bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 10
John 10
Igbo 1988
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 11 →
1
“Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla na-achọghị isite nꞌụzọ banye nꞌọgba a na-edebe atụrụ, ma chọọ ka o site na mgbidi ụlọ ahụ wufee bụ onye ohi.
2
Onye ọzụzụ atụrụ naesite nꞌụzọ abanye.
3
Onye nche naemeghere ya ụzọ. Ụmụ atụrụ ahụ naanụkwa olu ya. Ọ na-akpọ ndị nke ya, duru ha pụọ.
4
Mgbe ọ kpọpụtara atụrụ nke ya, ọ na-aga nꞌihu ha. Ha na-esokwa ya nꞌazụ nꞌihi na ha maara olu ya.
5
Ha agaghị eso onye ha na-amaghị olu ya. Ha ga-agbapụ site nꞌebe onye ahụ nọ. Nꞌihi na ha amaghị olu ya.”
6
Jisọs siri otu a tụọrọ ha ilu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha.
7
Ma Jisọs kọwaara ha sị, “Mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.
8
Ndị nile bịara tupuu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị.
9
Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọ bụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-abata pụọkwa ịchọ nri.
10
Onye ohi na-abịa ka o bibie. Ma mụ onwe m na-abịa inye ndụ nke na-ejubiga oke.
11
“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Onye ọzụzụ atụrụ kwadoro ịtọgbọ ndụ ya nꞌihi atụrụ ya.
12
Onye e goro ọrụ adịghị elezi atụrụ anya. Ọ hụ nkịta ọhịa ka ọ na-abịa, ọ na-agbapụ ọsọ, hapụ atụrụ ahụ ka nkịta ọhịa buru ha, ma ọ bụ chụsasịa ha.
13
Onye e goro ọrụ na-agbapụ. Ọ dịghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ahụ.
14
“Ma mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Amaara m atụrụ nke m. Atụrụ nke m makwaara m,
15
dị ka Nna m siri mata m, na dị ka mụ onwe m si mara Nna m. Akwadokwara m ịtọgbọ ndụ m nꞌihi atụrụ ahụ.
16
Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nꞌọgba a. Aga m akpọbatakwa ha ka m nwee nanị otu ọgba. Ha ga-anụ olu m nꞌihi na otu onye ọzụzụ atụrụ nanị ga-adị.
17
“Nna m hụrụ m nꞌanya nꞌihi na akwadoro m ịtọgbọ ndụ m. Ana m atọgbọ ndụ m ka m weghachikwa ya.
18
O nweghị onye ọ bụla pụrụ ịnara m ndụ m. Ọ bụ m kpebiri nꞌonwe m ịtọgbọ ndụ m. Enwere m ike ịtọgbọ ya, nweekwa ike iweghachi ya. Ọ bụ Nna m nyere m ike a.”
19
Nkewa batara nꞌetiti ndị Juu mgbe ha nụrụ ihe ndị a Jisọs kwuru.
20
Ọtụtụ nꞌime ọgbakọ ahụ sịrị, “Mmụọ ọjọọ na-achị achị nꞌobi ya. Ọ bụ onye isi mebiri. Ọ baghị uru ige ya ntị?”
21
Ma ndị ọzọ kwuru sị, “Ọ dịghị ekwu okwu dị ka onye mmụọ ọjọọ na-achị. Mmụọ ọjọọ enweghị ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee.”
22
Ihe ndị a nile mere na Jerusalem. Ha mere nꞌoge mmemme icheta owuwu ụlọ nsọ ukwu Chineke. Ọ bụkwa nꞌọnwa nke atọ nꞌafọ ka ha mere.
23
Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. O jegharịrị nꞌakụkụ ụlọ nsọ ahụ a na-akpọ “Mgbe Ụlọ Solomọn.”
24
Nꞌebe ahụ ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị gaedebe anyị nꞌọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Onye nzọpụta ahụ, gwaghee anyị ọnụ!”
25
Jisọs sịrị ha, “Agwara m unu, ma unu achọghị ikwere nꞌihe m kwuru. Ọrụ m na-arụ nꞌaha Nna m na-agba ama banyere m.
26
Ma unu ekwenyeghị, nꞌihi na unu abụghị atụrụ m.
27
Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
28
Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nꞌiyi. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nꞌaka m.
29
Ọ bụ Nna m nyere m ha. Ọ dị ukwuu karịa mmadụ nile. Mmadụ ọ bụla enweghị ike ịpụnarị ha site nꞌaka Nna m.
30
Mụ na Nna bụ otu.”
31
Mgbe ahụ ndị Juu tụtụlitere nkume ọzọ ịtụ ya.
32
Ma Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Arụrụ m ọrụ ebube dị iche iche site nꞌaka Nna m inyere ọtụtụ mmadụ aka. Ọ̀ bụ nꞌihi ọrụ ebube nke ole ka unu ji chọọ ịtụ m nkume?”
33
Ndị Juu zara ya sị, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nꞌihi ọrụ ọma ị rụrụ. Kama anyị chọrọ ịtụ gị nkume nꞌihi na gị, bụ mmadụ efu, na-eme onwe gị dị ka Chineke.”
34
Jisọs sịrị ha, “Ọ̀ bụ na edeghị ya nꞌakwụkwọ iwu unu na a kpọrọ ndị mmadụ chi?
35
Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị natara ozi Chineke chi, ma apụkwaghị iwezuga akwụkwọ nsọ,
36
unu si aṅaa agwa m, mụ, onye Chineke doro nsọ zite nꞌụwa, na m adịghị asọpụrụ Chineke nꞌokwu m nꞌihi na m kwuru na abụ m Ọkpwara Chineke?
37
Ọ bụrụ na arụghị m ọrụ Chineke, unu ekwela na m.
38
Ma ọ bụrụ na m na-arụ ọrụ Chineke, nabatanụ ọrụ m dị ka ama zuru oke, ma unu jụ ịnara m. Ọ bụrụ na unu anabata ọrụ m, unu ga-amata, kwerekwa na Nna m nọ nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime Nna m.”
39
Ọzọ kwa, ha gbalịrị ijide ya, ma ọ pụnarịrị ha.
40
Ọ gara nꞌakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan. Ebe ahụ ka ọ nọdụrụ. Ebe Jọn bidoro ime baptizim na mbụ.
41
Ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya nꞌebe ahụ. Ha sịrị, “Jọn arụghị ọrụ ebube ọ bụla, ma ihe nile Jọn kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu.”
42
Ọtụtụ mmadụ kweere na ya nꞌebe ahụ.
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21