bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 17
Luke 17
Igbo 1988
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 18 →
1
Otu ụbọchị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọnwụnwa nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie ga na-adị, ma oke ahụhụ dị na-eche nwoke ahụ onye ọnwụnwa ga-esi nꞌaka ya bịara mmadụ.
2
Ọ ga-akara onye ahụ mma ma a sị na e kenyere ya nkume buru ibu nꞌolu, tụnye ya nꞌetiti osimiri, karịa na ọ ga-eme ka ndị a dị nta kweere na m mehie.
3
Kpacharanụ anya unu! Ọ bụrụ na nwanne gị eme gị ihe ọjọọ, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya.
4
Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugbo asaa, rịọkwa gị ka ị gbaghara ya ugbo asaa, gbaghara ya.”
5
Ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ Jisọs otu ụbọchị sị ya, “Nyere anyị aka ka anyị nwee okwukwe karịa nke anyị nwere.”
6
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike ịsị osisi ukwu a, ‘Site na mgbọrọgwụ fopụta onwe gị, burukwa onwe gị gaa daba nꞌosimiri,’ ọ ga-emekwa ihe unu nyere ya nꞌiwu.
7
Ọ bụrụ na otu onye nꞌime unu nwere odibo gara rụọ ọrụ nꞌubi ya, ma ọ bụ odibo gara ilekọta atụrụ ya, ginị ka ọ ga-agwa odibo ahụ ma ọ lọta? Ọ̀ ga-asị ya, ‘Bịa soro m rie nri dị na tebulu’?
8
Ka ọ̀ ga-asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, dozie ya nꞌelu tebulu. Ị ga-anọ tutuu m richaa tupuu ị gaa rie nri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị.’
9
Mgbe odibo ahụ rụchara ọrụ ndị a nile, onyenwe ụlọ ahụ ọ̀ ga-ekele ya nꞌihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ?
10
Otu a ka ọ dịrị unu, mgbe unu rụchara ọrụ nile unu kwesịrị ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ nanị nke a, ‘Anyị bụ nanị mmadụ efu ndị na-eje ozi, anyị arụchaala ọrụ anyị kwesịrị ịrụ.’ ”
11
Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-aga Jerusalem ha sitere nꞌagbata Galili na Sameria.
12
Mgbe ha chọrọ ịbanye nꞌotu obodo nta, ndị ekpenta mmadụ iri zutere ha. Site nꞌebe dị anya, ha bidoro na-eti mkpu na-asị, “Jisọs, nna anyị ukwu, meere anyị ebere.”
14
Mgbe Jisọs hụrụ ha, ọ gwara ha okwu sị, “Gaanụ gosi onye nchụaja onwe unu.” Mgbe ha na-aga nꞌụzọ igosi onye nchụaja onwe ha, e mere ka ahụ dị ha mma.
15
Mgbe otu nꞌime ha hụrụ na ahụ adịla ya mma, o jiri iti mkpu na ito Chineke lọghachi azụ.
16
Ọ bịakwutere Jisọs, daa nꞌala nꞌihu ya, kelee ya. Ma nwoke a lọghachiri azụ bịa kelee Jisọs bụkwanụ onye Sameria, obodo ahụ ndị Juu ledara anya.
17
Mgbe Jisọs hụrụ ya, o kwuru okwu sị, “Ha dị mmadụ iri m gwọrọ, ebeekwanụ ka toolu ndị ọzọ nọ?
18
Ọ̀ bụ nanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?”
19
Mgbe ahụ Jisọs gwara onye ahụ sị, “Bilie ọtọ laa nꞌụlọ gị, e meela ka ahụ dị gị mma nꞌihi na i kweere.”
20
Ụfọdụ ndị Farisii jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa?” Jisọs zara ha sị, “Alaeze eluigwe adịghị abịa nꞌụzọ ndị mmadụ ga-eji anya ha hụ ya.
21
O nweghị onye nwere ike ịgwa gị sị, ‘Lee alaeze Chineke ebidola nꞌebe a, ma ọ bụ lee o bidola nꞌebe ahụ.’ Ma achọrọ m ka unu mata na alaeze Chineke nọ ugbu a nꞌetiti unu.”
22
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu ọzọ sị, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụ unu agụụ ịhụ m anya, ọ bụladị otu mgbe nanị, ma unu agaghị ahụ m.
23
Nꞌoge ahụ, ndị mmadụ ga-agwa unu sị, ‘Lee, ọ nọ nꞌebe ahụ ma ọ bụ lee ọ nọ nꞌebe a.’ Ma unu agakwala ebe ọ bụla ha na-atụrụ unu aka, unu esokwala ha.
24
Nꞌihi na dị ka mmadụ si ahụ ìhè mgbe ọ bụla amụma eluigwe gburu na mbara eluigwe site nꞌotu ebe ruo nꞌebe ọzọ, otu a ka ndị mmadụ ga-ahụ m mgbe m ga-alọghachi.
25
Ma tupuu oge ahụ eruo, aga m ebu ụzọ hụọ ụdị ahụhụ dị iche iche. Ndị mmadụ bi nꞌọgbọ a ga-ajụkwa ya.
26
“Ma mgbe oge nlọghachi zuru, ndị mmadụ ga-aga nꞌihu na-ebikwa ndụ ha dị ka ndị bi nꞌoge Noa siri bie ndụ ha.
27
Nꞌihi na nꞌoge Noa, ndị mmadụ nọ nꞌoriri na ọṅụṅụ. Ha na-alụkwa nwụnye na-ekenyekwa ụmụ ha di, tutuu ruo mgbe Noa banyere nꞌime ụgbọ mmiri ahụ. Chineke zitekwara mmiri dị ukwuu nke kpochapụrụ ha.
28
“Otu a ka ọ dịkwa nꞌoge Lọt. Ndị mmadụ nọ nꞌoriri na ọṅụṅụ. Ha nọ na-azụ ahịa, nọkwa na-ere ahịa, ụfọdụ nọ na-arụ ọrụ nꞌubi ha, ndị ọzọ nọ na-ewu ụlọ ha.
29
Ma nꞌụbọchị ahụ Lọt si nꞌobodo Sodọm pụọ, Chineke sitere nꞌeluigwe wụkwasị ndị obodo ahụ ọkụ na nkume na-enwu enwu nke rechapụrụ ndị nile bi nꞌobodo ahụ, laa obodo ahụ nile nꞌiyi.
30
Otu a ka ọ ga-adịkwa nꞌụbọchị ahụ Nwa nke mmadụ ga-alọta.
31
“Nꞌụbọchị ahụ, ọ bụrụ na ị nọ nꞌelu ụlọ alọdatala chọọ ka ị baa nꞌụlọ gị iburu ngwongwo gị. Ọ bụrụ na ị nọ nꞌubi, alọtala nꞌụlọ gị.
32
Chetakwanụ ihe dakwasịrị nwụnye Lọt!
33
Onye ọ bụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọ bụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.
34
Nꞌụbọchị ahụ, mmadụ abụọ ga-edina nꞌotu ebe, a ga-ewepu otu nꞌime ha hapụ onye nke ọzọ.
35
Ụmụ nwanyị abụọ ga-anọ na-akwọ ọka, a ga-ewepụ otu hapụ nke ọzọ.
36
Otu a kwa, ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nꞌubi ha na-arụ ọrụ, a ga-ewepụ otu hapụ nke ọzọ.”
37
Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ebee ka a ga-ebuga ndị ahụ e wepụrụ?” Jisọs zara ha sị, “Ebe ọ bụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24