bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 9
Luke 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 10 →
1
Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, na ike ịgwọ ọrịa nile.
2
O zipụrụ ha ikwusa na ọchịchị Chineke ebidola. O zipụkwara ha ịgwọ ndị ọrịa.
3
Jisọs gwara ha sị, “Unu ewerekwala ihe ọ bụla nꞌihi ije a, unu ewerekwala mkpa nꞌaka ma ọ bụ akpa, unu ewerekwala nri, unu ewerela ego ma ọ bụ uwe abụọ.
4
Nꞌụlọ ọ bụla unu banyere, nọdụnụ nꞌebe ahụ tutuu unu ahapụ obodo ahụ.
5
“Obodo ọ bụla kwa unu gara, nke ndị bi nꞌime ya jụrụ ịnabata unu, mgbe unu si nꞌime ya na-apụ, kụpụsịanụ aja obodo ahụ dị unu nꞌụkwụ, dị ka ihe ngosi na ha jụrụ unu na okwu Chineke.”
6
Ndị ahụ na-eso ya gara dị ka Jisọs gwara ha. Ha gara nꞌobodo nile, na-ekwusa ozi ọma. Ha gwọkwara ọtụtụ ndị ọrịa.
7
Mgbe Herọd onye na-achị Galili nụrụ akụkọ banyere ihe Jisọs na-eme, ihe ọ nụrụ gbagwojuru ya anya, nꞌihi na ụfọdụ mmadụ gwara ya na Jisọs bụ Jọn omee baptizim, na o sitela nꞌọnwụ bilie.
8
Ndị ọzọ gwara ya na Jisọs bụ Ịlaịja onye bịaghachiri azụ. Ma ọ dịkwa ndị ọzọ gwara ya na Jisọs bụ otu nꞌime ndị amụma ochie ahụ sitere nꞌọnwụ bilie.
9
Ma Herọd nꞌonwe ya kwuru sị, “Ọ bụ mụ onwe m jiri ọnụ m nye iwu ka e gbuo Jọn, bipụ ya isi, onye bụkwanụ onye a m na-anụ akụkọ ya?” Ọ gụrụ nnọọ Herọd agụụ ịhụ Jisọs.
10
Mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ Jisọs lọtara, ha kọọrọ Jisọs akụkọ ihe nile ha mere. Jisọs kpọọrọ ha ka ha soro ya gaa ebe ha ga-anọrọ onwe ha nanị ha. Ọ bụ obodo Betsaida ka ọ kpọọrọ ha gaa.
11
Ma mgbe ndị mmadụ nụrụ na Jisọs agaala Betsaida, ha sooro ya. Mgbe ha bịaruru ebe ahụ, Jisọs nabatara ha, gwa ha okwu gbasara alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nꞌetiti ha.
12
Mgbe anwụ bidoro ịda, nꞌoge anyasị, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ bịakwutere Jisọs gwa ya sị, “Zilaganụ ndị a, ka ha gaa nꞌime obodo chọọrọ onwe ha nri, na ebe ha ga-arahụ ụra. Ebe anyị nọ bụkwanụ ọzara.”
13
Ma Jisọs zara sị ha, “Chọọrọnụ ha nri ha ga-eri.” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ ka anyị nwere. Ị̀ chọrọ ka anyị gaa zụọra mmadụ ndị a nile nri?”
14
Ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ ruru puku mmadụ ise. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gwanụ ha ka ha nọdụ ala. Keenụ ha ka ha nọdụ nꞌigwe nꞌigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.”
15
Ndị na-eso ụzọ Jisọs nyeere ndị mmadụ ahu aka ịnnọdụ dị ka Jisọs si kwuo.
16
Emesia, Jisọs weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị ahụ lelie anya nꞌeluigwe. O kelere Chineke ekele nꞌihi ha, nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahu.
17
Ndị ahụ nile riri tutuu efọ eju ha. Nꞌikpeazụ ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara ibiribe beredi fọdụrụ tụtụjuo ya nkata iri na abụọ.
18
Otu ụbọchị mgbe Jisọs nọ nanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ sị na m bụ?”
19
Ndị na-eso ụzọ ya zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaija, ndị ọzọ sị na ị bụ otu nꞌime ndị amụma ochie ahụ si nꞌọnwụ bilie.”
