bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 20
Luke 20
Igbo 1988
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 21 →
1
Otu ụbọchị, Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
2
Ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gwa anyị, onye nyere gị ike i ji na-eme ihe ndị a nile ị na-eme? Ebeekwa ka i si nweta ike ahụ?”
3
Jisọs zara ha sị, “Enwekwara m ajụjụ m chọrọ ijụ unu. Gwanụ m,
4
onye nyere Jọn omee baptizim ike ime ndị mmadụ baptizim? Ọ bụ Chineke ka ọ bụ mmadụ!”
5
Ha kwurịtara okwu nꞌetiti onwe ha kpebie sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na ọ bụ Chineke nyere Jọn ike, ọ ga-ajụ anyị ihe mere anyị ji jụ ikwere nꞌihe o kwuru.
6
Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na ọ bụ mmadụ nyere ya ike ahụ, ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nꞌihi na ha nile kweere na Jọn bụ onye amụma.”
7
Nꞌihi nke a, ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị onye nyere Jọn ike ime ndị mmadụ baptizim.”
8
Jisọs zakwara ha sị, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu onye nyere m ike ime ihe ndị a.”
9
Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ akụkọ sị, “Otu nwoke nwere ala ubi ebe ọ kụrụ mkpụrụ vaịnị. Mgbe ọ kụsịrị mkpụrụ vaịnị ahụ, o tinyere ubi ahụ nꞌaka ndị ga-elekọta ya, pụọ gaa nꞌobodo ọzọ ebe ọ ga-anọ ogologo oge.
10
Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zitere otu nꞌime ndị na-ejere ya ozi ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ anya, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ubi ahụ. Ma ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ jidere odibo nwoke ahụ, tie ya ihe, zilaa ya nꞌaka efu.
11
Onyenwe ubi ahụ zitekwara odibo ọzọ. Ma ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ tikwara ya ihe mee ya ihe ihere. Ha zilakwara ya nꞌaka efu.
12
Onyenwe ubi ahụ zipụkwara onye ọzọ, nke mere ha mmadụ atọ, ma ndị na-elekọta ubi ahụ merụrụ ya ahụ chụọ ya ọsọ.
13
“Nꞌikpeazụ, mgbe onyenwe ubi ahụ na-amakwaghị ihe ọzọ ọ ga-eme, o kpebiri nꞌime onwe ya sị, ‘Aga m ezigara ha ọkpara m hụrụ nꞌanya. Ikekwe, ha ga-asọpụrụ ya mgbe ha hụrụ ya.’
14
“Nwoke ahụ zipụrụ ọkpara ya dị ka o si kpebie. Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara nwoke ahụ ka ọ na-abịa, ha kpebiri nꞌetiti onwe ha igbu ya. Ha sịrị, ‘Onye a bụ onye ga-eketa ihe nile onyenwe ubi a nwere. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ubi a bụrụkwa nke anyị.’
15
Mgbe ọkpara nwoke a bịaruru, ndị ahụ mere dị ka ha kwuru. Ha jidere ya, kpụrụ ya pụọ, gaa nꞌazụ ubi ahụ, gbuo ya nꞌebe ahụ.” Jisọs jụrụ ndị na-ege ya ntị sị, “Mgbe onyenwe ubi ahụ bịara, gịnị ka ọ ga-eme ndị ahụ na-elekọta ubi ya?
16
Ọ̀ bụghị ịbịa laa ajọ ndị ahụ nꞌiyi werekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị ọzọ ndị jikeere inye ya mkpụrụ ruru ya nꞌoge ya? Nꞌezie, nke ahụ bụ nnọọ ihe nwoke ahụ ga-eme.” Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ akụkọ a Jisọs kọrọ, ha tiri mkpu sị, “Tụfịaakwa! Chineke ekwela! Gịnị mere ha ji mee ihe dị otu a?”
17
Ma Jisọs lere ha anya sị, “Gịnị ka unu chere na okwu Chineke na-akọwa mgbe o kwuru sị, ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ tụfuru dị ka ihe na-abaghị uru, abụrụla nkume dị mkpa ugbu a nꞌụlọ ahụ?’
18
Ahụ onye ọ bụla dara nꞌelu nkume ahụ ga-etiwa, ma onye ọ bụla nkume ahụ dakwasịrị ka ọ ga-egwepịa dị ka ntụ.”
19
Nꞌoge ahụ, ndị ozizi iwu na ndị isi nchụaja ghọtara na ọ bụ ha ka Jisọs bu nꞌobi mgbe ọ kọrọ akụkọ ahụ. Ha gbalịrị ijide ya, ma ha ejidekwaghị ya nꞌihi na ha tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ha.
20
Ihe ha mere bụ iche ya nche. Ha zipụrụ ndị mmadụ ka ha bịa jiri aghụghọ jụọ Jisọs ajụjụ, ka ha lee ma ha ga-esite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye nꞌajụjụ ha jụrụ ya jide ya, kpụrụ ya jekwuru onyeisi ọchịchị na-achị nꞌoge ahụ.
