bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 23
Luke 23
Igbo 1988
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 24 →
1
Mgbe ahụ ọha mmadụ ahụ nile biliri duru Jisọs ijekwuru Paịlet.
2
Mgbe ha ruru nꞌihu Pailet ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị ala anyị. Ọ na-ezi ha na o zighị ezi ịtụ ụtụ taksị nye Siza. Ọ na-agwakwa ha na ya onwe ya bụ Kraịst, bụrụkwa eze.”
3
Pailet jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Ị̀ bụ Kraịst, eze ndị Juu?” Jisọs zara sị ya, “Ee, ọ bụ dị ka i kwuru.”
4
Mgbe ahụ Pailet chigharịrị gwa ndị isi nchụaja na igwe mmadụ ahụ zukọrọ nꞌebe ahụ okwu sị ha, “Lee, o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m chọpụtara nwoke a mere.”
5
Ma ha nọgidere gwasie ya okwu ike sị ya, “Nwoke a na-akwalị ndị Juu nile inupụ isi. Na Galili ka ọ malitere izi ihe. O ziekwala ndị Juda nile ozizi nnupụ isi ya. Ugbu a, o webatakwala ozizi ya nꞌebe a.”
6
Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a ha kwuru, ọ jụrụ ha sị, “Nwoke a ọ̀ bụ onye Galili?”
7
Mgbe ha gwara ya na Jisọs bụ onye Galili, o nyere iwu ka e duru ya jekwuru Herọd, bụ eze, onye ọchịchị ala Galili dị nꞌaka. Nꞌoge a Herọd nꞌonwe ya nọkwa na Jerusalem.
8
Obi tọrọ Herọd ụtọ mgbe ọ hụrụ Jisọs nꞌihi na ọ dịlarị anya kemgbe ọ chọrọ ịhụ ya anya ihu na ihu. Nꞌihi na ọ nụla ọtụtụ akụkọ banyere Jisọs. O lekwara anya na Jisọs ga-arụ ọrụ ịrịba ama nꞌihu anya ya. Ọ nụla akụkọ Jisọs, nꞌihi ya o nwere olileanya na Jisọs ga-arụrụ ya ụfọdụ nꞌime ọrụ ebube ahụ ọ na-arụ.
9
Ya mere, mgbe Jisọs bịakwutere Herọd, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ banyere ihe ụfọdụ, ma Jisọs asaghị ya ihe ọ bụla.
10
Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nọ nꞌebe ahụ na-ebọ Jisọs ọtụtụ ebubo ihe ọjọọ ha sị na o mere.
11
Herọd na ndị agha ya jiri Jisọs mee ihe ọchị, na-akwa ya emu. Mgbe ha yikwasịchara ya uwe mara mma, ụdị nke ndị eze na-eyi, ha dukwaara ya ọzọ jekwuru Pailet.
12
Site nꞌụbọchị ahụ gaa nꞌihu Herọd na Pailet bidoro bụrụkwa ezigbo enyi ọzọ. Tupuu ruo oge a, ha na-eburitara ibe ha iro.
13
Mgbe ahụ a kpọghachiri Jisọs, Pailet kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị na-achị ndị Juu
14
gwa ha okwu sị, “Unu kpọtaara m nwoke a nꞌihi na unu sị na ọ na-eduhie ndị mmadụ. Ugbu a ajụọla m ya ajụjụ nꞌihu unu, chọpụta na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere.
15
Herọd nꞌonwe ya kwa achọpụtaghị ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere. Ọ bụ nꞌihi nke a ka o jiri zighachiri m ya. Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla o mere nke pụrụ iwetara ya amamikpe ọnwụ.
16
Ya mere, aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.”
17
Nꞌoge mmemme ngabiga ọ bụla, Pailet na-ahapụrụ ndị Juu onye mkpọrọ ọ bụla ha chọrọ.
18
Ma nꞌoge a, igwe mmadụ ahụ bidoro iti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.”
