bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 2
Luke 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 3 →
1
Nꞌoge a, Siza Ọgọstọs onye bụ onye na-achị alaeze ndị Rom, nyere iwu ka a gụọ onye ọ bụla nọ nꞌalaeze ya ọnụ.
2
(Nke a bụ igụ mmadụ onụ nke mbụ e nyere iwu ya mgbe Kwirinus na-achi akụkụ Siria.)
3
Nꞌihi iwu ịgụ mmadụ ọnụ a, onye ọ bụla gara nꞌobodo nke a mụrụ ya idenye aha ya nꞌakwụkwọ.
4
Josef onye bi nꞌobodo Nazaret nke dị na Galili, hapụrụ ebe ahụ gaa Judia. Na Judia, ọ gakwara nꞌobodo nke a mụrụ ya, bụ Betilehem. Betilehem bụkwa ebe a nọ mụọ Devidi. Ya mere, Josef gara Betilehem nꞌihi na o si nꞌagbụrụ Devidi.
5
Josef gara ebe ahụ idenye aha ya nꞌakwụkwọ. Ya na Meri nwagbọghọ ọ na-achọ ịlụ sokwa gaa. Nꞌoge a Meri dị ime.
6
Mgbe ha nọ na Betilehem maka ịgụ ọnụ a, oge Meri ga-eji mụọ nwa ya zuru.
7
Ọ mụpụtakwara nwa mbụ ya, nwa nwoke. O ji akwa kee ya, nyibe ya nꞌụlọ a na-edebe anụ ụlọ, nꞌihi na ha enwetaghị ebe ndina nꞌụlọ ndị ije dị nꞌobodo Betilehem.
8
Nꞌoge a, e nwere ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ na-elekọta igwe atụrụ ha, nꞌazụ obodo nta Betilehem nꞌabalị ụbọchị ahụ.
9
Na mberede, ndị ọzụzụ atụrụ a hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ọ bịara guzo nꞌihu ha. Ebube Chineke gbakwara ha gburugburu mee ka ìhè jupụta nꞌebe ahụ ha nọ dị ka a ga-asị na ọ bụkwaghị abalị. Oke egwu tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ.
10
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ha okwu sị ha, “Unu atụla egwu nìhi na ewtaara m unu ozi oma nke na-eweta oke ọṅụ, bụ ọṅụ ga-adịrị mmadụ nile.
11
Nꞌihi na taa, na Betilehem, obodo Devidi, ka a nọ mụọra unu onye nzọpụta nke bụ onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara!
12
Unu ga-esi aṅaa chọta ya? Ọ bụrụ na unu abaa nꞌime obodo, unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e jiri akwa kee, nyibe ya nꞌala nꞌụlọ a na-edebe anụ.”
13
Mgbe mmụọ ozi a kpụ okwu ndị a nꞌọnụ na-ekwu, na mberede, igwe mmụọ ozi pụtara soro mmụọ ozi a, ee, ọtụtụ igwe mmụọ ozi nke eluigwe pụtara, soro mmụọ ozi a bido ịbụ abụ na ito Chineke na-asị,
14
“Otuto dịrị Chineke nꞌebe kachasị elu nke eluigwe, udo nꞌelu ụwa nye ndị nile ihe ha dị Chineke mma.”
15
Mgbe ndị mmụọ ozi a laghachiri nꞌeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betilehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a dị egwu nke Onyenwe anyị gwara anyị site nꞌọnụ mmụọ ozi.”
16
Ha jiri ọsọ jeruo Betilehem. Ha chọtara Meri na Josef, hụkwa nwa ọhụrụ ahụ ka o dina nꞌụlọ anụ.
17
Mgbe ha kelesịrị ya, ha pụrụ kọọrọ onye ọ bụla ha hụrụ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ha banyere nwanta a.
18
Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị nile nụrụ ya anya.
19
Ma Meri nꞌonwe ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya, cheekwa echiche banyere ha.
20
Nꞌikpeazụ, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri azụ nꞌebe igwe atụrụ ha nọ. Mgbe ha na-aga, ha na-eto Chineke nꞌihi ihe ha nụrụ, na nꞌihi ihe ha hụkwara. Nꞌihi na ihe nile ha hụrụ dị, dị ka mmụọ ozi ahụ gwara ha.
21
Nꞌụbọchị nke asatọ ya, mgbe oge ruru ibi nwanta ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi sị na a ga-akpọ ya tupuu Meri adịrị ime.
22
Mgbe oge ruru inye onyinye nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem, Meri na Josef na nwa ọhụrụ ahụ gara Jerusalem. Meri gara inye onyinye maka ịdị ọcha dị ka e nyere nꞌiwu Mosisi na nwanyị ọ bụla mụrụ nwa ọhụrụ ga-enye, na ikuputa nwa ọhụrụ ahụ nꞌihu Chineke.
23
Ikupụta nwa ọhụrụ ahụ bụkwa imezu iwu nke sị, “Ọ bụrụ na nwa mbụ nwanyị mụrụ bụ nwoke, nwa ahụ bụ nke Chineke.”
24
Meri na Josef gara ka ha jiri ụmụ kpalakwukwu abụọ ma ọ bụ ụmụ nduru abụọ nye Chineke onyinye dị ka e nyere ya nꞌiwu.
25
Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Simiọn bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye ji obi ya nile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya ịhụ mgbe Chineke ga-azọpụta ndị Izirel.
26
Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka Simiọn mata na ọ gaghị anwụ tutuu ruo mgbe ọ hụrụ Onye nzọpụta ahụ Chineke kwere nkwa izite.
