bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 7
John 7
Igbo 1988
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 8 →
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs jegharịrị site nꞌotu obodo dị na Galili gaa nꞌobodo ọzọ. Ọ chọkwaghị ijegharị na Judia, nꞌihi na ndị Juu na-achọ igbu ya nꞌebe ahụ.
2
Ma oge ahụ mmemme ibi nꞌụlọ e ji akpụkpọ anụ mee, nke e ji echeta mwagharịrị nꞌọzara ndị Juu dị nso.
3
Ụmụnne Jisọs bịakwutere ya gwa ya sị, “O ruola nnọọ oge ị ga-eji gaa Judia. Gaa ugbu a ka ndị na-eso ụzọ gị hụ ọrụ ị na-arụ.
4
“Ndị mmadụ enweghị ike ịmata gị ma ị nọdụ na-arụ ọrụ gị na nzuzo. Ebe ọ bụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ndị ụwa onwe gị.”
5
Ọ bụladị ụmụnne ya ekwereghị na Jisọs.
6
Jisọs zara sị ha, “Oge m ga-egosi ụwa onwe m erubeghị. Ọ dịrị unu mfe ịga mgbe ọ bụla, nꞌihi na a ga-anabata unu.
7
Ndị ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, dị ka ha si kpọọ m asị. Ndị ụwa na-akpọ m asị nꞌihi na m na-atụ ha mmehie ha nꞌanya.
8
Gaanụ na mmemme ahụ. Mgbe oge ruru aga m abịa. Ugbu a abụghị oge dịrị m mma ịga nꞌebe ahụ.”
9
Mgbe Jisọs gwasịrị ha ihe ndị a, ọ nọgidere na Galili.
10
Ma mgbe ụmụnne ya pụrụ, o sochiri ha azụ. Ma ọ gara nꞌebe ahụ na nzuzo.
11
Na mmemme ahụ, isi ndị Juu nọ na-ele anya ya. Ha na-ajụgharị ajụjụ na-asị, “Olee ebe ọ nọ?”
12
Igwe ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ nọkwa na-agbarịta izu banyere ya. Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Mbaa, ọ bụghị ezi mmadụ. Ọ na-eduhie ndị mmadụ.”
13
Ma o nweghị onye ọ bụla kwupụtara okwu banyere ya. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị isi ndị Juu.
14
Ma nꞌetiti mmemme ahụ, mgbe ndị mmadụ na-atụghị anya ya, Jisọs gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, nọọ nꞌebe ahụ bido izi ihe.
15
Ihe ọ na-ezi juru ndị Juu anya, nke mere ka ha jụọ sị, “Olee otu nwoke a na-amụghị akwụkwọ siri mara ihe?”
16
Jisọs zara ha sị, “Ihe m na-ezi abụghị ihe m tụpụtara nꞌuche m. Kama ana m ezi ihe Chineke, onye zitere m, chọrọ.
17
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie ime uche Chineke, ọ gaamata ma ozizi a ọ bụ nke m ma ọ bụkwanụ nke si nꞌebe Chineke nọ pụta.
18
Onye ọ bụla na-ekwu ihe si ya nꞌuche pụta na-achọ ka ndị mmadụ too ya. Ma onye ahụ na-achọ otuto onye zitere ya, na-ekwu eziokwu. Ihe ọjọọ ọ bụla adịkwaghị nꞌime ya.
19
Mosisi nyere unu iwu, ma ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji chọọ igbu m nꞌihi na m edebeghị iwu unu?”
20
Ndị mmadụ zara sị ya, “Ọ gaabụkwanụ na isi mebiri gị. Ònye chọrọ igbu gị?”
21
Jisọs gwara ha sị, “Arụrụ m nanị otu ọrụ dị ebube, ọrụ ahụ tụkwara unu nꞌanya.
22
Mosisi nyere unu iwu banyere ibi mmadụ ugwu. (Iwu a ebidoghị nꞌaka Mosisi, o bidororị nꞌaka nna anyị ochie ha). Ma unu na-ebi mmadụ ugwu nꞌụbọchị izuike.
23
Nꞌụbọchị izuike unu na-ebi nwa ọhụrụ ugwu ka a hapụ imebi iwu Mosisi. Gịnị mere unu ji ewe iwe nꞌihi na m mere ka ahụ dị mmadụ mma nꞌụbọchị izuike?
24
Kpeenụ ikpe ziri ezi ụnu ekpela ikpe site nanị nꞌihe anya naahụ.”
25
Ụfọdụ nꞌime ndị bi na Jerusalem kwuru okwu sị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?
26
Lee! Ọ na-ekwusi okwu ike ma o nweghị ihe ha na-agwa ya! Ma eleghị anya ndị isi achọpụtala na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ ga-abịa.