19
Barabas bụ onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ọgba aghara e nwere nꞌobodo Jerusalem. E tinyekwara ya nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi na o gburu mmadụ.
20
Ebe Pailet chọsịrị ike ịhapụ Jisọs ka ọ laa, ọ gwakwara ndị ahụ okwu ọzọ.
21
Ma ha nile tiri mkpu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe! Kpọgide ya nꞌobe!”
22
Pailet gwakwara ha okwu nke ugbo atọ sị, “Gịnị mere unu ji chọọ ka nwoke a nwụọ? Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere? Achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke ga-ewetara ya ọnwụ. Aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.”
23
Ma ha nọgidere na-eti mkpu nꞌoke olu, na-akpọku Pailet ka a kpọgbuo Jisọs. Nꞌikpeazụ. Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ.
24
Ọ mara Jisọs ikpe ọnwụ dị ka ha chọrọ.
25
Ọ hapụrụ Barabas onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ọgba aghara na nꞌihi igbu ọchụ dị ka ndị mmadụ chọkwara. Ma o nyefere ha Jisọs nꞌaka.
26
Mgbe ha duuru Jisọs na-aga ebe ha ga-anọ kpọgide ya nꞌobe, ha zutere otu nwoke aha ya bụ Saimọn onye obodo Sirini. O si nꞌime obodo a na-abịa Jerusalem. Ha kwagidere ya bokwasị ya obe ahụ ka ọ buru ya na-eso Jisọs nꞌazụ.
27
Ọtụtụ ndị mmadụ, ma ụmụ nwanyị, sooro ya. Ụmụ nwanyị ndị a na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa nꞌihi Jisọs.
28
Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụ nwanyị Jerusalem, unu eberela m akwa, kama berenụ ụmụ unu akwa.
29
Nꞌihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ọ dịrị unu mma unu ụmụ nwanyị ndị na-enweghị ụmụ, na unu ndị na-amụtaghị ụmụntakịrị, na unu ndị na-enyebeghị ụmụntakịrị ara mbụ.’
30
Nꞌoge ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-akpọku ugwu buru ibu sị ya, ‘Dakwasị anyị,’ ha ga-akpọkwa ugwu nta sị ya, ‘Kpuchie anyị, zookwa anyị.’
31
Ọ bụrụ na ihe na-esiri osisi dị ndụ ike, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ya mgbe ọ kpọrọ nkụ.”
32
Mmadụ abụọ ọzọ, bụ ndị na-emebi iwu ka e dukwa nꞌụbọchị ahụ igbu ha na Jisọs.
33
Mgbe ha bịarutere ebe a na-akpọ, “Ebe Okpokoro isi,” ebe ahụ ka ha nọ kpọgide ya nꞌobe. Ha kpọgidekwara mmadụ abụọ ahụ na-emebi iwu nꞌobe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌakụkụ aka nri Jisọs, nke ọzọ nꞌakụkụ aka ekpe ya.
34
Mgbe ha kpọgidechara ha nꞌelu obe, Jisọs kwuru okwu sị, “Nna, gbaghara ha nꞌihi na ha aghọtaghị ihe ha na-eme.” Ndị agha kere uwe ya nꞌetiti onwe ha. Ha fere nza ịchọpụta onye ga-ewe nke ọ ga-ewe.
35
Ọtụtụ mmadụ guzoro na-ele Jisọs anya. Kama ndị ndu ndị Juu nọ na-achị ya ọchị. Ha gwara ya okwu sị, “Leenụ ya ugbu a! Ọ na-azọpụta ndị ọzọ ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. A sị na ọ bụ Onye nzọpụta, onye Chineke họpụtara, ya zọpụtanụ onwe ya.”
36
Ndị agha ahụ chịrị ya ọchị, nyekwa ya mmanya gbara ụka ka ọ ṅụọ.
37
Ha gwara ya sị, “Ị bụrụ eze ndị Juu zọpụta onwe gị!”
38
O nwere ihe e dere kụpanye nꞌelu obe ahụ. Nke a bụ ihe e dere, “Onye a bụ eze ndị Juu.”