21
Ndị ahụ ha zipụrụ bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onye ozizi, anyị maara na ihe ị na-ezi na okwu ị na-ekwu bụ eziokwu. Ị dịghị ele mmadụ anya nꞌihu, kama ị na-ezi ihe bụ ụzọ mmadụ ga-esi bịakwute Chineke.
22
Ma gwa anyị, o ziri ezi na anyị ga-atụ ụtụ anyị nye Siza onye na-achị alaeze ndị Rom, ka ị sị anyị atụla ụtụ?”
23
Jisọs matara na ajụjụ a bụ ajụjụ aghụghọ. Nꞌihi ya ọ zara ha sị,
24
“Gosinụ m otu nꞌime mkpụrụ ego unu.” Ha nyere ya otu mkpụrụ ego. Ọ jụrụ ha sị, “Ònye nwe ihu e sere nꞌelu ego a? Ọ̀ bụkwa aha onye ka e dere nꞌelu ya?” Ha zara sị ya, “Ha bụ nke Siza.”
25
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe ruru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe ruru Chineke.”
26
Ọsịsa Jisọs nyere juru ha anya, mee ka ha kpuchie ọnụ ha nꞌihere. Ha enwekwaghị ike ijide Jisọs site nꞌokwu ọnụ ya nꞌihu ndị mmadụ ahụ.
27
Mgbe oge nta gasịrị, ụfọdụ ndị si nꞌotu ndị Sadusii bịakwutere Jisọs. Ndị a bụ ndị ahụ na-asị na ndị nwụrụ anwụ agaghị ebilitekwa nꞌọnwụ ọzọ.
28
Ha jụrụ Jisọs ajụjụ a sị, “Onye ozizi, Mosisi dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwụnye anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne nwoke ahụ ga-alụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, mụta ụmụ ndị ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ.
29
Ugbu a, ọ dị ezinụlọ e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwụnye, ma ọ nwụrụ na-amụtaghị nwa.
30
Onye nke abụọ na nke atọ lụrụ nwanyị ahụ ma ha nwụrụ na-amụtaghị nwa. Otu a, ụmụnne asaa ahụ nile lụrụ nwanyị a, ma ha nile nwụrụ na-amụtaghị nwa.
32
Nꞌikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara.
33
Mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, onye ka nwanyị a ga-alakwuru dị ka di ya ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ahụ lụrụ ya nꞌụwa a?”
34
Jisọs zara ha sị, “Ndị nwoke na ndị nwanyị bi nꞌọgbọ a na-alụ nwụnye, ma na-enyekwa ụmụ ha nꞌọlụlụ di na nwụnye.
35
Ma ndị ahụ Chineke gụrụ dị ka ndị tozuru etozu inwe ndụ ebighị ebi agaghị alụ di na nwụnye mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie,
36
nꞌihi na ha agaghị anwụkwa ọzọ, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke nꞌihi na Chineke emeela ka ha si nꞌọnwụ dị ndụ ọzọ.
37
“Ma banyere ajụjụ unu jụrụ ma ọ bụ ezie na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, Mosisi nꞌonwe ya gosiri anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Nꞌihi na mgbe o dere banyere okwu Chineke gwara ya site nꞌime osisi ahụ nwuru ọkụ nꞌọzara, aha ọ kpọrọ Chineke bụ, Chineke nke Eberaham, Chineke nke Aizik na Chineke nke Jekọb.
38
Chineke abụghị Chineke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ Chineke ndị dị ndụ. Ya mere nꞌihu Chineke mmadụ nile dị ndụ.”
39
Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara Jisọs sị, “Onye ozizi, ị zara ajụjụ a nke ọma.”
40
O nwekwaghị onye ọ bụla jụrụ Jisọs ajụjụ ọzọ.
41
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị mere ndị mmadụ ji na-asị na Onye nzọpụta ahụ na-abịa bụ nwa Devidi?
42
Nꞌihi na nꞌakwụkwọ Abụ Ọma, Devidi nꞌonwe ya kwuru sị, ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, Nọdụ nꞌebe a nꞌakụkụ aka nri m
43
tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụrụ ebe mgbakwasị ụkwụ gị.’
44
Devidi nꞌonwe ya kpọrọ Onye nzọpụta ahụ Onyenwe anyị. Oleekwanụ otu Onye nzọpụta siri bụrụ nwa Devidi?”
45
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu, mgbe ndị mmadụ ahụ na-ege ntị sị,
46
“Jienụ onwe unu aka site nꞌebe ndị ozizi iwu nọ. Nꞌihi na ihe ha hụrụ nꞌanya bụ iyi uwe ogologo na-ejegharị ebe nile. Ihe na-atọkwa ha ụtọ bụ ka a na-ekele ha ekele dị iche nꞌime ahịa. Ha hụkwara ịnọdụ nꞌoche dị mkpa nꞌụlọ ekpere na nꞌoge mmemme ọ bụla nꞌanya.
47
Ma ha bụ ndị na-abakwuru ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ, pụnarị ha ihe ha nwere. Ha na-ekpe ogologo ekpere ka ndị mmadụ too ha. Ha ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu site nꞌaka Chineke.”
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24