bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 11
Luke 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 12 →
1
Otu ụbọchị Jisọs nọ na-ekpe ekpere. Ndị na-eso ụzọ ya nọkwa nꞌebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere. Mgbe o kpesịrị, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị otu anyị kwesịrị isi kpee ekpere, dị ka Jọn siri zi ndị na-eso ụzọ ya.”
2
Jisọs zara ha sị, “Mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, unu si otu a kpee ya, Nna anyị, ka e doo aha gị nsọ, ka alaeze gị bịa.
3
Nye anyị nri ga-ezuru anyị kwa ụbọchị.
4
Gbaghara anyị mmehie anyị, nꞌihi na anyị na-agbaghara onye ọ bụla mejọrọ anyị. Edubakwala anyị nꞌọnwụnwa.”
5
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ dị otu onye nꞌime unu nke enyi ya bịakwutere nꞌetiti abalị, kụọ aka nꞌụzọ kpọtee ya sị, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe beredi atọ,
6
nꞌihi na otu nꞌime ndị enyi m bịara nꞌụlọ m ugbu a, ma enweghị m nri ọ bụla nꞌụlọ m ga-enye ya.’
7
Nwoke ahụ a kpọtere nꞌụra ọ ga-ekwu sị, ‘Enyi m, biko enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ọtọ ugbu a inye gị ihe ọ bụla?’ Echeghị m na unu ga-eme nke a.
8
“Nꞌihi na ọ bụ ezie na ọ gaghị agụ nwoke ahụ agụụ isite nꞌihe ndina ya bilie bịa nye enyi ya ahụ ihe ọ rịọrọ, ma ọ ga-ebili meere ya ihe ọ chọrọ nꞌihi na ihere emeghị nwoke ahụ nke bịara nọgidesie ike ịrịọ arịrịọ ahụ.
9
Ya mere, ana m agwa unu sị, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọọnụ aka, a ga-emeghere unu ụzọ.
10
Nꞌihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nꞌụzọ ka a na-emeghere.
11
“Ajụjụ a dịrị unu bụ nna nwere ụmụ. Onye nꞌime unu ka nwa ya ga-abịakwute ka o nye ya beredi, o were nkume nye ya?
12
Ọ bụrụkwa na nwa unu arịọ unu azụ, unu ga-enye ya akpị?
13
“Ọ bụrụ na unu ndị ajọ omume pụrụ inye ụmụ unu ezi ihe, unu echeghị na nna unu bi nꞌeluigwe ga-esitekwa otu a were Mmụọ Nsọ ya nye ndị rịọrọ ya?”
14
Otu ụbọchị mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ bi nꞌime otu nwoke dara ogbi, nwoke ahụ bidoro ikwu okwu. Ọrụ a jụrụ mmadụ nile anya.
15
Ma ụfọdụ mmadụ nꞌime ndị nọ ebe ahụ kwuru sị, “Ọ bụ site nꞌike ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ ka o si achụpụ mmụọ ọjọọ ndị a.”
16
Ndị ọzọ nwakwara ya ọnwụnwa sị ya gosi ha ihe ịrịba ama na mbara eluigwe iji gosi na ọ bụ Onye nzọpụta.
17
Ma Jisọs onye maara ihe ha na-eche nꞌobi ha gwara ha okwu sị, “Obodo ọ bụla ịlụ ọgụ dị nꞌime ya agaghị adịgide ruo mgbe tere anya, ezinụlọ ọ bụla kwa nkewa na ịlụ ọgụ dị nꞌime ya, enweghị ike ịnọkọta.
18
Ya mere, ọ bụrụ na ekwensu na-alụso onwe ya ọgụ site nꞌinye m ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, alaeze ya ọ̀ ga-esi aṅaa guzosie ike?
19
Ọ bụrụ na m sitere nꞌike ekwensu achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ site nꞌike onye ka ụmụ unu ji achụpụ ndị ha na-achụpụ? Ya mere, ọ bụ ndị na-eso ụzọ unu ga-ezi unu na okwu unu erijughị afọ.
