bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 5
Luke 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 6 →
1
Otu ụbọchị, Jisọs guzoro nꞌakụkụ iyi ukwu Genasaret na-agwa ndị mmadụ okwu. Ndị bịara nꞌebe ahụ dị ukwuu, nke mere ka ha na-enu onwe ha aka inwe ike ịbịaru ya nso, ka ha nụrụ ihe ọ na-ekwu.
2
Mgbe ahụ Jisọs hụrụ ụgbọ mmiri abụọ e kenyere nꞌosisi dị nꞌakụkụ iyi ukwu ahụ. Ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ ha pụọ ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ mmiri.
3
Jisọs banyere nꞌime otu ụgbọ mmiri, rịọ Saimọn onyenwe ụgbọ ahụ ka o nuru ụgbọ ahụ banyetụ ntakịrị nꞌime mmiri. Jisọs nọdụrụ ala nꞌime ya bido na-ezi ndị mmadụ ihe.
4
Mgbe o kwusịrị okwu, ọ gwara Saimọn sị ya, “Banyetụkwa nꞌime mmiri ọzọ tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.”
5
Saimọn zara sị ya, “Onyenwe m, site nꞌabalị ụnyaahụ nile rute nꞌụtụtụ taa ka anyị gbalịrị ike anyị, ma o nweghị azụ anyị gbutere. Ma aga m atụnyekwa ụgbụ m dị ka i kwuru.”
6
Mgbe Saimọn wụnyere ụgbụ azụ ha na mmiri ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere ka ụgbụ azụ ha chọọ ịdọwa.
7
Mgbe ahụ Saimọn kpọrọ ndị enyi ha nọ nꞌụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ndị ha kpọrọ bịara nyere ha aka. Ha sepụtara ụgbụ ahụ wụnye azụ ha gbutere nꞌime ụgbọ mmiri ha. Azụ ahụ juru ụgbọ mmiri abụọ ahụ, mee ka ụgbọ mmiri ndị ahụ chọọ imikpu na mmiri.
8
Mgbe Pita hụrụ azụ nile ndị a nꞌime ụgbọ mmiri ndị a, o gburu ikpere nꞌihu Jisọs sị ya, “Onyenwe m biko site nꞌebe m nọ pụọ, nꞌihi na abụ m onye mmehie.”
9
Nꞌihi na o juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.
10
Ee, ọ bụladị Jemes na Jọn ụmụ Zebedi ndị ha na Pita so, ka azụ a ha gbutere juru anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu, nꞌihi na site taa gaa nꞌihu, ọrụ unu ga-abụ ịkpọbata mmadụ nꞌalaeze Chineke.”
11
Mgbe ha nyaara ụgbọ mmiri ha rute nꞌọnụ mmiri, ha hapụrụ ihe nile soro Jisọs.
12
Emesịa, mgbe Jisọs bịarutere otu obodo, o zutere otu nwoke onye ekpenta. Mgbe nwoke a hụrụ Jisọs, ọ bịakwutere ya daa nꞌala nꞌihu ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
13
Jisọs setipụrụ aka ya metụ ya aka, sị ya, “Achọrọ m ka ahụ dị gị mma, bụrụkwa onye a gwọrọ ọrịa ya.” Nꞌotu oge ahụ ọrịa ekpenta ahụ lara.
14
Mgbe ahụ Jisọs dọrọ nwoke ahụ aka na ntị sị ya, “Agwakwala onye ọ bụla ihe m meere gị. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, nyekwa onyinye Mosisi nyere nꞌiwu na ndị a gwọrọ ọrịa ekpenta ga-enye, igosi ndị mmadụ na a gwọọla gị ugbu a.”
15
Ma akụkọ banyere Jisọs na ọrụ ya gbasara ruo ọtụtụ mmadụ ntị. Nꞌihi ya igwe mmadụ zụkọrọ ịnụrụ ihe ọ na-ekwu. Ha zukọkwara ka ọ gwọọ ha.
16
Ma site nꞌoge ruo nꞌoge, Jisọs na-ahapụ igwe mmadụ ndị a gaa nꞌebe ọ ga-anọ nanị ya ikpe ekpere.
17
Otu ụbọchị, mgbe Jisọs nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ụfọdụ nꞌime ndị Farisii na ndị ozizi iwu sokwara igwe mmadụ Jisọs na-ezi ihe nọdụ na-ege ntị. (Ọtụtụ mmadụ ndị a si nꞌobodo nta nile dị na Galili na Judia na Jerusalem bịakwute Jisọs.) Ike Chineke dịnyekwaara Jisọs nꞌụbọchị ahụ ịgwọ ndị ọrịa.
