bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 13
Luke 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 14 →
1
Nꞌoge a ụfọdụ mmadụ nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ gwara Jisọs okwu sị, “Ọ dị ụfọdụ ndị Juu si akụkụ Galilị ndị Pailet gburu mgbe ha na-enye onyinye ịchụ aja nꞌụlọ nsọ ukwu dị na Jerusalem.”
2
Jisọs jụrụ ha sị, “Unu chere na ndị ahụ Pailet gburu bụ ndị mmehie karịa ndị Juu ọzọ bi na Galili! Ọ̀ bụ ya mere ha ji hụọ ahụhụ dị otu a? Mbaa!
3
Ka m gwa unu eziokwu, ọ bụrụ na unu onwe unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke, unu ga-esikwa otu a laa nꞌiyi.
4
“Ka m jụọkwka unu ọzọ, gịnị ka unu na-eche banyere mmadụ iri na asatọ ahụ mgbidi Silom dagburu? Unu na-eche na ndị ahụ bụ ndị mmehie karịa ndị nile bi na Jerusalem?
5
Baa! Otu a ka unu onwe unu ga-esikwa laa nꞌiyi ma ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke.”
6
Mgbe ahụ Jisọs kọọrọ ha akụkọ a, “Otu nwoke kụrụ osisi fiigi nꞌubi ya. Mgbe oge ruru ka osisi ahụ mịa mkpụrụ, nwoke a bịara lee ma ọ ga-enweta mkpụrụ ọ bụla, ma ọ dịghị nke ọ chọtara. Ọ bịakwara ọzọ, bịakwa ọzọ, ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla ọ chọtara.
7
Nꞌikpeazụ, nwoke ahụ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Gbutuo osisi fiigi a nꞌihi na ọ bakwaghị uru. Nke a emeela afọ atọ m bịara ịghọ mkpụrụ nꞌelu ya, ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla m hụrụ. Gịnị bụ uru ọ bara ịhapụ ya, mgbe anyị nwere ike iji ala a mee ihe ọzọ dị mkpa?’
8
“Ma onye ọrụ ubi ahụ zara sị, ‘Nna m ukwu, ka anyị nye ya ohere otu afọ ọzọ. Aga m elezi ya anya, hinye ya aja nꞌukwu.
9
Ka anyị lee anya nꞌafọ ọzọ ma ọ ga-amị mkpụrụ. Ọ mịa mkpụrụ mgbe ahụ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị mkpụrụ, aga m egbutu ya.’ ”
10
Nꞌotu ụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs banyere nꞌime otu ụlọ ekpere ndị Juu bido izi ihe.
11
Nꞌime ụlọ ahụ, o nwere otu nwanyị bịara, nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Mmụọ ọjọọ a emeela ka nwanyị a nọọ nꞌọrịa afọ iri na asatọ. Kemgbe oge ahụ, nwanyị a na-ehu ehu mgbe ọ bụla ọ na-aga ije, o nweghị ike iguzo kwem.
12
Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya, metụ ya aka, sị “Nwanyị, site taa gaa nꞌihu, ị bụrụla onye a gwọrọ site nꞌọrịa nke a.” Otu mgbe ahụ nwanyị a guzoziri ọtọ nke ọma, bido ikele na ito Chineke.
14
Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nꞌihi na Jisọs gwọrọ nwanyị a nꞌụbọchị izuike. O biliri gwa ndị mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nꞌime izu ụka mgbe mmadụ kwesịrị ịrụ ọrụ. Ọ bụrụ na ahụ esighị gị ike, ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka a gwọọ gị, bịa nꞌime ụbọchị isii ndị a. Abịakwala nꞌụbọchị izuike ka a gwọọ gị!”
15
Ma Jisọs zara nwoke ahụ sị, “Ị bụ nnọọ onye ihu abụọ! Ị na-achọ ịkọwa na gị onwe gị adịghị arụ ọrụ ọ bụla nꞌụbọchị izuike? Ị̀ naghị atọpụ ehi gị ma ọ bụ inyinya ibu gị ebe i kenyere ha, duru ha gaa nꞌebe ha ga-enweta mmiri ha na-aṅụ nꞌụbọchị izuike?
16
Ugbu a ị̀ na-ekwu na m mere ihe ọjọọ nꞌihi na m mere ka ahụ dị nwanyị a bụ onye Juu mma? Èmere m ihe ọjọọ nꞌihi na m tọpụrụ nwanyị a site nꞌagbụ ekwensu kere ya kemgbe afọ iri na asatọ nꞌụbọchị izuike?”
17
Okwu a Jisọs kwuru mere ka ihere mee ndị iro ya. Ma ndị nile nọ nꞌụlọ ekpere ahụ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ọrụ ebube nile ọ rụrụ.