20
Ma ọ bụrụ na m na-esite nꞌike Chineke nyere m na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ nke a ga-egosi unu na alaeze Chineke abịarutela nꞌebe unu nọ.
21
“Mgbe nwoke dị ike jiri egbe na mma chee ụlọ ya nche, mmadụ ọ bụla enweghị ike bata nꞌime ụlọ ahụ zuo ohi.
22
Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka nwoke ahụ ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ pụrụ ịnapụ ya egbe na mma ahụ o ji, banyekwa nꞌụlọ ya, kwakọrọ ngwongwo ya.
23
“Onye ọ bụla na-adịnyereghị m, na-emegide m. Onye ọ bụla kwa na-adịghị enyere m aka ikpokọta ekpokọta, na-achụsasị achụsasị.
24
“Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ si nꞌime mmadụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-ejegharị nꞌala akọrọ na-achọgharị ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na mmụọ ọjọọ ahụ achọtaghị ebe izuike, ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alaghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’
25
Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala obi nwoke ahụ ma ọ tọgbọrọ nꞌefu.
26
Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ na-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha nile ga-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”
27
Mgbe Jisọs kpụ okwu a nꞌọnụ, otu nwanyị nọ nꞌime igwe mmadụ ahụ tiri mkpu sị, “Chineke gọzie nne gị, onye mụrụ gị na onye nyere gị ara!”
28
Jisọs zara ya sị, “Ngọzi Chineke dịịrị ndị nụrụ okwu Chineke, jirikwa ihe ha nụrụ mee ihe.”
29
Mgbe ọtụtụ mmadụ na-abịa, na-agba Jisọs gburugburu, Jisọs gwara ha sị, “Ndị ọgbọ a bụ nnọọ ndị ọjọọ. Ha nọgidesịrị ike na-arịọ m ka m meere ha ihe ịrịba ama nke ga-egosi ha na m bụ Onye nzọpụta. Ma ọ dịghị ihe ịrịba amua ọ bụla a ga-egosi ha karịa ihe ịrịba ama Jona.
30
Nꞌihi na dị ka Jona siri bụrụ ihe ama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-esi bụrukwa ihe ama nye ndị ọgbọ a.
31
“Nꞌụbọchị ikpe ahụ, eze nwanyị obodo Sheba ga-ebili gbaa ama megide ndị mmadụ bi nꞌọgbọ a, maakwa ha ikpe, nꞌihi na ọ gara ogologo ije nꞌime nsogbu, ịbịa ige ntị nꞌokwu amamihe Solomọn, ma onye dị ukwuu karịa Solomọn nọ nꞌebe a ugbu a, ma unu achọghị ige ya ntị.
32
“Nꞌụbọchị ikpe ahụ kwa, ndị obodo Ninive ga-ebili gbaa ama megide unu nꞌihi na ha chegharịrị mgbe Jona gwara ha okwu Chineke, ma ugbu a onye ka Jona ukwuu nọ nꞌebe a, ma unu achọghị ige ya ntị.
33
“Ọ dịghị onye na-amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌebe zoro ezo ma ọ bụ nꞌokpuru nkata, kama ọ na-adọkwasị ya nꞌelu tebulu ka ndị na-abata nꞌụlọ ahụ hụ ìhè.
34
Anya bụ iheọkụ nye ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị nile ga-ejupụta nꞌìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nꞌọchịchịrị.
35
Kpachara anya ka ìhè dị nꞌime gị hapụ ịghọ ọchịchịrị.
36
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị nile ejupụta nꞌìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ahụ gị ọ bụla agbakwaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ ìhè dị nꞌahụ gị ga-apụta ìhè dị ka a ga-asị na ọ bụ iheọkụ na-enwuzi enwuzi na-enye gị ìhè.”
