bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 7
Luke 7
Igbo 1988
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 8 →
1
Mgbe Jisọs gwasịrị ndị mmadụ ihe ndị a, ọ banyere obodo Kapanọm.
2
Na Kapanọm, ọ dị otu ọchịagha ndị Rom nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nꞌanya. Ohu a nọ nꞌọrịa, nꞌọnụ ọnwụ.
3
Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na Jisọs abịarutela Kapanọm, o zigara ụfọdụ nꞌime ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya Jisọs ka ọ bịa gwọọ ohu ya a.
4
Ndị okenye ndị Juu ahụ bịara rịọ Jisọs sị ya, “Nwoke a kwesịrị ka i nyere ya aka,
5
nꞌihi na ọ hụrụ ndị Juu nile nꞌanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.”
6
Jisọs sooro ndị okenye ahụ bido ịga nꞌụlọ ọchịagha ahụ. Ma mgbe ha nọ nso nꞌụlọ ya, ha zutere ndị ọchịagha ahụ zitere, ndị gwara Jisọs okwu sị, “Onyeisi anyị ziri anyị ka anyị bịa zie gị ka ị hapụ inye onwe gị nsogbu ịbata nꞌụlọ ya nꞌihi na ya etorughị onye ị ga-abata nꞌụlọ ya.
7
Ọ sị anyị ziekwa gị na ya echeghị na ya toruru ịpụta ịbịa izute gị. Ya mere, ọ sị anyị rịọ gị ka ị nọdụ nꞌebe a nye iwu nke ga-eme ka ahụ dị ohu ya mma.
8
Ọ sịkwa anyị zie gị na ya onwe ya bụ onye nọ nꞌokpuru ndị dị ukwuu karịa ya, ndị na-enye ya iwu ihe o kwesịrị ime nke ọ na-emekwa. Otu a kwa, ya onwe ya nwekwara ndị nọ nꞌokpuru ya ndị ọ na-ezi ozi ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ sị otu onye gaa ọ na-agakwa, ọ sịkwa onye ọzọ bịa, ọ na-abịa. Ọ bụrụkwa na ọ sị odibo ya mee ihe a, ọ na-eme ya.”
9
Mgbe Jisọs nụrụ ozi ọchịagha ahụ ziri ka e zie ya, o juru ya anya nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ tụgharịrị lee ndị mmadụ na-eso ya anya sị ha, “Nꞌezie, o nwebeghị oge m hụrụ onye nwere okwukwe dị ka ọchịagha a si nwee okwukwe. Nꞌezie ahụbeghị m ụdị okwukwe a nꞌala Izirel nile.”
10
Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nꞌụlọ nna ha ukwu, ha chọpụtara na ọrịa na-enye odibo ọchịagha ahụ nsogbu alaala.
11
Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, Jisọs gara nꞌobodo a na-akpọ Neen. Ọtụtụ nꞌime ndị na-eso ya na ọtụtụ igwe mmadụ ọzọ so ya gaa.
12
Mgbe Jisọs na-abịaru nso nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ, ọ hụrụ ndị mmadụ ka ha bu igbe ozu nke ha na-aga ili. Nwoke e tinyere nꞌigbe ahụ bụ nanị nwa nke nne ya mụtara. Di nwanyị a anwụọkwala.
13
Mgbe Jisọs hụrụ nwanyị a ka ọ na-akwa akwa, o nwere ọmiko nꞌahụ ya, jekwuru ya, gwa ya okwu sị, “Nne, akwakwala akwa ọzọ.”
14
Mgbe ahụ Jisọs gara nso metụ igbe ozu ahụ aka. Ndị bu ya kwụsịrị. Jisọs gwara nwoke ahụ nwụrụ anwụ okwu nꞌoke olu sị, “Nwokorọbịa, asị m gị si nꞌọnwụ bilie!”
15
Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu. Jisọs kpọnyere ya nne ya.
16
Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe a, ụjọ dị ukwuu tụrụ ha. Ha bidokwara ito Chineke na-asị, “Chineke abịala inyere ndị ya aka! Ọ kpọlitela onye amụma dị ukwuu!”
