bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 12
Luke 12
Igbo 1988
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 13 →
1
Ọ dịghị anya ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Ha dị nnọọ ukwuu mee ka ọtụtụ na-azọ ibe ha ụkwụ. Mgbe ahụ, Jisọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya okwu. Ọ gwara ha sị, “Kpacharanụ anya unu nꞌebe ndị Farisii nọ. Nꞌihi na ha na-eme dị ka ha bụ ndị dị mma, ebe ọ bụ ezie na ha abụghị. Ụdị ihu abụọ ha nwere agaghị adịgide ruo mgbe dị anya.
2
Nꞌihi na ọ dịghị ihe zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị emesịa kpughee.
3
Ya mere, ihe ọ bụla unu kwuru nꞌọchịchịrị, a ga-emesịa nụ ya mgbe chi bọrọ, ihe ọ bụla kwa unu takịịrị na ntị mmadụ mgbe unu mechiri ụzọ, a ga-emesị site nꞌelu ụlọ tisasịa ya.
4
“Ndị enyi m, unu atụla egwu ndị chọrọ igbu unu. Nꞌihi na ọ bụ nanị anụ ahụ ka ha nwere ike igbu. Ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka.
5
Ma ka m gwa unu onye unu kwesịrị ịtụ egwu. Tụọnụ egwu Chineke, onye nwere ike igbu mmadụ tụnyekwa ya ala mmụọ.
6
“Ego ole ka ndị mmadụ na-ere ụmụ nza ise? Ọ bụghị kobo abụọ? Ma o nweghị nke ọ bụla nꞌime ha Chineke chefuru.
7
Chineke makwaara ọ bụladị ọnụ ọgụgụ agịrị isi dị nꞌisi unu. Unu atụla egwu. Unu dị mkpa karịa ọtụtụ ụmụ nza.
8
“Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla kwuwapụtara nꞌihu ndị mmadụ na ya bụ onye na-eso m, ya ka m ga-ekwukwa okwu banyere nꞌihu ndị mmụọ ozi Chineke na ọ bụ onye dinyeere m.
9
Ọ bụrụkwa na mmadụ ọ bụla agọnarị m nꞌihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nꞌihu ndị mmụọ ozi Chineke. Aga m asị, amaghị m onye ọ bụ.
10
Onye ọ bụla kwujọrọ mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-enweta mgbaghara, ma onye ọ bụla kwujọrọ Mmụọ Nsọ Chineke agaghị anata mgbaghara.
11
“Mgbe ha kpọtara unu nꞌụlọ ekpere ndị Juu, ma ọ bụ nꞌihu ndị na-achị achị, ikpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu.
12
Nꞌihi na ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-etinye okwu unu ga-ekwu nꞌọnụ unu mgbe unu guzoro nꞌihu ha.”
13
Mgbe Jisọs na-ekwu okwu a, otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ kpọrọ ya sị, “Onye ozizi, biko gwa nwanne m ka o kenye m ihe ruru m nꞌime akụ na ụba nke nna anyị hapụụrụ anyị mgbe ọ nwụrụ.”
14
Jisọs zara ya sị, “Enyị, onye nyere m ike ikpebiri gị na nwanne gị ụdị okwu a?”
15
Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Kpachapụnụ anya, nꞌihi na ndụ mmadụ adabereghị nanị nꞌihe o nwere, ma ọ bụ otu onye ahụ siri baa ụba.”
16
Mgbe ahụ Jisọs kọọrọ ha akụkọ a sị, “Otu onye ọgaranya nwere ala nke mịrị nnọọ ezi mkpụrụ.
17
Nwoke a bidoro na-eche nꞌobi ya sị, ‘Ọ̀ba m nwere ebughị ibu. Ọ gaghị abachakwa mkpụrụ ubi a. Gịnị ka m ga-eme?’
18
O chere nnọọ echiche banyere ihe ọ ga-eme. Nꞌikpeazụ o tiri mkpu sị, ‘Ahaa! Amaara m ihe m ga-eme. Aga m akwatu ọba ahụ m nwere ugbu a, wuo ọba ọzọ buru ibu. Nꞌụzọ dị otu a aga m ewu ọba nke ga-abanyecha mkpụrụ ubi ndị a.’
19
Mgbe m mesịrị ihe ndị a, tinyechaa mkpụrụ ubi a nꞌọba ọhụrụ ahụ, aga m agwa onwe m okwu sị, ‘Enyi, i nwejuola nri ị ga-eri ọtụtụ afọ. Kwụsị ịdọgbu onwe gị nꞌọrụ. Zuru ike. Rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mee ka obi tọọ gị ụtọ. Nchegbu ọ bụla adịkwaghi nye gi.’