18
Mgbe ahụ Jisọs bidoro izi ha ihe banyere alaeze Chineke. Ọ gwara ha okwu sị, “Gịnị bụ ihe o yiri?
19
Alaeze Chineke dị ka mkpụrụ mọsụtadị nke onye ọrụ ubi na-ewere kụọ nꞌubi ya. Mkpụrụ a na-eto bụrụ osisi, ebe ụmụ nnụnụ na-abịa wuo akwụ ha nꞌalaka ya.”
20
Ọzọ Jisọs gwakwara ha sị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyekwara alaeze Chineke?
21
Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere tinye nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ụtụ ọka ahụ koro.”
22
Jisọs jegharịrị nꞌobodo ukwu nile na nꞌobodo nta nile na-ezi ihe, tutuu ọ bịaruo Jerusalem.
23
Nꞌoge a otu onye jụrụ ya ajụjụ sị, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị nta?”
24
Jisọs zara ya sị, “Ọnụ ụzọ e si abanye nꞌeluigwe dị warara. Ya mere, gbalịsie ike ịbanye. Nꞌihi na ọtụtụ ga-achọ ịbata ma ha agaghị enwe ike ịbanye.
25
Nꞌihi na mgbe onye nwe ụlọ ahụ biliri mechie ọnụ ụzọ ya, ọ dịkwaghị onye ọ bụla nwere ike ịbanyekwa. Mgbe ahụ ọ bụrụ unu anọdụ nꞌezi kụọ aka nꞌọnụ ụzọ na-arịọ arịrịọ sị, ‘Onyenwe anyị biko megheere anyị ụzọ,’ ọ ga-aza sị, ‘Amaghị m ndị unu bụ. Amakwaghị ebe unu si bịa.’
26
“Nꞌoge ahụ unu ga-azaghachi sị, ‘Onyenwe anyị, ọ bụ anyị na gị soro rikọọ nri. Ọ bụkwa nꞌokporo ụzọ dị nꞌakụkụ ụlọ anyị ka ị nọ zie ndị mmadụ ihe.’
27
“Ma aga m aza unu sị, ‘Nꞌezie, amaghị m unu, amaghị m ebe unu si bịa. Nyenụ m ohere, unu ndị ajọ omume!’
28
“Nꞌoge ahụ ọtụtụ mmadụ ga-akwa akwa, taakwa ikikere eze na mwute, mgbe ha ga-eguzo nꞌezi hụ Eberaham, na Aizik na Jekọb na ndị amụma nile ka ha nọ nꞌalaeze Chineke.
29
Ọtụtụ mmdụ ga-esitekwa nꞌakụkụ nile nke ụwa bịa soro nọdụ ala iri nri nꞌalaeze Chineke.
30
Hụbakwanụ okwu m a ama, nꞌụbọchị ahụ, ndị ahụ a na-eleda anya ugbu a ga-abụ ndị a ga-enye nsọpụrụ dị ukwuu. Ma ndị ahụ a na-asọpụrụ nke ukwuu ugbu a, ga-abụ ndị na-adịghị oke mkpa.”
31
Mgbe oge nta gasịrị ụfọdụ ndị si nꞌotu ndị Farisii bịara nꞌebe Jisọs nọ gwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ ndụ gị nꞌanya, sitekwa nꞌebe a pụọ ngwangwa, nꞌihi na Herọd na-achọsi ike igbu gị.”
32
Ma Jisọs zara ha sị, “Gaanụ gwa anụ ụrụ ahụ na m kwuru sị, na taa na echi, aga m anọgide na-arụ ọrụ m na-arụ ịchụpụ mmụọ ọjọọ na ịgwọ ndị ọrịa. Gwakwanụ ya na nwanne echi aga m arụcha ọrụ m.
33
Ee, aga m arụ ọrụ m taa na echi na nwanne echi tutuu ruo mgbe m ga-eru ebe m na-aga. Nꞌihi na ọ bụ nnọọ ihe were mmadụ nile anya na onye amụma Chineke ọ bụla enweghị ike ịnwụ nꞌebe ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị nanị na Jerusalem.
34
“Ị dị nnọọ egwu gị obodo Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma na nke na-eji nkume atụgbu ndị nile Chineke zitere inyere gị aka. Lee ka m si gbalịa ịchịkọta ụmụ gị ọnụ, dị ka nne ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya nꞌokpuru nku ya, ichebe ha, ma ị chọghị.
35
Ugbu a ahapụrụla m gị ụlọ gị ka ọ bụrụ ihe tọgbọrọ nꞌefu. Ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ tutuu ruo mgbe i jikeere ịnabata m na ịsịkwa, ‘Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.’ ”
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24