bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 15
Luke 15
Igbo 1988
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 16 →
1
Otu ụbọchị ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịakwutere Jisọs ịnụrụ ihe ọ na-ekwu.
2
Mgbe ndị Farisii na ndị na-ezi iwu hụrụ ha, ha tamụrụ ntamụ megide Jisọs sị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie. Ọ na-esokwa ha eri nri.”
3
Jisọs gwara ndị Farisii na ndị ozizi iwu okwu sị, “Ọ bụrụ na otu onye nꞌime unu enwee narị atụrụ ma otu nꞌime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị ahapụ iri atụrụ toolu na toolu ahụ fọdụrụ afọdụ pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru akpafu nꞌọzara nile tutuu ọ chọta ya?
5
Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị eburu ya tụkwasị ya nꞌolu ya bulata nꞌụlọ ya ebe atụrụ ndị ọzọ nọ?
6
Mgbe ọ lọtara ụlọ, gịnị ka ọ ga-eme? Nꞌezie, asị m unu, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha, ‘Bịanụ soro m ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na achọtala m atụrụ m kpafuru akpafu.’
7
“Nꞌụzọ dị otu a, ọṅụ na-adị nꞌeluigwe nꞌihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa ndị ezi omume iri toolu na toolu ndị mkpa nzọpụta na-adịghị akpa.
8
“Ọ bụrụ na otu nwanyị nwere mkpụrụ ọlaọcha iri ma otu nꞌime ha adafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị amụnye ọkụ were azịza zaa ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutuu ọ chọta ya.
9
Mgbe nwanyị ahụ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme? Ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha bịa soro ya ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na ya achọtala otu mkpụrụ ego furu efu.
10
Nꞌụzọ dị otu a kwa, ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi nꞌeluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị.”
11
Mgbe ahụ Jisọs kọkwaara ha akụkọ ọzọ sị ha, “E nwere otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ.
12
Nwa ya nwoke nke nta bịakwutere nna ya otu ụbọchị sị ya, ‘Nna m, kenye m ugbu a, site nꞌakụ na ụba i nwere, ihe m kwesịrị iketa mgbe i nwụrụ.’ Nna ya kenyere nwa ya ahụ ihe o kwesịrị iketa.
13
“Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorọbịa ahụ kwakọtara ihe nile o nwere hapụ ezi nna ya gaa biri nꞌotu obodo dị nnọọ anya. Nꞌebe ahụ, o mefuchara ego nile o nwere na ndụ ọjọọ.
14
Mgbe ọ zụfuchara ego nile o nwere, ụnwụ bidoro nꞌobodo ahụ, nke mere ka nwokorọbịa ahụ bido ịnọ agụụ.
15
Nꞌihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ, onye nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri.
16
Ma agụụ gụrụ nwokorọbịa a nke ukwuu, mee ya ka ọ chọọ iri site na nri ọ na-enye ezi, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ ka o rie.
17
“Otu ụbọchị, mgbe ọ nọdụrụ chee echiche banyere ọnọdụ ya, ọ jụrụ onwe ya ajụjụ sị, ‘Nꞌihi gịnị ka m ga-eji nwụọ nꞌagụụ nꞌebe a mgbe nna m nwere ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi, ndị nwere nri na-ezuru ha mapụtakwa?’
18
O kpebiri nꞌobi ya sị, ‘Aga m alaghachikwuru nna m. M ruo ebe ahụ, aga m agwa ya sị, Nna m, emehiela m megide Chineke. Emehiekwala m megide gị. Ekwesikwaghị ka a kpọọ nwa gị ọzọ. Biko were m ka m bụrụ otu nꞌime ndị na-ejere gị ozi.’
20
“Mgbe nwokorọbịa a nwere mkpebi a nꞌime onwe ya, ọ hapụrụ obodo ahụ ịlaghachikwuru nna ya. Ma mgbe ọ nọrịị ebe dị anya na-alọta, nna ya lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, nwee ọmiko nꞌahụ ya. O si nꞌụlọ ya gbapụta, gaa zute ya, bakụọ ya, kelee ya.
21
“Mgbe ahụ nwokorọbịa ahụ gwara nna ya sị, ‘Nna m, emehiela m megide gị. Emehiekwala m megide Chineke. Ekwesịghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’
22
“Ma nna ya gwara otu onye na-ejere ya ozi sị, ‘Mee ngwangwa weta uwe kachasị mma dị nꞌụlọ bịa yikwasị nwa m uwe ahụ. Gbanyekwa ya ọla nꞌaka, nyekwa ya akpụkpọ ụkwụ ka o yiri,
23
gaakwa kpụpụta otu ehi gbara abụba gbuo ya ka anyị na ndị enyị anyị soro rie.
24
Nꞌihi na nwa m a, ka m gụrụ dị ka onye furu efu. Ma ugbu a a chọtala ya.’ Emesịa, ha bidoro iri na ịṅụ na ịṅụrị ọṅụ.
25
“Ọ dịghị anya ọkpara nwoke a, onye jere ịrụ ọrụ nꞌubi bidoro ịlọta nꞌụlọ. Mgbe ọ na-abịa nso ọ nụrụ ụda egwu, nụkwa ụda aṅụrị na ite egwu.
26
Ọ kpọrọ otu nꞌime ndị na-eje ozi jụọ ya sị, ‘Gịnị mere egwu ji na-ada, ndị mmadụ na-etekwa egwu?’
27
“Odibo ahụ zara ya sị, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna unu gburu ehi gbara abụba nꞌihi na ọ lọtara nꞌudo.’
28
“Mgbe ọkpara nwoke ahụ nụrụ okwu a, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ịbata nꞌụlọ ahụ. Mgbe nna ya matara ihe mere, ọ pụtara nꞌezi rịọ ya ka ọ bata.
29
Ma ọ gwara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ nile ndị a m nọrọ na-ejere gị ozi, enupụghị m isi nꞌụzọ ọ bụla. Ma o nweghị oge i ji nye m ọ bụladị ewu ntakịrị sị mụ na ndị enyị m jiri ya mere oriri.
30
Ma ugbu a, nwa gị a alọtala. Onye mefusiri ego nile i nwere nꞌebe ụmụ akwụla nọ. Ọ bụ ya ka i gbuuru ehi gbara abụba!’
31
“Mgbe ahụ nna ya zara ọkpara ya sị, ‘Nwa m, ọ bụ mụ na gị nọ kemgbe, ị makwaara na ihe nile m nwere bụ nke gị.
32
Anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ, kpọọ oriri, nꞌihi na onye a bụ nwanne afọ gị, onye anyị gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ, ma ugbu a ọ dịkwala ndụ. Ọ bụkwa onye furu efu a chọtara.’ ”
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
Recommended Reading
Commentary
Luke Commentaries
→
Devotional
Luke Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→