20
“Ma Chineke gwara nwoke ahụ sị, ‘Onye iberibe! Taa, nꞌabalị a, ka m ga-anarakwa gị ndụ ahụ m nyere gị. Mgbe ị nwụrụ onye ga-eketa ihe ndị a nile ị kpakọtara?’ ”
21
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị mmadụ ahụ sị, “Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọ bụla na-akpadoro nanị onwe ya akụ, nke na-abaghị ụba nꞌihu Chineke.”
22
Ọzọ kwa, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụ nke a mere m ji gwa unu okwu sị, unu echegbula onwe unu banyere nri unu ga-eri. Unu echegbukwala onwe unu banyere uwe unu ga-eyi.
23
Ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ unu dịkwa mkpa karịa uwe unu ga-eyi.
24
Leenụ ụmụ nnụnụ anya. Ha adịghị akụ mkpụrụ nꞌubi, ha adịkwaghị aghọ mkpụrụ site nꞌubi. Ha enweghị ọba ebe ha na-ekpokọta nri. Ma Chineke bụ onye na-azụ ha. Unu dịkwanu mkpa karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ.
25
“Ònye nꞌime unu pụrụ isite nꞌoke echiche ya mee ka ọ nọrọ ndụ karịa ka Chineke si chọọ?
26
Ọ bụrụ na oke echiche unu apụghị iwetara unu ogologo ndụ, gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ?
27
“Leenụ okoko ọhia, ha adịghị arụ ọrụ ọ bụla. Ha adịkwaghị akpara onwe ha akwa ha na-eyi. Ma ka m gwa unu, ọ bụladị eze Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya, eyighị uwe ọma ọ bụla mara mma dị ka okoko ọhia.
28
Ọ bụ Chineke na-eme ka ahịhịa maa mma ile anya, ee, ahịhịa nke na-eto taa, nke e nwekwara ike igbutu echi, nke a na-akpọkwa ọkụ ma ọ kpọnwụọ. Ọ bụrụ na Chineke na-eme ka ahịhịa efu maa mma, unu na-eche na ọ gaghị egboro unu mkpa uwe, unu ndị obi abụọ?
29
Ya mere, unu anọgidela nꞌoke echiche na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ?
30
Nꞌihi na ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-echegbu onwe ha banyere ihe ndị a. Nna unu bi nꞌeluigwe maara na ihe ndị a dị unu mkpa.
31
Ọ ga-enyekwa unu ihe nile na-akpa unu mkpa ụbọchị nile ma ọ bụrụ na unu ga-atụkwasị obi unu nꞌihe gbasara alaeze ya.
32
“Ya mere, unu atụla egwu ụmụ m, nꞌihi na Nna unu ahọpụtala unu inye unu alaeze ya.
33
Reenụ ihe nile unu nwere nye ndị ogbenye. Nke a ga-eme ka akpa unu, nke dị nꞌelu, ju eju. Akpa ahụ dị nꞌelu epughị epu. Akụ unu dị nꞌeluigwe enwekwaghị ike ifu efu. Onye ohi ọ bụla enwekwaghị ike ịga nꞌebe ahụ zuo ha, nla apụkwaghị iricha ha
34
nꞌihi na ọ bụ ebe ọ bụla ego unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
35
“Jikerenụ, yirinụ uwe ọgụ unu, buliekwanụ iheọkụ unu.
36
Nọọnụ na nche dị ka ụmụ odibo na-eche nlọghachi nna ha ukwu, onye gara ebe a kpọrọ ya oriri ọlụlụ nwụnye. Mgbe ọ bụla ọ ga-alọbatakwa ka unu megheere ya ụzọ ka ọ bata.
37
Ọṅụ dị ukwuu dị na-eche ụmụ odibo ahụ nna ha ukwu ga-ahụ ka ha mụ anya nọrọkwa na njikere mgbe ọ lọtara. Nꞌezie, nna ha ukwu ga-eso ha nọdụ ala, jikerekwa idoziri ha ihe oriri.
38
Ọṅụ dịrị ụmụ odibo ahụ ndị ga-anọ na njikere mgbe nna ha ukwu ga-alọghachi, ọ bụladị ma nlọghachi ya bụ nꞌetiti abalị ma ọ bụ nꞌoke isi ụtụtụ.
39
“Chetanụ nke a! Ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge onye ohi ji abịa nꞌụlọ ya izu ohi, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ gbukaa ụlọ ya.
40
Unu kwesịrị ịnọ na njikere mgbe nile nꞌihi na Nwa nke mmedụ ga-abịa nꞌoge unu na-adịghị ele anya ya.”
41
Pita zara ya sị, “Ị̀ tụrụ ilu a nꞌihi anyị, ka ọ bụ ndị mmadụ ndị a ka i bu nꞌobi tụọ ya?”