39
Otu nꞌime ndị na-emebi iwu ahụ a kpọgidere nꞌelu obe nꞌụbọchị ahụ kwujọkwara Jisọs sị ya, “Ana m eche na ị bụ Onye nzọpụta. Zọpụtanụ onwe gị, zọpụtakwa anyị!”
40
Ma onye nke ọzọ ahụ na-emebikwa iwu baara ya mba sị ya, “Ị̀ dịghị atụ egwu Chineke? Ọ̀ bụghị otu ụdị ahụhụ ahụ ka anyị nile nọ nꞌime ya?
41
Ma anyị kwesịrị ịnata ahụhụ a na-ata anyị nꞌihi na anyị na-ahụ ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọ bụla.”
42
Mgbe ahụ ọ gwara Jisọs sị ya, “Onyenwe m, cheta m mgbe i bidoro ịchị alaeze gị.”
43
Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, taa, ka ị ga-eso m nọdụ na Paradaịs.”
44
Ihe dị ka elekere iri na abụọ eruola nꞌoge a. Ọchịchịrị gbachikọtara ebe nile nꞌala ahụ site nꞌoge ahụ ruo nꞌelekere atọ nke ehihie.
45
Anwụ enyekwaghị ìhè ya. Akwa mgbochi dị nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem gbawara ụzọ abụọ site nꞌelu ruo nꞌala.
46
Jisọs tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Nna, ọ bụ nꞌaka gị ka m na-etinye mmụọ m.” Mgbe o kwusịrị okwu a, o kubiri ume.
47
Nꞌoge a otu ọchịagha na-achị narị ndị agha guzo nso nꞌebe ahụ. Ọ hụrụ ihe ndị a nile mere, too Chineke sị, “Nꞌezie, aka nwoke a dị ọcha!”
48
Mgbe ndị bịara ile otu a ga-esi kpọgbuo Jisọs hụrụ ihe nile mere, ha hapụrụ ebe ahụ laa nꞌụlọ ha, na-eti aka nꞌobi na mwute.
49
Ndị enyi Jisọs nile, na ụmụ nwanyị si Galili soro ya bịa Jerusalem, guzo nꞌebe dị anya nꞌele ihe ndị a.
50
Ma ọ dị otu nwoke onye Juu a na-akpọ Josef si nꞌobodo a na-akpọ Arimatia. Josef bụ ezigbo mmadụ, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ na onye na-ele anya ọbịbịa alaeze Chineke. Ọ bụkwa otu onye nꞌime ndị na-anọ nꞌụlọ ikpe ukwu ndị Juu, kama ọ kwagideghị mkpebi na mmeso ndị isi ndị Juu kpebiri megide Jisọs site nꞌigbu ya.
52
Ọ gara hụ Pailet rịọ ya ka o kwe ya ka o buru ozu Jisọs.
53
Mgbe Pailet nyere ya ike, Josef gara butuo ozu Jisọs site nꞌelu obe ahụ. O ji akwa ọcha dị ogologo kechie ozu ahụ. Emesịa, o nyibere ya nꞌili ọhụrụ o gwuru nꞌime nkume nke a enyisabeghị onye ọ bụla nꞌime ya mbụ.
54
Josef mere ihe ndị a nꞌuhuruchi ụbọchị Fụraịde, nꞌoge ndị mmadụ na-akwado maka ụbọchị Satọde bụ ụbọchị izuike ndị Juu.
55
Ndị nwanyị ahụ si Galili soro Jisọs bịa Jerusalem, sokwa Josef gaa hụ ili ahụ, hụkwa otu o si nyibe Jisọs nꞌime ya.
56
Emesịa, ha lara nꞌụlọ ha, gaa kwadoo ụda na-esi isi ụtọ na mmanụ e ji echekwa ahụ mmadụ ka ọ hapụ isi isi. Nꞌụbọchị izuike ahụ, ha zuru ike dị ka e nyere nꞌiwu.
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24