27
Nꞌụbọchị ahụ Meri na Josef kuuru Jisọs bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, imere ya ihe iwu kwuru, Mmụọ Nsọ kwalikwara Simiọn, mee ya ka ọ bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ.
28
Mgbe Simiọn batara hụ nwanta ahụ, o kuuru ya nꞌaka ya, welie olu ya, nye Chineke otuto sị,
29
“Onyenwe m, i meela dị ka i kwuru. Ugbu a kwere ka m nwụọ nꞌụdọ.
30
Nꞌihi na anya m ahụla nzọpụta ahụ i kwere na nkwa izite, nke i kwadoro nꞌihi ndị bi nꞌụwa.
32
Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ gị, ìhè nke ga-ewetakwara ndị gị Izirel otuto gị.”
33
O juru Josef na Meri anya ịnụ ihe ndị a Simiọn kwuru banyere nwa ọhụrụ a.
34
Emesịa, Simiọn gọziri ha, tụgharịa gwa Meri okwu sị ya, “Ị hụrụ nwanta a? Ọ bụ onye Chineke họpụtara ịbụ ụzọ nzọpụta na ịla nꞌiyi nye ọtụtụ ndị Izirel. Nꞌihi na ụdị ụzọ e si enwe ndụ ọhụrụ nke ọ ga-egosi ndị mmadụ, bụ ụzọ nke ọtụtụ mmadụ ga-ekwukwa okwu megide.
35
Ọ bụkwa site nꞌụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche zoro ezo nke ọtụtụ mmadụ, mee ka ọ pụta ìhè. Obibi ndụ ya ga-ewetakwara gị, bụ nne ya, iru uju. Iru uju gị ga-adị ukwuu dị ka a ga-asị na e ji mma ihu abụọ dụwaa gị mkpụrụ obi.”
36
O nwekwara otu agadi nwanyị ọzọ nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ nꞌụbọchị ahụ. Aha ya bụ Ana. Ọ bụ onye amụma, bụrụkwa nwa Fanuel nke si nꞌebo Asha. Ana enweghị di, nꞌihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri nanị afọ asaa. Site na mgbe di ya nwụrụ ruo ụbọchị ahụ ọ bịara ụlọ nsọ ukwu Chineke, iri afọ asatọ na anọ agafeela. Oge ndị a nile, Ana jiri ụlọ nsọ ukwu ahụ mere ebe obibi ya. Ebe a ka ọ nọ na-efe Chineke ehihie na abalị, ọ nọkwa na-ekpe ekpere na-ebukwa ọnụ.
38
Nꞌotu awa ahụ kwa Ana bịarutere nꞌulọ nsọ ahụ kelee Chineke ekete. O kwuru okwu banyere nwa ọhụrụ ahụ nye ndị nile na-echere ka Chineke mee ka Jerusalem nwere onwe ya.
39
Mgbe Josef na Meri mesịrị ihe nile iwu Chineke chọrọ ka ha mee, ha laghachiri Galili gaakwa biri na Nazaret, obodo nke aka ha.
40
Nꞌebe ahụ ka nwa ọhụrụ ahụ nọ too, bụrụ onye dị ike. Ọ bụkwa onye jupụtara nꞌamamihe, bụrụkwa onye ngọzi Chineke dịnyeere.
41
Nꞌafọ nile, ndị mụrụ Jisọs na-aga Jerusalem nꞌihi mmemme ngabiga.
42
Mgbe Jisọs ruru afọ iri na abụọ, o sooro ndị mụrụ ya gaa Jerusalem dị ka ha dị mbụ eme.
43
Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ndị mụrụ ya malitere ịlaghachi azụ nꞌobodo nke aka ha, ma Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Kama ndị mụrụ ya amaghị na o soghị ha na-alọta.
44
Ha chere nꞌobi ha na o so ndị enyi ha ọzọ ndị na-alaghachikwa Nazaret. Mgbe ha gasịrị ije otu ụbọchị, ha chọrọ ya ma ha ahụghị ya. Ha bidoro ịchọ ya nꞌetiti ndị ikwu ha na ndị enyi ha.
45
Mgbe ha na-achọtaghị ya, ha tụgharịrị azụ bido ịgaghachikwa Jerusalem ịchọ ya nꞌebe ahụ.
46
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha chọtara ya nꞌụlọ nsọ ukwu dị na Jerusalem ebe ya na ndị ozizi iwu nọ. Ọ nọ nꞌetiti ha na-ege ntị nꞌihe ha na-ekwu ma na-ajụkwa ha ajụjụ.
47
Nghọta na ọsịsa gbara ọkpụrụkpu nke si nꞌọnụ Jisọs na-apụta juru ndị nile nụrụ okwi ya anya.
48
Ndị mụrụ ya amaghị ihe ha ga-ekwu mgbe ha hụrụ ya. Ma Meri gwara ya sị, “Gịnị bụ ihe a i mere? Lee na mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị ebe nile!”
49
Jisọs zara sị ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Ọ bụ na unu amaghị na m ga-anọ nꞌebe a, nꞌụlọ nsọ Nna m?”
50
Ma ha aghọtaghị ihe okwu ahụ pụtara.
51
Emesịa, Jisọs sooro ha laa Nazaret. O rubeere ha isi, meekwara ha ihe nile ha chọrọ ka o mee. Ma nne ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya.
52
Jisọs toro, gbaa dimkpa, bụrụkwa onye maara ihe. O tokwara bụrụ onye ihe ya dị Chineke na mmadụ, ndị maara ya, mma.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24