27
Ma anyị maara ebe a mụrụ nwoke a. Mgbe Onye nzọpụta ahụ ga-abịa mmadụ ọ bụla agaghị ama ebe o siri pụta.”
28
Mgbe ahụ Jisọs tiri mkpu sị, “Nꞌezie unu maara m. Unu maara ebe a nọ mụọ m. Ma ọ dị onye zitere m. Onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Ma unu amaghị ya.
29
Amaara m ya. Ọbụkwa ebe ọ nọ ka m si bịa. Ọ bụ ya zitekwara m.”
30
Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ biliri chọọ ijide ya. Ma mmadụ ọ bụla emetụghị ya aka nꞌihi na oge Chineke kara aka erubeghị.
31
Ma ọtụtụ mmadụ nọ nꞌebe ahụ kweere na ya. Ihe ha kwuru bụ nke a, “Mgbe Onye nzọpụta ahụ ga-abịa, ọ̀ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị nke nwoke a rụrụ?”
32
Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ndị mmadụ na-ekwu, ha na ndị isi nchụaja gbara izu, zite ndị uwe ojii ka ha jide Jisọs.
33
Ma Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Nanị nwa oge nta ka m ga-anọnyere unu. Emesịa aga m alakwuru onye zitere m.
34
Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Unu enwekwaghị ike ịbịaru ebe m gaaga.”
35
Ndị isi ndị Juu jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Ebee ka ọ na-akwado ịga? Ọ̀ bụ ijekwuru ndị Juu nọ na mba ọzọ soro ha nọdụ na-ezi ndị mba ọzọ naabụghị ndị Juu ihe?
36
Ụdị okwu dị aṅaa bụ nke a, na anyị ga-achọ ya ma anyị agaghị achọta ya? Na anyị apụghị ịbịaru ebe ọ na-aga?”
37
Nꞌụbọchị ikpeazụ bụ ụbọchị dị mkpa nꞌoge mmemme ahụ, Jisọs guzoro ọtọ tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọ bụla nkụ ya bịakwute m, bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ.
38
Ọ bụrụ na unu ekwere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, Chineke ga-eme ka isi iyi mmiri na-enye ndụ site nꞌime unu naasọpụta.”
39
(Jisọs na-ekwu okwu banyere Mmụọ Nsọ nke ndị kweere na ya ga-anata. Nꞌoge ahụ Mmụọ Nsọ abịabeghị nꞌihi na Jisọs alaghachibeghị nꞌebube ya nꞌeluigwe).
40
Mgbe ndị mmadụ nụrụ okwu a, ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nꞌezie, nwoke a bụ onye amụma ahụ.”
41
Ụfọdụ sịrị, “Nke a bụ Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa.” Ma ụfọdụ sịrị, “Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa ọ̀ ga-esi Galili pụta?
42
Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na Kraịst ga-esite nꞌagbụrụ Devidi bịa. Akwụkwọ nsọ gwakwara anyị na ọ ga-esi na Betilehem obodo Devidi pụta.”
43
Nꞌihi nke a, nkewa dị nꞌetiti igwe mmadụ ndị ahụ.
44
Ụfọdụ chọrọ ijide ya. Ma mmadụ ọ bụla emetụghị ya aka.
45
Ndị uwe ojii ahụ e zitere ijide ya laghachiri azụ. Ha lọghachiri nꞌebe ndị isi nchụaja na ndị Farisii nọ. Mgbe ndị isi ahụ jụrụ ha ihe mere ha akpụtaghị Jisọs,
46
Ha zara sị ha, “Anyị ahụbeghị nwoke kwuru okwu dị ka nwoke a si kwuo okwu taa.”
47
Ndị Farisii jụrụ ha sị, “A ghọgbuokwala unu?
48
Ò dị onyeisi ndị Juu ma ọ bụ onye Farisii unu hụrụ kweere na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ?
49
Ma igwe mmadụ ndị a amaghị akwụkwọ nsọ. Ha bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
50
Nikọdimọs, otu nꞌime ndị isi ndị Juu (nwoke ahụ bịakwutere Jisọs nꞌabalị),
51
jụrụ ndị ibe ya sị, “Ò ziri ezi nꞌiwu ịma mmadụ ikpe tupuu e kpee ya ikpe?”
52
Ha jiri oke olu jụọ Nikọdimọs ajụjụ nꞌiwe sị, “Gị onwe gị i sokwa na ndị si Galili pụta? Lee anya nꞌakwụkwọ nsọ ị ga-achọpụta na onye amụma ọ bụla esitebeghị na Galili pụta!”
53
Nzụkọ ahụ gbasara. Onye ọ bụla lara nꞌụlọ ya.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21