17
A kọrọ akụkọ ọrụ ebube a Jisọs rụrụ nꞌakụkụ Judia nile.
18
Ndị na-eso ụzọ Jọn omee baptizim bịara kọọrọ Jọn ihe Jisọs na-eme. Mgbe ahụ Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ha
19
zie ha ka ha jekwuru Jisọs jụọ ya ajụjụ sị: “Ọ̀ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya? Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?”
20
Mgbe ndị ozi Jọn bịakwutere Jisọs, ha ziri ozi e ziri ha sị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị bịa jụọ gị ma ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ya, ka anyị ga-ele anya maka ọbịbịa onye ọzọ?”
21
Mgbe ahụ, ndị ozi ahụ Jọn zitere nọ nꞌebe ahụ Jisọs nọ hụ ka Jisọs siri gwọọ ọtụtụ ndị ọrịa, hụkwa ka o si chụpụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ. Ha hụkwara ka o si mee ka ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ.
22
Emesịa Jisọs gwara ha sị, “Laghachinụ azụ kọọrọ Jọn ihe unu ji anya unu hụrụ na ihe unu ji ntị unu nụrụ. Kọọrọnụ ya na a na-eme ka ndị kpuru isi hụ ụzọ, na ndị ngwụrọ na-agakwa ije, na a na-emekwa ka ndị ekpenta dị ọcha, na ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, na a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie, na a na-ekwusakwara ndị ogbenye ozi ọma.
23
Gwakwanụ Jọn na ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke na-adịghị enwe obi abụọ banyere m.”
24
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn lawara, Jisọs bidoro ịgwa ndị mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Mgbe unu gara nꞌọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya ịhụ? Ọ̀ bụ ihu nwoke dị ka ahịhịa nke ikuku na-ebugharị?
25
Gịnị ka unu lere anya ịhụ? Ọ̀ bụ nwoke yi uwe mara mma? Lee na ndị na-eyi uwe mara mma nọ nꞌobi eze.
26
Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ onye amụma? Nꞌezie unu hụrụ onye karịrị onye amụma.
27
Nꞌihi na Jọn bụ nwoke ahụ e dere ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Lee ana m ezite onye ozi m nke ga-ebu ụzọ bịa ịkwado ihe nile tupuu ị bịa.’
28
Ka m gwa unu eziokwu, nꞌime ndị nile nwanyị mụrụ e nwebeghị onye amụma ọ bụla dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.
29
“Ndị Juu nile nụrụ okwu Jọn, na ndị ọnaụtụ gere ya ntị, kwenyere na ihe Chineke chọrọ ziri ezi. Nꞌihi ya, ha nyere Jọn onwe ha ka o mee ha baptizim.
30
Ee, mmadụ nile nabatara okwu Jọn nye onwe ha, kama ọ bụ nanị ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ịnabata okwu ya. Ha jụkwara ịnabata nzube ọma Chineke na-ezube banyere ha, mgbe ha jụrụ na Jọn ga-eme ha baptizim.
31
“Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nꞌọgbọ a? Gịnị ka m ga-asị na ha yiri?
32
Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nꞌama na-egwu egwu, ndị na-akpọ ibe ha na-asị, ‘Anyị na-afụrụ unu opi ma unu adịghị ete egwu, anyị na-abụrụ unu abụ ili ozu ma unu adịghị akwa akwa.’
33
Mgbe Jọn bịakwutere unu o soghị unu rie ihe, o sokwaghị unu ṅụọ mmanya, ma gịni ka unu kwuru banyere ya? Unu sị na ọ bụ onye isi mebiri, onye ara.
34
Ma ugbu a Nwa nke mmadụ abịala soro unu na-eri ma na-aṅụkwa, ma gịnị ka unu na-ekwu banyere m? ‘Lee onye oke nri na onye aṅụrụma mmanya abịala, enyị ndị ọnaụtụ na ndị mmehie!’
35
Otu ọ dị, ọrụ a rụpụtara na-egosi na ụzọ ọ bụla Chineke si arụ ọrụ ya dị mma.”