20
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Unu kwanụ? Onye ka unu sị na m bụ?” Pita zara ya sị, “Ị bụ Kraịst Onye nzọpụta ahụ Chineke zitere.”
21
Nꞌotu oge ahụ Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọ bụla.
22
Ọ gwakwara ha sị, “Nwa nke mmadụ ga-ahụ ahụhụ dị ukwuu. Nꞌihi na ndị okenye anyị, na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Ha ga-egbu ya, ma ụbọchị atọ gafee, ọ ga-esite nꞌọnwụ bilie ọzọ.”
23
Jisọs gwakwara ha sị, “Ọ bụrụ na unu achọọ isoro m, unu kwesịrị ịgụ ndụ unu dị ka ihe furu efu, buru obe unu ụbọchị nile na-eso m.
24
Nꞌihi na onye ọ bụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọ bụla jikeere itufu ndụ ya nꞌihi m, ka a ga-azọpụta.
25
Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa nile nꞌuru ma tufuo ndụ ya, bụrụkwa onye furu efu na onye ga-ala nꞌiyi?”
26
“Nꞌihi na onye ọ bụla ihere m ma ọ bụ ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa m mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, na nꞌebube ndị mmụọ ozi.
27
Eziokwu ka m na-agwa unu mgbe m na-asị, na ụfọdụ nọ ugbu a, nꞌetiti unu, ndị na-agaghị anwụ tutuu ruo mgbe ha ga-ahụ alaeze Chineke.”
28
Mgbe abalị asatọ gafere, Jisọs kpọọrọ Pita na Jọn na Jemes gaa nꞌelu ugwu ikpe ekpere.
29
Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ọdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya nwupụrụ ọcha, ọ chara nnọọ vaaa, chakarịa ihe ọcha ọ bụla anya mmadụ hụrụla.
30
Na mberede mmadụ abụọ pụtara soro ya guzo na-ekwu okwu. Ha bụ Mosisi na Ịlaịja.
31
Ha pụtara nnọọ nꞌebube nke eluigwe soro Jisọs na-ekwu okwu banyere otu ọ ga-esi mezuo uche Chineke, site nꞌọnwụ nke ọ ga-anwụ na Jerusalem.
32
Mgbe ihe ndị a na-eme, Pita na mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube Jisọs, hụkwa mmadụ abụọ ahụ ha na Jisọs nọ na-ekwurita okwu.
33
Mgbe Mosisi na Ịlaịja bidoro isite nꞌebe Jisọs nọ na-apụ, Pita gwara Jisọs sị, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adịkwanụ mma ma ọ bụrụ na anyị ga-anọ nꞌebe a. Ka anyị wuonụ ọnụ ụlọ atọ, otu nke gị, otu nke Mosisi na otu nke Ịlaịja.” Ma mgbe Pita na-ekwu ihe ndị a, ọ ghọtaghị ihe ọ na-ekwu.
34
Mgbe Pita kpụ okwu ahụ nꞌọnụ, igwe ojii kpuchigidere ha. Egwu tụrụ Pita na Jọn na Jemes mgbe igwe ojii ahụ kpuchigidere ha.
35
Mgbe ahụ, ha nụrụ olu si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m onye m họpụtara.”
36
Mgbe olu ahụ kwusịrị okwu, ọ bụkwa nanị Jisọs ka Pita na Jọn na Jemes hụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla ha gwara ihe ha hụrụ, kama ha debere ihe nile nꞌobi ha.
37
Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, mgbe ha si nꞌugwu ahụ na-arịdata, ọtụtụ mmadụ zukọtara na ndịda ugwu ahụ ịhụ Jisọs.
38
Otu nwoke si nꞌetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu na-eti mkpu na-abịakwute Jisọs sị ya, “Nna anyị ukwu, arịọ m gị, leenụ nwa m, ọ bụkwanụ nanị ya bụ nwa m nwere!
39
Mmụọ ọjọọ na-abịa jide ya na-eme ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-enugharịkwa ya na-eme ka ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ. Mgbe mmụọ ọjọọ a mesịrị nke a laa, ike afụ anaghị adịkwa nwanta a.
