bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Luke 16
Luke 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 17 →
1
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu odibo na-ejere ya ozi. Emesịa, ndị mmadụ bidoro ịkọsara ọgaranya ahụ na nwa odibo ya na-emebisi ego ya.
2
“Otu ụbọchị, nwoke a kpọrọ odibo ya sị, ‘Gịnị bụ akụkọ ndị a m na-anụ banyere gị? Achọrọ m ka ị bịa guziere m otu i si na-elekọta ego m nꞌihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ odibo m ọzọ.’
3
“Mgbe odibo a nụrụ ihe nna ya ukwu kwuru, o chere nꞌobi ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m nꞌọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m jegharịa ịrịọ arịrịọ.
4
Ahaaa! Amatala m ihe m ga-eme, nke ga-enyere m aka mgbe nna m ukwu chụpụrụ m. Mgbe ahụ aga m enweta ndị ga-anabata m nꞌụlọ ha.’
5
“Odibo ahụ ziri ozi kpọọ ndị nile ji nna ya ukwu ụgwọ ka ha bịakwute ya. Mgbe onye nke mbụ bịara, ọ jụrụ ya sị, ‘Gịnị bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’
6
Nwoke ahụ zara ya sị, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ ka m ji ụgwọ ya.’ Odibo ahụ gwara ya sị, ‘Ngwa, were akwụkwọ ebe i dere na ọ bụ puku karama mmanụ ka i ji ụgwọ ya. Nọdụ ala degharịa ya, dee na ọ bụ narị karama ise.’ Mgbe nwoke ahụ desịrị pụọ,
7
“Odibo ahụ kpọrọ onye nke abụọ jụọ ya sị, ‘Gịnị bụ ụgwọ i ji?’ Nwoke ahụ zara ya sị, ‘Ọ bụ narị akpa ọka.’ Odibo ahụ zara sị ya, ‘Ngwa, lee akwụkwọ ebe i dere na ọ bụ narị akpa ọka ka i ji ụgwọ ya, degharịa ya, dee na ihe i ji ụgwọ ya bụ iri akpa ọka asatọ.’
8
“Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe odibo ya mere, o toro ya nꞌihi na ihe o mere jupụtara nꞌamamihe. Ọ bụkwa eziokwu na ndị ụwa nwere amamihe idozi ihe ọ bụla nꞌụzọ o ga-esi baara ha uru, karịa ndị ahụ bụ ụmụ nke ìhè.
9
Ya mere ka m gwa unu, jirinụ akụ na ụba unu mepụtara onwe unu enyi, nke ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịkwaghị akụ unu nwere, a ga-anabata unu nꞌụlọ ebighị ebi ahụ.
10
Onye ọ bụla jiziri ihe dị ntakịrị e nyere ya ga-enwe ike jizie ihe ukwu ọ bụla a ga-etinye ya nꞌaka. Ma onye ahụ a na-enweghị ike ịtụkwasị obi nꞌihe dịkarịsịrị nta ga-abụkwa onye a na-enweghị ike ịtụkwasị obi ijizi ihe buru ibu.
11
Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike tụkwasị gị obi ilekọtazi akụ na ụba nke ụwa a, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi nye gị ezi akụ nke eluigwe?
12
Ọ bụrụkwa na o nweghị onye na-atụkwasị gị obi ijizi akụ onye ọzọ, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi ijizi ihe nke bụ nke gị?
13
“Otu onye apụghị ịbụ odibo mmadụ abụọ. Ọ ghaghị ịkpọ otu asị hụ nke ọzọ nꞌanya, ma ọ bụkwanụ ọ ga-eme nanị ihe otu nꞌime ha chọrọ leda onye nke ọzọ anya. Nꞌụzọ dị otu a kwa mmadụ enweghị ike ịhụ Chineke na ego nꞌanya otu mgbe ahụ.”
14
Ndị Farisii hụrụ ego nꞌanya, ndị nụrụ ihe ndị a Jisọs kwuru, weere Jisọs mee ihe ọchị.