37
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa nꞌụlọ ya soro ya rie nri. Jisọs gakwara, soro ndị ọzọ a kpọrọ nọdụ iri nri.
38
O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe Jisọs bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupuu ya ebido.
39
Ma Jisọs gwara onye Farisii ahụ okwu sị, “Ihe na-eme unu ndị Farisii bụ na unu na-asacha azụ iko na efere unu, mee ka ha dị ọcha, ma ime unu jupụtara nꞌanya ukwu na nꞌịhe ọjọọ dị iche iche.
40
Ndị nzuzu! Ọ̀ bụghị otu Chineke ahụ mere ka ihe ọ bụla nwee ihu na azụ?
41
Ọ bụrụ na unu ga-enwe mkpebi nꞌobi unu inyere ndị ogbenye aka, unu ga-achọpụta na ihe nile dị ọcha.
42
“Ahụhụ dịrị unu ndị Farisii, nꞌihi na unu na-enye Chineke otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ego nile unu nwere, ya na otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke akwụkwọ nri ntakịrị dị nꞌubi unu, ma unu ekpọghị ikpe ziri ezi na ịhụ Chineke nꞌanya ihe dị mkpa. Unu kwesịrị inye onyinye unu, ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe unu kwesịrị ime.
43
“Ahụhụ dịrị unu ndị Farisii! Nꞌihi na unu hụrụ ịnọdụ ala nꞌisi oche nꞌụlọ ekpere unu nꞌanya, hụkwa ekele pụrụ iche a na-ekele unu nꞌahia nꞌanya.
44
Ahụhụ dịrị unu, nꞌihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ìhè nye ndị mmadụ, nke ndị mmadụ na-azọnye ụkwụ nꞌihi na ha amaghị na ọ bụ ili.”
45
Otu onye nꞌime ndị ozizi iwu so Jisọs na-eri nri ahụ gwara Jisọs okwu sị, “Onye ozizi, mgbe i si otu a na-akọcha ndị Farisii, ọ pụtara na ọ bụkwa anyị ka ị na-akọcha.”
46
Jisọs zara ya sị, “Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu! Nꞌihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli site nꞌịtụpụta iwu dị iche iche ha kwesịrị idebe, ma unu onwe unu adịghị agbalị idebe iwu ndị a.
47
Ahụhụ dịrị unu nꞌihi na unu na-ewuzi ili ndị amụma Chineke nna nna unu ha gburu na mgbe ochie.
48
Site nꞌụzọ dị otu a, unu na-akwagide na ihe nna nna unu ha mere bụ ezi ihe. Ha gburu ndị amụma, unu bụkwa ndị na-ewu ili ha.
49
“Ọ bụ nꞌihi nke a ka Chineke jiri kwuo okwu sị, ‘Aga m ezitere unu ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ nꞌime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgbu.’
50
“Ka ndị bi nꞌọgbọ a bụrụ ndị ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma nile a wufuru, site nꞌoge a tọrọ ntọ ala ụwa.
51
Ee, ọbara nile a wufuru site nꞌọbara Ebel, ruo nꞌọbara Zakaraya onye e gburu nꞌetiti ebe nchụaja na ebe nsọ. Ee, ana m agwa unu, ọ bụ ndị bi nꞌọgbọ a ga-anata ahụhụ nꞌihi ihe ndị a nile.
52
“Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu nꞌihi na unu na-ezonarị ndị mmadụ eziokwu ka ha hapụ ịmata ya, ma unu onwe unu jụrụ ịnabata eziokwu ahụ. Unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ka ha nabata ya, kwerekwa ya.”
53
Mgbe Jisọs si nꞌebe ahụ na-apụ, ndị ozizi iwu na ndị Farisii sitere nꞌoke iwe juru ha obi kwuo okwu megide ya. Ha jụkwara ya ajụjụ banyere ọtụtụ ihe,
54
nꞌihi na ha chọrọ isite nꞌihe ọ ga-aza jide ya.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24