40
Abịakwutere m ndị na-eso ụzọ gị rịọ ha ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ, ma ha enweghị ike.”
41
Jisọs zara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Unu bụ nnọọ ndị ekweghị ekwe na isi ike juru obi! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ m na-anagide ekweghị ekwe unu?” Mgbe ahụ ọ gwara nna nwanta ahụ sị, “Kpọtara m nwanta ahụ nꞌebe a!”
42
Mgbe nna nwanta ahụ du nwanta ahụ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwaturu ya nꞌala nugharịa ya. Ma Jisọs nyere mmụọ ọjọọ ahụ iwu ka o si nꞌime nwanta ahụ pụta. Ọ gwọrọ nwanta ahụ kpọnyekwa ya nna ya.
43
Ọrụ a Jisọs rụrụ juru ndị nile nọ nꞌebe ahụ anya. Ịdị ukwuu nke ike Chineke tụrụ ha nꞌanya. Ma mgbe onye ọ bụla nꞌọgbakọ ahụ nọ na-ekwu okwu ọma nꞌihi ihe Jisọs mere, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha,
44
“Unu echefula okwu a m chọrọ ịgwa unu ugbu a. A ga-arara Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu ya.”
45
Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe Jisọs kwuru. E zonarịrị ha eziokwu dị nꞌokwu ahụ ka ha ghara inwe ike ghọta ya. Ụjọ tụkwara ha ịjụ Jisọs ka ọ kọwaa okwu ahụ.
46
Otu ụbọchị, ịrụ ụka dapụtara nꞌetiti mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso Jisọs, banyere onye ka ibe ya ukwuu.
47
Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nꞌakụkụ ya.
48
Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọ bụla nabatara nwanta a nꞌaha m, nabatara m. Onye ọ bụla kwa nabatara m, nabatara Chineke onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nꞌetiti unu bụ onye ka ibe ya ukwuu.”
49
Mgbe ahụ Jọn gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, anyụ hụrụ otu nwoke ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị nꞌotu anyị, anyị kwụsịrị ya.”
50
Jisọs zara sị ya, “Ị garaghị eme ihe dị otu ahụ! Nꞌihi na onye ọ bụla na-adịghị emegide anyị dinyeere anyị.”
51
Mgbe oge Jisọs ji alaghachi nꞌeluigwe na-abịa nnọọ nso, o kpebiri nꞌobi ya ịga Jerusalem.
52
O zipụrụ ụfọdụ ndị ozi ya ka ha gaa nꞌihu ijikere ndị mmadụ ịnabata ya. Ndị ozi a gara rute nꞌụfọdụ obodo nta nke dị na Sameria.
53
Ma ndị obodo ahụ jụrụ ịnabata ya nꞌihi na Jisọs na-aga Jerusalem.
54
Mgbe Jemes na Jọn hụrụ na ndị Sameria jụrụ ịnabata Jisọs, ha gwara Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nꞌeluigwe bịa laa ha nꞌiyi?”
55
Jisọs tụgharịrị baara ha mba.
56
Emesịa ha gara nꞌihu nꞌije ha tutuu ha erute obodo nta ọzọ.
57
Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke bịakwutere Jisọs sị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọ bụla ị na-aga.”
58
Jisọs zara ya sị, “Ewi nwere ọnụ, ụmụ nnụnụ nwekwara akwụ ebe ha na-edina. Ma mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla m ga-akpọ ụlọ m.”
59
Jisọs gwara onye ọzọ bịakwutere ya sị, “Soro m.” Ma nwoke ahụ zara sị, “Biko, nyenụ m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.”
60
Ma Jisọs zara ya sị, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị dị ka ha. Ọrụ gị bụ ịga gbasaa ozi ọma nke alaeze Chineke.”
61
Onye ọzọ kwa bịakwutere Jisọs sị ya, “Aga m esoro gị, ma biko kwere ka m gaa gwa ndị ezinụlọ m na m na-ahapụ ha.”
62
Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla ji ọgụ ya malite ịrụ ọrụ nꞌubi, mesịa hapụ ọrụ ọ na-arụ lewe anya nꞌazụ, ekwesịghị ịba nꞌalaeze Chineke.”
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24