18
Nꞌoge ahụ, ụfọdụ mmadụ ndị bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nꞌihe ndina ya, bịara gbalịa isite nꞌọnụ ụzọ ụlọ ahụ Jisọs nọ ịbubata enyi ha ahụ nso ebe Jisọs nọ.
19
Ma nke a ekweghị ha omume, nꞌihi na igwe mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Ya mere, ndị a rigoro elu ụlọ ahụ Jisọs nọ nꞌime ya, dọkapụ ụfọdụ nꞌime ute e jiri kpuchie ụlọ ahụ. Ha kenyere eriri nꞌute ahụ enyi ha dina, site nꞌoghere ha mere nꞌelu ụlọ ahụ, wetuo nwoke ahụ. Ha mere ka nwoke ahụ nwee ike ịbịa nso ebe Jisọs nọ nꞌetiti igwe mmadụ ahụ gbara ya gburugburu.
20
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe na ya nwere ike ịgwọ enyi ha nwoke, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.”
21
Ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ nꞌebe ahụ leritara onwe ha anya jụọ sị, “Ònye bụ nwoke a na-adịghị asọpụrụ Chineke? Ònye pụrụ igbaghara mmadụ mmehie ma ọ bụghị nanị Chineke?”
22
Ebe Jisọs ghọtara ihe ha na-eche, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche nꞌobi unu na m adịghị asọpụrụ Chineke?
23
Olee nke karịrị mfe ikwu? Ọ̀ bụ ịgwa nwoke a sị, ‘Agbagharala m gị mmehie gị ka ọ bụ ịgwa ya sị, bilie gaa ije?’
24
Ugbu a aga m egosi unu na Nwa nke mmadụ nwere ike nꞌụwa ịgbaghara mmehie site nꞌigosi unu ike m nwere ịgwọ ọria.” Jisos chigharịrị gwa onye ọrịa ahu okwu sị “Nwoke, bilie, chịrị ute gị laa nꞌụlọ gi!”
25
Ngwangwa, nwoke ahụ wụliri elu. Ọ chịlịrị ute ya bido na-eto Chineke na-ala nꞌụlọ ya.
26
Ọrụ a tụrụ ndị nile nọ nꞌebe ahụ nꞌanya. Ha bidokwara na-eto Chineke. Oke egwu jupụtara ha nꞌobi, mee ka ha kwuo sị, “Anya anyị ahụla ihe ọ na-ahụbeghị mbụ, ọrụ ebube dị ukwuu!”
27
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs siri nꞌebe ahụ pụọ. Mgbe ọ na-aga nꞌụzọ, ọ hụrụ Livayị onye ọnaụtụ ka ọ nọ nꞌụlọ ọrụ ya. Jisọs gwara ya sị, “Bịa soro m.”
28
Ngwangwa, Livayị hapụrụ ihe nile, soro ya.
29
Emesịa, Livayị kpọrọ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oriri nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara ndị ọnaụtụ ibe ya, na ndị ọzọ kwa.
30
Mgbe ndị Farisii na ndị ozizi iwu hụrụ ka Jisọs so Livayị na ndị enyi ya na-eri nri, ha bidoro na-ajụ ndị na-eso ụzụ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere unu na nna unu ukwu ji na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri?”
31
Ma Jisọs zara ha sị, “Ndị ahụ dị mma anaghị achọ dibịa. Ọ bụ ndị ọrịa ka mkpa dibịa na-akpa.
32
Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”
33
Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji na-ebu ọnụ, na-ekpekwa ekpere oge nile, ma ndị na-eso ụzọ gị nọ nnọọ nꞌoriri na ọṅụṅụ?”
34
Jisọs zara ha sị, “Ọ bụghị ezi ihe na ndị a kpọrọ oriri nꞌebe a na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-ebu ọnụ mgbe ha na di nwanyị nọ.
35
Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.”
36
Mgbe ahụ Jisọs tụụrụ ha ilu sị, “O nweghị onye na-adọkata akwa ọhụrụ jiri ya dụchie akwa ochie. Ọ bụrụ na o mee nke a, ọ ga-adọwa akwa ọhụrụ ahụ, ma mpempe akwa ọhụrụ ahụ ọ dọkatara, na akwa ochie ahụ agaghị adakọta.
37
Nꞌụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị etinye mmanya ọhụrụ dị ike nꞌime karama akpụkpọ ochie. Nꞌihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa mgbe karama ahụ gbawara.
38
Ma ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ, ichebe ha abụọ.
39
O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nꞌihi na nꞌuche onye dị otu a, mmanya ochie ahụ ka nke ọhụrụ mma.”
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24