bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 3
John 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 4 →
1
O nwere otu onyeisi ndị Juu, onye so nꞌotu ndị Farisii, aha ya bụ Nikọdimọs.
2
Nwoke a bịakwutere Jisọs nꞌabalị, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere nꞌebe Chineke nọ bịa. Nꞌihi na mmadụ ọ bụla apụghị ịrụ ụdị ọrụ ịtụnanya ị na-arụ ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”
3
Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”
4
Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?”
5
Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.
6
Dị ka mmadụ nwere ike mụọ mmadụ ibe ya, otu a kwa, ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ pụrụ ịmụ mmadụ nꞌime Mmụọ Nsọ.
7
Ya ejule gị anya na m sịrị, ‘A ghaghị ịmụ gị ọzọ.’
8
Dị ka ifufe si efegharị nꞌebe ọ bụla ọ chọrọ, ị na-anụkwa ka ọ na-eme mkpọtụ, ma ị mataghị ebe o si bịa ma ọ bụ ebe ọ na-aga, nꞌụzọ dị otu a, i nweghị ike ịmata otu Mmụọ Nsọ si amụ mmadụ ọzọ.”
9
Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mezuo?”
10
Jisọs sịrị ya, “Ị̀ bụ onye ozizi nke mmadụ nile na-asọpụrụ nꞌIzirel ma ị maghị ihe ndị a?
11
Achọrọ m ka ị mata nke ọma na anyị na-ekwu ihe anyị maara na-agbakwa ama banyere ihe anya anyị hụrụ. Ma unu adịghị anabata ama anyị.
12
Ọ bụrụ na unu ekwereghị nꞌihe ndị a na-eme nꞌetiti mmadụ nꞌime ụwa, unu ga-esi aṅaa kwere ma ọ bụrụ na m agwa unu ihe banyere ihe dị nꞌeluigwe?
13
Ọ gwụchaala Onye nzọpụta ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Ọ bụkwa mụ onwe m bụ ya. Ọ bụkwa m ga-alaghachi azụ nꞌeluigwe.
14
“Dị ka Mosisi siri welie agwọ ahụ elu nꞌelu osisi ahụ nꞌọzara, ime ka ndị lekwasịrị ya anya dịkwa ndụ ọzọ, otu a ka a ga-esi weliekwa Nwa nke mmadụ elu.
15
Ka onye ọ bụla kweere na m ghara ịnwụ, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
17
Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.
18
“Ikpe agaghị amakwa ndị nile tụkwasịrị Ọkpara Chineke obi kama ndị nile jụrụ ya, abụrụla rị ndị a mara ikpe, nꞌihi na e kpeela ha ikpe ugbu a. Ha bụkwa ndị ikpe Chineke mara nꞌihi na ha ekwenyeghị nꞌỌkpara Chineke.
19
E mere ka ikpe Chineke ma ha, nꞌihi na ha hụrụ ọchịchịrị nꞌanya karịa ìhè nke si nꞌeluigwe bịa. Nꞌihi na ha bụkwa ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche.
20
Ndị mmehie nile na-agba ọsọ site nꞌìhè ahụ. Ha achọghị ịbịakwute ìhè ahụ nꞌihi na mmehie ha ga-apụta ìhè.
21
Ma onye ọ bụla na-eme eziokwu ahụ na-eji oke ọṅụ bịakwute ìhè ahụ. Ọ na-atọkwa ya ụtọ ka mmadụ nile hụ ọrụ ya, nꞌihi na ọ na-arụ ọrụ ndị a site nꞌike nke Chineke.”
22
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌime obodo Judia. Ebe ahụ ka ha nọdụrụ abalị ole na ole meekwa ọtụtụ mmadụ baptizim.
23
Otu aka ahụ, Jọn omee baptizim nọkwa nꞌọnụ mmiri a na-akpọ Aenọn nke dị nso nꞌobodo Salim, na-emekwa ọtụtụ mmadụ baptizim, nꞌihi na mmiri buru ibu dị nꞌebe ahụ. Ọtụtụ mmadụ na-abịakwutekwa ya ka o mee ha baptizim.
24
E tinyebeghị Jọn nꞌụlọ mkpọrọ mgbe ihe ndị a na-eme.
25
Nꞌoge a, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jọn na ụfọdụ ndị Juu bidoro ịrụrịta ụka banyere ime mmadụ ka ọ dị ọcha.
26
Nꞌihi nke a ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, lee onye ahụ i gosiri ndị mmadụ nꞌofe nke ọzọ nke osimiri Jọdan, onye ahụ ị gbara ama banyere, ọ nọ ugbu a na-eme ọtụtụ mmadụ baptizim. Igwe mmadụ na-esokwa ya ka o mee ha baptizim.”
27
Ma Jọn kọwaara ha sị, “Nanị Chineke na-esi nꞌeluigwe kenye onye ọ bụla ọrụ nke ọ na-aghaghị ịrụ.
28
Unu nile ga-agbara m ama na m gwara unu na mbụ sị, ‘Abụghị m Onye nzọpụta ahụ.’ Ọrụ m bụ nanị ikwadebere ya ụzọ, na ime ka mmadụ nile mara ya.
29
Nwanyị a na-alụ alụ, bụ akụ di ya (ya bụ onye na-alụ ya). Nwanyị ahụ na-alakwurukwa nwoke ahụ na-alụ ya. Ndị nile bụ enyi nwoke ahụ naesoro ya ṅụrịa ọṅụ.
30
Ya mere, nwoke ahụ kwesịrị ịdị elu nke ukwuu mgbe mụ onwe m na-adị ala.
31
“Onye ahụ si nꞌelu bịa dị ukwuu karịa onye ọ bụla. Onye a mụrụ nꞌụwa bụ mmadụ efu, okwu ya nile bụkwa okwu gbasara ihe dị nꞌụwa. Ma Onye ahụ si nꞌeluigwe bịa dị elu nke ukwuu karịa onye ọ bụla.
32
Ọ na-akọwakwa ihe nile ọ hụrụ na nke ọ nụrụ. Ma o nweghị onye na-anabata ihe ọ na-ekwu.
33
Ma ndị nile na-anabata ozi ọma ya aghaghị ịchọpụta na Chineke bụ onye eziokwu.
34
Nꞌihi na onye ọ bụla Chineke zitere na-ekwu okwu nke Chineke. Nꞌihi na onye ahụ naejupụta na Mmụọ nsọ Chineke.
35
Chineke Nna hụkwara Ọkpara ya nꞌanya. O werekwala ike nile tinye ya nꞌaka.
36
Ya mere onye ọ bụla kweere nꞌỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi. Ma onye ọ bụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị enwe ndụ ebighị ebi, kama iwe Chineke na-adịgide ya nꞌahụ.”
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21