bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 3
Luke 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 4 →
1
Nꞌafọ iri na ise nke Tiberius nọrọ dị ka eze na-achị alaeze ndị Rom, Chineke ziri Jọn nwa Zakaraya ozi a nꞌọzara ebe o bi.
2
Ozi Chineke a rutere Jọn mgbe Pọntus Pailet bụ onye na-achị akụkụ Judia, mgbe Herọd bụ onye na-achị Galili, mgbe Filip nwanne Herọd na-achị Iturịa na Trakonitis, mgbe Laisania na-achị Abilin na mgbe Anas na Kaifas bụ ndị isi nchụaja.
3
Nꞌihi ozi a, Jọn biliri gaa nꞌobodo nile dị nꞌakụkụ osimiri Jọdan na-ekwusa, na-agwa ndị mmadụ sị, “Sitenụ na mmehie unu chegharịa ka e mee unu baptisim, ka Chineke gbaghara unu mmehie unu.”
4
Dị ka e si dee ya nꞌakwụkwọ Aịzaya onye amụma, otu onye na-eti mkpu nꞌọzara sị, “Dozienụ ụzọ Onyenwe anyị, meenụ ka okporo ụzọ ya guzozie,
5
kpojuonụ ngwukoro nile. Kwazeenụ ugwu nile. Meenụ ka ụzọ gbagọrọ aghagọ guzozie nke ọma, ka ụzọ ọjọ nile dị larịị.
6
Mmadụ nile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke!”
7
Igwe mmadụ pụtara bịakwute Jọn ka o mee ha baptizim. Ma Jọn gwara ha sị, “Ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị iwe Chineke nke na-akwado ịbịa?
8
Burunụ ụzọ zipụta na ndụ unu, na unu echegharịala. Unu echekwala na a ga-azọpụta unu nꞌihi na Eberaham bụ nna nna unu. Nꞌihi na eziokwu ahụ bụ nke a, Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Eberaham ụmụ.
9
Nꞌihi na dị ka mmadụ pụrụ isite na mgbọrọgwụ osisi gbutuo ya, otu a ka Chineke jikekwaara ikpe unu ikpe laa unu nꞌiyi. Nꞌihi na dị ka e si egbutu osisi nile na-adịghị amị mkpụrụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka Chineke ga-esi maa ndị ajọ omume ikpe, tụnye ha nꞌọkụ.”
10
Ndị mmadụ ahụ jụrụ Jọn sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka anyị mee?”
11
Jọn zara sị ha, “Ọ bụrụ na i nwere uwe abụọ, nye onye na-enweghị uwe ọ bụla otu. Ọ bụrụkwa na i nwere nri, kenye ndị agụụ na-agụ.”
12
Ụfọdụ nꞌime ndị ọnaụtụ, ndị a maara nꞌihi ndụ ọjọọ ha na-ebi bịakwara ka Jọn mee ha baptizim. Ha jụrụ Jọn sị ya, “Onye ozizi, gịnị ka ị chọrọ ka anyị mee?”
13
Jọn zara sị ha, “Doonụ aka unu ọcha. Unu anakwala ndị mmadụ ego karịrị nke ha kwesịrị ịkwụ.”
14
Ụfọdụ ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Ginị ka i kwuru maka anyi? Ginị ka anyị kwesịrị ime?” Jọn Zara sị ha, “Unu ejikwala ike apụnarị ndi mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ihe ahụ unu maara na ha emeghị. Ka afọ ju unu nꞌụgwọ a na-akwụ unu.”
15
Nꞌoge a, onye ọ bụla nọ na-ele ọbịbịa Onye nzọpụta ahụ. Ha nọkwa na-atule nꞌobi ha ma Jọn ọ bụ Onye nzọpụta ahụ.
16
Nꞌihi nke a, Jọn gwara ha sị, “Eji m mmiri efu na-eme unu baptizim, ma ọ dị otu onye dị ukwuu karịa m, onye ga-abịa na mgbe na-adịghị anya. Ọ dị nnọọ ukwuu karịa m, nꞌihi na etozughị m ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nzọ na ọkụ mee unu baptizim.
17
Ọ ga-ekewapụta igbugbo ọka site nꞌezi mkpụrụ ọka. Ọ ga-ekponye ezi mkpụrụ ọka nꞌọba, kpọọ igbugbo ọka ahụ ọkụ nke na-agaghị anyụ anyụ.”