42
Jisọs zara ya sị, “Ị bụrụ odibo ahụ maara ihe, nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye nna ya ukwu kpọrọ mee onye na-elekọta ihe nile o nwere mgbe ọ na-apụ ịga njem, ka ị na-enye onye ọ bụla nọ nꞌụlọ ya nri nꞌoge ya,
43
ị ga-abụ odibo a gọziri agọzi ma ọ bụrụ na nna gị ukwu alọta hụ gị ka ị na-eme ihe ahụ ọ chọrọ.
44
Nꞌezie, o doro m anya na mgbe ọ lọtara, ọ ga-etinye gị nꞌọnọdụ ị ga-anọ na-elekọta ihe nile o nwere.
45
“Kama, ị bụrụ odibo ahụ nke na-asị nꞌime onwe ya, nna m ukwu ga-anọ ọdụ tupuu ọ lọta, ị malite iti odibo ndị nwoke na ndị nwanyị ọzọ i kwesịrị ilekọta anya ihe, i bidokwa na-eso ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-aṅụ mmanya, bụrụ onye mmanya na-egbu,
46
nna gị ukwu ga-alọta nꞌụbọchị ahụ, na oge ahụ ị na-atụghị anya ya, ọ ga-atakwa gị ahụhụ, tinye gị nꞌebe a na-edebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi.
47
Ya mere, odibo ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma jụ ijikere chere nna ya ukwu, ma ọ bụ kpebie ịhapụ ime ihe nna ya ukwu chọrọ, a ga-eti ya ezigbo ihe otiti.
48
“Ma odibo ahụ na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma mee ihe ahụ na-ewetara ndị mere ya ihe otiti, a ga-eti ya ihe ntakịrị. Nꞌihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nꞌaka ya. Nwoke ahụ ndị mmadụ nyere ihe hiri nne nꞌaka, ka ha ga-ele anya ịnata ya ihe hiri nne ha tinyere ya nꞌaka.
49
“Ihe m bịara ime nꞌụwa bụ iwebata ọkụ, ma leekwanụ ka o si na-agụsị m agụụ ike ịhụ na ọkụ a ebidola inwu ugbu a.
50
Ọ dị nnọọ ọrụ dị ukwuu dị nꞌihu m nke m na-aghaghị ịrụ, leekwa ka o si na-anụ m ọkụ nꞌobi imecha ya.
51
“Ùnu chere na m bịara iweta udo nꞌụwa? Baaa! Nꞌezie, ihe m bịara iweta nꞌụwa bụ nkewa.
52
Nꞌihi na site ugbu a gaa nꞌihu, ebe ọ bụla e nwere mmadụ ise nꞌezinụlọ, mmadụ atọ ga-ebili megide mmadụ abụọ ndị ọzọ.
53
Nna ga-ekpebiri onwe ya ihe ọ na-eche banyere m, nwa ya nwoke ga-enwekwa mkpebi nke ya. Nne na ada ya nwanyị agaghị enwe nkwekọta ọ bụla, otu a kwa nwụnye nwa agaghị anabatakwa ihe ọ bụla nne di ya kwuru dị ka eziokwu.”
54
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị lee igwe mmadụ ahụ anya sị, “Mgbe ọ bụla unu lere anya hụ igwe ojii nꞌọdịda anyanwụ, unu na-asị ‘Mmiri ga-ezo taa.’ Mmiri na-ezokwa.
55
“Otu a kwa, mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, ‘Ọ̀kọchị ga-akọ nnọọ taa.’ Ọkọchị na-akọkwa.
56
Ndị ihu abụọ! Unu nwere ike isite nanị nꞌile anya na mbara eluigwe mata ma mmiri ọ ga-ezo, ma ọ bụ na ọkọchị ga-akọ. Ma unu enweghị ike isite nꞌihe ndị a nile na-eme nꞌanya unu ugbu a mata ihe oge a anyị nọ nꞌime ya bụ.
57
Gịnị mere unu ji jụ ịnabatara onwe unu ihe ziri ezi?
58
“Ka m dọọ unu aka na ntị, ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nꞌihu onye ikpe, gbalịsie ike hụ na gị na ya kpere udo tupuu ikpe gị na ya eruo ụlọ ikpe. Ma i meghị otu a, ọkaikpe ga-ama gị ikpe, tinye gị nꞌụlọ mkpọrọ.
59
Ọ bụrụkwa na o si otu a mee, ị gaghị esite nꞌụlọ mkpọrọ ahụ pụtakwa ọzọ tutuu ruo mgbe ị kwụsịrị ego nile i nwere, na-afọdụghị otu kobo.”
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24