36
Otu onye nꞌime ndị Farisii kpọrọ Jisọs ka ọ bịa rie ihe nꞌụlọ ya. Jisọs gara, soro ya nọdụ ala iri nri.
37
Mgbe Jisọs nọ nꞌụlọ ahụ, otu nwanyị akwụla bi nꞌobodo ahụ onye maara na Jisọs nọ nꞌụlọ onye Farisii ahụ, jiri otu karama mmanụ otite na-esi ezigbo isi bata nꞌụlọ ahụ jee nꞌazụ Jisọs, gbuo ikpere nꞌebe ụkwụ ya dị. Anya mmiri sikwa nꞌanya ya na-awụpụta na-awụkwasị Jisọs nꞌụkwụ. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri a dị nꞌụkwụ Jisọs, werekwa ọnụ ya na-esutu Jisọs nꞌụkwụ. Emesịa ọ wụrụ mmanụ ahụ nile nꞌụkwụ Jisọs.
39
Mgbe nwoke onye Farisii ahụ Jisọs nọ nꞌụlọ ya na-eri nri hụrụ ihe nwanyị a na-eme, o kwuru nꞌobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma nꞌezie, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, ọ gaara amata na nwanyị a bụ akwụla.”
40
Ma Jisọs gwara onye Farisii ahụ okwu sị, “Saimọn, ọ dị ihe m chọrọ ịgwa gị.” Saimọn zara ya sị, “Kwuo ihe dị gị nꞌobi, ana m ege ntị.”
41
Jisọs gwara ya sị, “E nwere otu nwoke ọrụ ya bụ ibinye ndị mmadụ ego. Otu ụbọchị nwoke a gbazinyere mmadụ abụọ ego. Ọ gbazinyere onye nke mbụ iri naịra ise, gbazinye onye nke ọzọ naịra iri.
42
Mgbe oge ruru ka ndị a kwụghachi ụgwọ ha ji, ha enweghị ego ha ga-eji kwụghachi. Nwoke ahụ gbazinyere ha ego kpọrọ ha gwa ha na ya achọkwaghị ka ha kwụọ ya ụgwọ ahụ, na ọ gbagharala ha ụgwọ ha ji ya. Ugbu a, gwa m, onye nꞌime mmadụ abụọ a ka i che ga-ahụ nwoke ahụ nꞌanya karịa ibe ya?”
43
Saimọn onye Farisii ahụ zara sị ya, “Nꞌuche m, ọ bụ onye ji ụgwọ iri naịra ise.” Jisọs zara sị ya, “Ị zara nke ọma.”
44
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị lee nwanyị ahụ anya meghee ọnụ gwa Saimọn okwu sị, “Saimọn, ị hụrụ nwanyị a? Mgbe m batara nꞌụlọ gị i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
45
Mgbe m batara nꞌụlọ gị, i jighị isutu ọnụ kelee m, ma kemgbe m batara nꞌụlọ a, nwanyị a ezubeghị ike iji ọnụ ya na-esutu ụkwụ m.
46
Mgbe m batara nꞌụlọ gị, ị wụkwasịghị m mmanụ ọ bụla nꞌisi, ma lee na nwanyị a eteela m mmanụ nꞌụkwụ.
47
Nꞌihi ihe ndị a nwanyị a mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya nile o mehiere, nꞌihi na ọ hụrụ m nꞌanya nke ukwuu. Ma nwoke ahụ hụrụ m nꞌanya nke nta, ka a ga-agbaghara nanị nke nta.”
48
Mgbe ahụ Jisọs gwara nwanyị ahụ okwu sị, “A gbagharala gị mmehie gị nile.”
49
Ndị ọzọ soro Jisọs nọdụ na-eri nri ahụ bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Gịnị ka nwoke a na-eche na ọ bụ? Ịgbaghara mmadụ mmehie ha!”
50
Ma Jisọs gwara nwanyị ahụ sị, “Ọ bụ okwukwe i nwere nꞌime m zọpụtara gị.”
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24