15
Ma Jisọs gwara ha sị, “Nꞌihu ndị mmadụ, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị dị nsọ na ndị bụ ndị ezi omume. Ma Chineke maara obi unu. Nꞌihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị mkpa abaghị uru nꞌihu Chineke.
16
Tupuu Jọn abịa, ndị mmadụ na-agụ ihe Mosisi na ndị amụma dere. Ma kemgbe Jọn bịasịrị, a na-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke, mmadụ nile na-ejikwa ike na-abanye nꞌime alaeze a.
17
Ma nke a egosighị na ihe Mosisi dere abakwaghị uru. Nꞌezie, ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịhapụ ịdịkwa karịa na akwụkwọ iwu ahụ ga-abụ ihe na-abaghị uru.
18
“Onye ọ bụla gbara nwụnye ya achọghị m mesịa lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụla kwa lụrụ nwanyị ahụ di ya jụrụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.
19
“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe mara mma, na-erikwa nri dị mma ụbọchị nile.
20
Nꞌọnụ ụzọ e si abanye nꞌụlọ onye ọgaranya a, otu nwoke ahụ ya jupụtara nꞌọnya na-edina nꞌebe ahụ oge nile! Aha nwoke a bụ Lazarọs.
21
Ọ gụsịrị Lazarọs agụụ ike iri ọ bụladị ibiribe nri si na tebulu onye ọgaranya ahụ daa nꞌala, ma o nweghị onye nyere ya. Nꞌezie, ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nꞌahụ
22
Otu ụbọchị Lazarọs nwụrụ. Ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nꞌebe Eberaham nọ. Nꞌikpeazụ, onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.
23
Nꞌọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nꞌoke mgbu, ọ hụrụ Eberaham ka ọ nọ nꞌebe dị anya. Ọ hụkwara Lazarọs ka ọ nọ nꞌakụkụ Eberaham.
24
“Onye ọgaranya ahụ kpọkuru Eberaham sị ya, ‘Nna m Eberaham, meere m ebere nꞌihi na anọ m nꞌoke mgbu nꞌebe a, biko zienụ Lazarọs ka o denye mkpịsị aka ntakịrị ya na mmiri bịa metụ ya nꞌire m ka akpịrị na-akpọ m nkụ dajụọ.’
25
“Ma Eberaham zara ya sị, ‘Nwa m nwoke, chetakwa oge ị nọ nꞌụwa? Nꞌoge ahụ i nwetara ihe ọma nile. Chetakwa na Lazarọs natara nanị ihe ọjọọ nꞌoge ahụ. Ugbu a Chineke na-akasi Lazarọs obi ma ị nọkwa nꞌoke ihe mgbu.
26
A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nꞌihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike isite nꞌebe a bịa nꞌebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nꞌebe unu nọ bịa nꞌebe a.’
27
“Onye ọgaranya ahụ gwara Eberaham sị ya, ‘Biko, arịọ m gị, nna m, zienụ ozi zigara ndị bi nꞌụlọ nna m nꞌụwa.
28
Nꞌihi na enwere m ụmụnne ise. Ka ndị ị ga-eziga gaa dọọ ha aka na ntị ka ha bie ụdị ndụ nke na-agaghị eme ka ha bịa nꞌebe ahụ ụfụ a m nọ.’
29
“Ma Eberaham zara ya sị, ‘Ụmụnne gị nwere akwụkwọ nsọ ebe Mosisi na ndị amụma ziri ụzọ e si eme ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ha gụọ ya, ma meekwa ihe ha gụtara ọ chọrọ ka ha mee.’
30
Ma onye ọgaranya ahụ zara sị, ‘Nna m Eberaham, nke ahụ agaghị ezu! Ọ dị mkpa na mmadụ ga-esite na ndị nwụrụ anwụ bilie gaa gwa ha ka ha chegharịa.’
31
“Ma Eberaham zara ya sị, ‘Ọ bụrụ na ha agaghị eme ihe ha ga-agụta nꞌakwụkwọ Mosisi na ndị amụma dere, echeghị m na ha ga-echegharị ma mmadụ site nꞌọnwụ bilie bịa gwa ha okwu.’ ”
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24