bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 14
Luke 14
Igbo 1988
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 15 →
1
Otu ụbọchị izuike Jisọs gara iri ihe nꞌụlọ otu nwoke bụ onye dị mkpa nꞌetiti ndị Farisii. Mgbe Jisọs nọ nꞌụlọ ahụ, ọtụtụ ndị nọ nꞌụlọ ahụ nọ na-ele ya anya.
2
Nꞌụlọ ahụ otu nwoke ụkwụ ya zara aza bịakwutere Jisọs.
3
Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị na-ezi ihe ajụjụ sị, “O ziri ezi ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike, ka unu sị na ọ bụ ihe ọjọọ ime ihe dị otu a?”
4
Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu ahụ ekwughị okwu ọ bụla. Mgbe ahụ Jisọs gwọrọ nwoke ahụ sị ya laa.
5
Emesịa, Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “A sị na onye ọ bụla nꞌetiti unu nwere nwa ma ọ bụ ehi nke danyere nꞌime olulu mmiri nꞌụbọchị izuike ọ gaghị aga dọpụta ya?”
6
Ma o nweghị ihe ha nwere ikwu banyere ihe Jisọs kwuru.
7
Mgbe Jisọs hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri ahụ si họrọ nanị oche dị mkpa, oche dị mkpa, ọ gwara ha okwu a nꞌilu sị.
8
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ gị oriri ọlụlụ nwụnye, abatala nọdụ nꞌoche dị mkpa, nꞌihi na ma eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara ndị ọzọ dị mkpa karịa gị.
9
Nꞌihi na mgbe ndị e debeere oche ahụ dị mkpa bịara, onye kpọrọ gị oriri ga-abịakwute gị sị gị nye onyenwe oche ohere. Mgbe ahụ ị ga-ebili nꞌanya ihere gaa nọdụ nꞌoche dị ala.
10
“Kama mgbe ị batara, legharịa anya, nọdụ nꞌoche dị ala. Mgbe onye kpọrọ gị oriri bịara hụ gị, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, bịa nọdụ nꞌoche a dị mkpa e debeere gị.’ Nꞌoge ahụ ị ga-enwe ugwu nꞌanya ndị ọzọ a kpọrọ oriri ahụ.
11
Onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye ọ bụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
12
Jisọs gwakwara onye ahụ kpọrọ ya oriri ahụ sị, “Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịkpọ oriri, akpọla nanị ndị enyi gị na ụmụnne gị na ndị ikwu gị na ndị ọgaranya, nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ndị a nanị ka ị kpọrọ, ha ga-akpọkwa gị nꞌoge nke ha.
13
Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ụkwụ rụrụ na ndị ngwụrọ na ndị ìsì.
14
Ebe ọ bụ na ndị a enweghị ike ịkwụghachi gị, Chineke ga-agọzi gị, kwụghachikwa gị, dị ka ọ ga-esi kwụghachi gị mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie.”
15
Mgbe otu nꞌime ndị a kpọrọ oriri ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru o kwuru okwu nꞌoke olu sị, “Ọṅụ dịrị nwoke ahụ ga-eso rie nri nꞌalaeze Chineke!”
16
Ma Jisọs zara ya sị, “O nwere otu nwoke kpọrọ ọtụtụ mmadụ ka ha bịa oriri.
17
Mgbe oge oriri ahụ ruru, o zipụrụ ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa nꞌihi na e dozichaala ihe nile.
18
Ma ndị nile a kpọrọ oriri ahụ bidoro ịsị na ha agaghị abịa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Ọ dịbeghị anya m kwụrụ ụgwọ ala m zụrụ. Ala m aga ile ya. Biko gwara m nna gị ukwu na agaghị m abịa.’
19
Onye ọzọ a kpọkwara sịrị, ‘Ọ dịbeghị anya kemgbe m zụrụ ehi iri. Ana m aga ka m ga hụ ha. Gwa nna gị ukwu na agaghị m abịa.’
20
Onye ọzọ sịkwara, ‘Alụrụ m nwanyị ọhụrụ, nꞌihi nke a biko gwa nna gị ukwu na agaghị m abịa.’
