bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 24
Luke 24
Igbo 1988
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
1
Ma nꞌisi ụtụtụ Sọnde, ha weere mmanụ ahụ na ụda ahụ ha kwadoro bido ịga nꞌili ahụ.
2
Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ na o nweela onye bupụrụ nkume ahụ buru ibu e ji mechie ọnụ ili ahụ.
3
Ma mgbe ha banyere nꞌime ili ahụ, ha ahụghị ozu Jisọs.
4
Mgbe ha guzo nꞌebe ahụ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya, mmadụ abụọ yi uwe ọcha pụtara guzo nso ebe ha nọ.
5
Ha tụrụ ụjọ, kpuo ihu ha nꞌala. Mgbe ahụ mmadụ abụọ ahụ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nꞌetiti ndị nwụrụ anwụ?
6
Chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili.
7
Ọ gwara unu na a ga-arara ya nye nꞌaka ndị mmehie ndị ga-akpọgide ya nꞌobe, na ya ga-esikwa nꞌọnwụ bilie ọzọ nꞌụbọchị nke atọ ya.”
8
Ụmụ nwanyị ahụ chetara na ọ bụ ihe Jisọs gwara ha.
9
Ha sitere nꞌili ahụ pụọ laghachikwuru mmadụ iri na otu ahụ na-eso ụzọ Kraịst, kọọrọ ha ihe mmadụ abụọ ahụ gwara ha.
10
Ọ bụ Meri Magdalin na Joana na Meri nne Jemes na ụmụ nwanyị ndị ọzọ jere nꞌili ahụ, lọtara bịa kọọrọ ndị ozi ahụ ihe ha hụrụ.
11
Ma akụkọ ụmụ nwanyị a lọtara bịa kọọrọ ha dị ha ka ọ bụ akụkọ ifo. Ha ekwenyeghị nꞌokwu ahụ.
12
Otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ gaa nꞌili ahụ ka o jiri anya ya hụ ihe mere. Mgbe o ruru, o hulatara ala nyoo anya nꞌime ili ahụ hụ akwa ahụ e ji kee ahụ Jisọs ka ọ tọgbọ nꞌala. Mgbe ọ hụrụ ihe ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ laghachi azụ nꞌụlọ, na-echekwa echiche banyere ihe ndị ahụ mere.
13
Nꞌụbọchị ahụ kwa, mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs si na Jerusalem na-aga obodo nta a na-akpọ Emaus nke rukwara kilomita iri na abụọ site na Jerusalem.
14
Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, ha na-ekwurịta okwu banyere ihe nile mere.
15
Ọ dịghị anya, Jisọs bịara ha nso, soro ha na-aga nꞌụzọ Emaus ahụ.
16
Ma Chineke mere ka mmadụ abụọ ahụ hapụ ịmata na ọ bụ Jisọs ka ha na ya so.
17
Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịjụ ha ajụjụ sị, “Akụkọ gịnị ka unu na-akọ?” Mmadụ abụọ ahụ kwụsịrị ịga ije mgbe ajụjụ a dara. Onye lere ha anya nꞌihu ga-ama nꞌezie na ha nọ nnọọ nꞌiru uju.
18
Mgbe ahụ otu onye nꞌime ha aha ya bụ Kliopas zara Jisọs sị, “Ị̀ na-akọwa na ị maghị ihe ọ bụla banyere ihe nile a mere na Jerusalem nꞌizu ụka gara aga? Ị ga-abụkwanụ nnọọ onye ọbịa ma ọ bụrụ na ị maghi ihe ndị a!”
19
Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe ndị a unu sị na o mere?” Ha zara ya sị, “Ihe dakwasịrị Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma rụrụ ọrụ ebube dị iche iche, onye kwukwara okwu na-atụghị egwu. Onye, ọ bụladị Chineke na mmadụ na-asọpụrụ.
20
Ma ndị isi nchụaja anyị na ndị ọchịchị anyị nyefere ya nꞌaka ndị Rom, ka ha maa ya ikpe ọnwụ, kpọgbuokwa ya nꞌobe.
21
Anyị na rị ele anya na ọ bụ ya bụ onye Chineke zitere ịgbapụta Izirel. Ma nke ka nke, taa mere ya ụbọchị atọ kemgbe a kpọgburu ya.
22
Ma ụfọdụ nꞌime ụmụ nwanyị si nꞌotu anyị, ndị na-eso Jisọs mgbe ọ dị ndụ, bịara kọọrọ anyị akụkọ juru anyị anya. Nꞌụtụtụ a ha gara nꞌili ebe e nyibere Jisọs,
23
lọta kọọrọ anyị na ha ahụghị ozu ya. Ha gwakwara anyị na ha hụrụ ndị mmụọ ozi ndị gwara ha na Jisọs dị ndụ!
24
Ụfọdụ nꞌime ndị ikom so nꞌotu anyị gara nꞌili ahụ chọpụta na ihe ụmụ nwanyị ahụ kwuru bụ eziokwu, ma ha ahụghị Jisọs.”
25
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ịnabata ihe ndị amụma kwuru.
26
Ọ̀ bụ na ndị amụma ekwughị ya nꞌụzọ pụtara ìhè na Kraịst ga-esi otu a hụọ ahụhụ, tupuu ọ banye nꞌebube ya?”