18
Okwu a na okwu ọzọ dị iche ka Jọn gwara ndị mmadụ. Ọ dọrọ ha aka na ntị, kwusaakwara ha ozi ọma.
19
Ma Jọn kwuru okwu megide ihe ọjọọ nile Herọd eze na-achị Galili na-eme. O kwukwara okwu megide ọlụlụ nke Herọd lụrụ Herodịas nwụnye nwanna ya.
20
Nꞌihi okwu a Jọn kwuru, Herọd mekwara ihe ọjọọ karịrị ndị o mere na mbụ, site nꞌinye iwu ka e jide Jọn tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ.
21
Otu ụbọchị Jisọs sooro igwe mmadụ bịa ka Jọn mee ya baptizim. Mgbe Jọn mesịrị ndị mmadụ baptizim, o mekwara Jisọs baptizim. Ma mgbe Jisọs nọ na-ekpe ekpere, oge e mesịrị ya baptizim, eluigwe meghere.
22
Mmụọ Nsọ sikwa nꞌelu rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi. Nꞌotu oge ahụ olu sitere nꞌelu daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-atọ m ụtọ.”
23
Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Nꞌoge ndị a nile ndị mmadụ na-akpọ Jisọs nwa Josef onye bụ nwa Heli;
24
Heli bụkwa nwa Matat, Matat abụrụ nwa Livayị, Livayị bụ nwa Meliki, Meliki abụrụ nwa Janayị, Janayị bụ nwa Josef;
25
Josef bụkwa nwa Matatias, Matatias bụ nwa Emọs, Emọs abụrụ nwa Nahum, Nahum bụ nwa Esili, Esili bụ nwa Nagayị;
26
Nagayị bụ nwa Maat, Maat abụrụ nwa Matatias, Matatias bụ nwa Semein, Semein bụkwa nwa Josef, Josef abụrụ nwa Joda;
27
Joda bụ nwa Joanan, Joanan bụ nwa Resa, Resa abụrụ nwa Zerubabel, Zerubabel bụ nwa Shealitiel, Shealitiel abụrụ nwa Neri;
28
Neri bụ nwa Meliki, Meliki abụrụ nwa Adi, Adi bụ nwa Kosam, Kosam bụkwa nwa Elumadam, Elumadam abụrụ nwa Ea;
29
Ea bụ nwa Joshua, Joshua abụrụ nwa Elieza, Elieza bụ nwa Jorim, Jorim abụrụ nwa Matat, Matat bụ nwa Livayị;
30
Livayị abụrụ nwa Simiọn, Simiọn bụ nwa Juda, Juda abụrụ nwa Josef, Josef bụ nwa Jonam Jonam abụrụ nwa Eliakim;
31
Eliakim bụ nwa Melea, Melea abụrụ nwa Mena, Mena bụ nwa Matata, Matata abụrụ nwa Netan, Netan bụ nwa Devidi;
32
Devidi abụrụ nwa Jeesi, Jeesi bụ nwa Obed, Obed abụrụ nwa Boaz, Boaz bụ nwa Salmọn, Salmọn abụrụ nwa Nashọn;
33
Nashọn bụ nwa Aminadab, Aminadab abụrụ nwa Ram, Ram bụ nwa Hezrọn, Hezrọn, abụrụ nwa Perez, Perez bụ nwa Juda;
34
Juda abụrụ nwa Jekọb, Jekọb bụ nwa Eberaham, Eberaham abụrụ nwa Tera, Tera bụ nwa Nahọ;
35
Nahọ abụrụ nwa Serug, Serug bụ nwa Reu, Reu abụrụ nwa Peleg, Peleg bụ nwa Eba, Eba abụrụ nwa Shela;
36
Shela bụ nwa Kenan, Kenan abụrụ nwa Apakzad, Apakzad bụ nwa Shem, Shem abụrụ nwa Noa, Noa bụ nwa Lamek;
37
Lamek abụrụ nwa Metusela, Metusela bụ nwa Enọk, Enọk abụrụ nwa Jared, Jared bụ nwa Mahalaleel, Mahalaleel abụrụ nwa Kenan;
38
Kenan bụ nwa Enọs, Enọs abụrụ nwa Set, Set bụ nwa Adam, Adam abụrụ nwa Chineke.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24