21
Onye e ziri ozi lọtara kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ kwuru. Iwe dị ukwuu were nwoke ahụ kpọrọ oriri ahụ. Ọ gwara onye na-ejere ya ozi sị, ‘Gaa ngwangwa nꞌokporo ụzọ ukwu na okporo ụzọ nta kpọbata ndị ogbenye nile na ndị ngwụrọ nile na ndị ụkwụ rụrụ arụ nile ị hụrụ.’ Onye ozi ahụ pụrụ kpọbatachaa ndị nile ọ hụrụ. Emesịa, ọ bịara gwa nna ha ukwu sị, ‘Nna anyị ukwu, akpọbatala m ndị nile ị sị m kpọbata, ndị ogbenye na ndị ngwụrọ na ndị ụkwụ rụrụ arụ. Ma ohere ka fọdụkwara nꞌụlọ.’
23
“Nwoke ahụ sịrị odibo ya, ‘Gaakwa nꞌokporo ụzọ ukwu na okporo ụzọ nta dị nꞌobodo nta nile dị gburugburu obodo ukwu a, kpọọ onye ọ bụla ị hụrụ, nꞌihi na achọrọ m ka ụlọ m ju eju.
24
Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m sịrị na o nweghị onye ọ bụla nꞌime ndị ahụ m buru ụzọ kpọọ ka ha bịa nꞌoriri a ga-abata nꞌụlọ m.’ ”
25
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, o sitere nꞌụlọ ahụ pụọ. Oke igwe mmadụ sokwaara ya, nꞌoge a. Jisọs tụgharịrị lee ha anya sị ha,
26
Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ibu onye na-eso ụzọ m, onye ahụ ga-ahụ m nꞌanya karịa nna ya na nne ya na nwụnye ya na ụmụ ya, na ụmụnne ya nwanyị. Ọ ga-ahụkwa m nꞌanya karịa ndụ nke aka ya.
27
Onye ọ bụla kwa nke na-eburughị obe ya soro m enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m.
28
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ iwu ụlọ, ọ̀ gaghị eburu ụzọ nọdụ ala gukọọ ihe ọ ga-efu ya iwu ụlọ ahụ? Ọ̀ gaghị agụkọkwa ego o nwere nꞌaka ya mata ma ọ ga-ezuru ya iwu ụlọ ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị ezuru ya?
29
Nꞌihi na ọ bụrụ na o cheghị echiche banyere nke a, o nwere ike wuruo nanị na ntọ ala ụlọ ahụ kwụsị, chọpụta na o jizughị ego ga-ezuru ya. Mgbe ahụ ọ bụrụ na ndị mmadụ esi ebe ahụ gafee hụ na o nweghị ike iwucha ụlọ ya, ha ga-ebido ịchị ya ọchị, na-asị,
30
“ ‘Leenụ kemgbe nwoke a bidoro iwu ụlọ a, ma o nwebeghị ime wuchaa ya.’
31
“Ọ bụrụ na otu eze achọọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị eburu ụzọ chọpụta ma o nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye eze nke ọzọ ji iri puku ndị agha abụọ abịa ọgụ?
32
Ọ bụrụ na eze ahụ achọpụta na o nweghị ike iji puku ndị agha iri merie onye ji iri puku ndị agha abụọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị eziga ozi nye eze ahụ rịọ ka e kpee udo mgbe eze ahụ ka nọ ebe dị anya?
33
“Nꞌụzọ dị otu a, onye ọ bụla na-ewezugaghị ihe nile ọ na-eme, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
34
“Nnu bụ ihe dị mma. Ma ọ bụrụ na nnu etufuo ụtọ ya, ọ̀ dịkwa ụzọ ọzọ e si eme ya ka ọ tọọkwa ụtọ dị ka nnu ọzọ?
35
Ọ dịkwaghị uru ọzọ ọ bara. Ihe a ga-eme bụ itufu ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka okwu m kwuru baara gị uru, jiri ya mee ihe ga-abara gị uru.”
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24