27
Mgbe ahụ Kraịst sitere nꞌakwụkwọ nsọ kọwaara ha ihe akwụkwọ nsọ kwuru banyere ya onwe ya. O sitere nꞌakwụkwọ nke Mosisi dere ruo nꞌakwụkwọ nile ndị amụma dere.
28
Ha na Kraịst gagidere ije tutuu ha eruo Emaus, obodo nta ahụ ha na-aga. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jisọs mere dị ka ọ ga-aga nꞌihu nꞌije ya.
29
Ma mmadụ abụọ ahụ rịọrọ ya sị, “Nọnyerenụ anyị, nꞌihi na chi ebidola iji.” Jisọs soro ha baa nꞌụlọ ịnọnyere ha.
30
Nꞌoge ha nọdụrụ ala iri nri anyasị, Jisọs were beredi kelee Chineke ekele, ọ nyawara ya nye ha ka ha rie.
31
Nꞌoge ahụ kwa Chineke meghere anya ha, mee ka ha ghọta na ọ bụ Jisọs ka ha na ya nọ. Ma nꞌotu mgbe ahụ ha matara na ọ bụ ya, Jisọs gbara barịị, fuo. Ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.
32
Mgbe ahụ mmadụ abụọ ahụ bidoro ịgwarịta onwe ha okwu sị, “Ọ̀ bụ na obi anyị ejupụtaghị nꞌọṅụ mgbe anyị na ya nọ nꞌụzọ ọ na-akọwara anyị ihe dị nꞌakwụkwọ nsọ?”
33
Nꞌotu oge ahụ, ha hapụrụ Emaus bido ịlaghachi Jerusalem. Mgbe ha ruru, ha hụrụ ndị ozi iri na otu ahụ na ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ,
34
ndị gwara ha okwu sị, “Onyenwe anyị esitela nꞌọnwụ bilie nꞌezie, o gosila Saimọn onwe ya!”
35
Mgbe ahụ ha gwara ndị ahụ ihe nile mere mgbe ha na-aga nꞌụzọ, na otu ha si ghara ịmata na ọ bụ Jisọs na-agwa ha okwu tutuu ruo nꞌoge ha hụrụ ya ka ọ nyawara beredi ahụ.
36
Mgbe ha nọ na-ekwu okwu ndị a, Jisọs, onye ha na-ekwu okwu ya, batara nꞌụlọ ahụ guzo nꞌetiti ha, sị ha, “Udo dịrị unu.”
37
Mgbe ha hụrụ ya, ụjọ dị ukwuu tụrụ ha, nꞌihi na ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha hụrụ.
38
Ma Jisọs zara ha sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu? Gịnị mere unu ji na-enwe obi abụọ?
39
Leenụ anya nꞌaka m! Leekwanụ anya nꞌụkwụ m! Ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ahụ. Metụnụ m aka chọpụtanụ ihe m bụ nꞌonwe unu, nꞌihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ dị ka m nwere.”
40
Mgbe ọ nọ na-agwa ha okwu ndị a, o setipụrụ aka ya gosi ha apa ntu dị ya nꞌaka. O gosikwara ha ụkwu ya ka ha hụrụ ọnya dị ya.
41
Ma o siiri ndị na-eso ụzọ ya ike inwe mkpebi na ọ bụ ya nꞌezie. Ọṅụ jupụtara obi ha, ma otu aka ahụ kwa, ha jupụtara nꞌobi abụọ. Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ha sị, “Ọ dị ihe oriri unu nwere?”
42
Ha nyere ya ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ.
43
Ọ naara ya rie ya nꞌihu ha nile.
44
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Mgbe mụ na unu nọ, agwara m unu na ihe nile Mosisi na ndị amụma dere banyere m, na ihe e dekwara nꞌAbụ Ọma ga-emezucha.”
45
Mgbe ahụ o meghere akọnuche ha, ime ka ha ghọta ihe nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere ya.
46
Ọ gwara ha sị, “E dere ya rị nꞌoge gara aga na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ, nwụọ, na ọ ga-ebilikwa nꞌụbọchị nke atọ.
47
E dekwara ya sị na a ga-ekwusara ndị mmadụ otu ha ga-esi chegharịa nweta mgbaghara site nꞌịtụkwasị m obi. A ga-ekwusa ya nye mmadụ nile na mba nile, bido na Jerusalem.
48
Unu bụkwa ndị akaebe na ihe nile ndị amụma kwuru emezuola.
49
“Ma nọdụnụ nꞌobodo Jerusalem a tutuu Mmụọ Nsọ abịa mejupụta unu nꞌike. Nꞌihi na aga m ezite ya ka ọ bịakwasị unu dị ka Nna m kwere nkwa ime.”
50
Mgbe Jisọs gwasịrị ndị na-ezo ụzọ ya okwu a, o duuru ha gaa Betani. Nꞌebe ahụ ka ọ nọ welie aka ya elu gọzie ha.
51
Mgbe Jisọs nọ na-agọzi ha, e bidokwara iweli ya elu tutuu ruo mgbe ha na-ahụkwaghị ya anya ọzọ.
52
Ndị na-eso ụzọ ya kpọrọ isi ala nye ya nꞌọnọdụ ife ya ofufe. Emesịa ha lọghachiri na Jerusalem; oke ọṅụ jukwara ha obi.
53
Ha nọgidere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ oge nile, na-eto Chineke.
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24