unu ebubo nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m.
13
Ma oge a bụ oge unu ga-eji gbaa ama banyere m.
14
Kpebienụ nꞌobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu.
15
Nꞌihi na aga m enye unu okwu amamihe unu ga-ekwu, ụdị amamihe na okwu nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike imegide ma ọ bụ imeri.
16
Ọ bụladị ndị mụrụ unu na ndị ikwu unu na ndị enyi unu ga-enyefe unu nꞌaka ndị ga-ekpe unu ikpe. A ga-egbukwa ụfọdụ nꞌime unu.
17
Mmadụ nile ga-akpọ unu asị nꞌihi m.
18
Ma chetanụ na otu agịrị isi dị nꞌisi unu agaghị efu.
19
Kama tachienụ obi, nwee ndidi, nꞌihi na ọ bụ otu a ka unu ga-esi zọpụta ndụ unu.
20
“Mgbe unu hụrụ ka ndị iro gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nꞌiyi eruola.
21
Nꞌoge ahụ ọ bụrụ na unu nọ na Judia, gbalaganụ gaa nꞌelu ugwu. Ọ bụrụ na unu nọ nꞌime obodo, sinụ nꞌime ya gbapụta. Onye na-anọghị nꞌime obodo, ya gbalaga ghara ịbanye nꞌime ya.
22
Nꞌihi na oge ahụ bụ oge ntaramahụhụ imezu ihe nile akwụkwọ nsọ kwuru mezuo.
23
Ebere na-emere m ụmụ nwanyị ji nwa nꞌaka nꞌụbọchị ahụ. Ebere na-emekwara m ụmụ nwanyị na-enye ụmụntakịrị ara nꞌụbọchị ndị ahụ. Ahụhụ dị ukwuu ga-adị nꞌala a, nꞌihi na Chineke ga-egosi iwe ya megide ndị Izirel.
24
A ga-eji mma agha gbuo ha, kpụrụ ụfọdụ dị ka ndị a dọtara nꞌagha gaa nꞌobodo dị iche iche nke ụwa. Ndị mba ọzọ ga-achị Jerusalem, mesoo ya mmeso dị ka ha si chọọ, tutuu ruo oge Chineke kara aka na ọchịchị ha ga-agwụ.
25
“Ihe ịrịba ama na ìhè ngosi ga-apụta ìhè nꞌanwụ na nꞌọnwa ya na kpakpando. Oke ịta ahụhụ ga-adakwasịkwa mba nile dị nꞌụwa. Ndị mmadụ ga-anọ nꞌoke mgbagwoju anya. Ụjọ ga-ejupụtakwa obi ha mgbe ọ bụla ebili mmiri nke oke osimiri mere mkpọtụ.
26
Ndị mmadụ ga-ada mba nꞌihi ụjọ nke ga-atụ ha maka ihe na-abịakwasị ụwa. Nꞌihi na a ga-eme ka ike nile jikọtara eluigwe maa jijiji.
27
Nꞌoge ahụ ndị mmadụ ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka m ji ike na ebube dị egwu na-abịa nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe.
28
Mgbe ihe ndị a nile bidoro ime, guzonụ lelie anya elu nꞌihi na oge ahụ adịla nso mgbe Chineke ga-azọpụta unu.”
29
Mgbe ahụ Jisọs tụụrụ ha ilu iji kọwaa okwu ndị a ọ gwara ha. Ọ sịrị, “Leenụ anya nꞌosisi fiigi.
30
Mgbe ọ bụla osisi fiigi wepụtara ahịhịa ndụ ọhụrụ, unu onwe unu na-ahụ, matakwa na oge ọkọchị adịla nso.
31
Nꞌụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a nile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke dị nso.
32
“Nꞌezie, ọgbọ a agaghị agabiga tutuu ihe ndị a nile emezuo.
33
Eluigwe na ụwa pụrụ ịgabiga, bụrụ ihe na-agaghị adịkwa, ma okwu m ndị a agaghị agabiga.
34
“Kpacharanụ anya ka unu hapụ ibi ndụ iri oke nri na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Kpachakwaranụ anya ka ibi ndụ unu hapụ ijubiga nꞌoke echiche banyere ihe nke ụwa, nke ga-eme ka unu hapụ ịnọ na njikere mgbe m ga-abịa.
35
Nꞌihi na ọbịbịa m ga-abụ nnọọ na mberede, ọtụtụ mmadụ agakwaghị anọ na njikere mgbe m ga-abịa.
36
Ma nọọnụ na nche oge nile. Kpeerenụ Chineke ekpere ka o nye unu ike ịgbanarị ihe ndị a nile nke na-aga ime. Ka o nyekwa unu ike iguzo nꞌihu m mgbe m ga-alọghachi.”
37
Ụbọchị nile Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ na-ezi ihe, ma nꞌoge anyasị, ọ na-ahapụ Jerusalem pụọ gaa hie ụra nꞌelu ugwu olivu.
38
Nꞌisi ụtụtụ nile kwa, ndị mmadụ nile ahụ na-abịakwute ya nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, ịnụrụ okwu ya.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24