bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 15
John 15
Igbo 1988
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 16 →
1
“Mụ onwe m bụ ezi osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye nlekọta ọrụ ubi.
2
Ọ na-egbuda alaka ọ bụla dị nꞌime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-ewewpụ ihe nile naeme ka ọ hapụ ịmi mkpụrụ nke ọma, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ.
3
Ugbu a e meela ka unu dịrị ọcha site nꞌokwu nile m gwara unu.
4
Ọ bụrụ na unu anọgide nꞌime m, mụ onwe m kwa ga-anọgide nꞌime unu. Alaka ọ bụla apụghị ịmị mkpụrụ nꞌọnwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nꞌosisi vaịnị ahụ. Otu a, unu apụkwaghị ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na mụ onwe m anọghị nꞌime unu.
5
“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ nꞌezie. Unu onwe unu bụkwa alaka nke m. Onye ọ bụla na-anọgide nꞌime m, ma mụ onwe m kwa nꞌime ya, na-amị mkpụrụ nke ukwuu. Nꞌihi na e wezụga m, unu enweghị ike ime ihe ọ bụla.
6
Onye ọ bụla na-adịghị anọgide nꞌime m abaghị uru ọ bụla nye m. A na-atụpụkwa ya nꞌezi ka ọ kpọnwụọ, dị ka alaka osisi e gbuturu egbutu. Ọ bakwaghị uru ọzọ ma ọ bụghị ka e tinye ya nꞌọkụ, ka o ree ọkụ.
7
Ma ọ bụrụ na unu na-anọgide nꞌime m, ọ bụrụkwa na okwu m na-anọgide nꞌime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ nꞌaha m, a ga-emekwara unu ya.
8
Ọ bụrụ na unu amịa mkpụrụ, a ga-esite na mkpụrụ ahụ nye Nna m otuto. Nꞌụzọ dị otu a ka unu ga-eji bụrụ ndị na-eso ụzọ m.
9
“Dị ka Nna m si hụ m nꞌanya otu a ka m si hụkwa unu nꞌanya. Ya mere nọgidenụ nꞌime ịhụnanya m.
10
Unu ga-anọgide nꞌịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Mụ onwe m na-anọgidekwa nꞌịhụnanya nke Nna m nꞌihi na m naedebe ihe nile o nyere nꞌiwu.
11
Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m zuo oke nꞌime unu, ka ọṅụ unu zuokwa oke.
12
Nke a bụkwa iwu m na-enye unu: hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.
13
Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya.
14
Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu.
15
Malite ugbu a, agaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nꞌihi na ohu adịghị amazu ihe nile onyenwe ya na-achọ ime. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nꞌihi na ihe nile Nna m naezube ka m gwara unu.
16
“Ọ bụkwaghị unu onwe unu họpụtara m. Ọ bụ m họpụtara unu ka unu baa nꞌime ụwa mịa mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgide. Ya mere, ọ bụrụ na unu arịọọ Nna m ihe ọ bụla site nꞌaha m, Nna m ga-enye unu ihe nile unu rịọrọ.
17
Ma nke a bụ iwu m nyere unu. Hụnụ onwe unu nꞌanya.
18
Unu echegbula onwe unu ma ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị. Chetanụ na ụwa buru ụzọ kpọọ m asị tupuu ọ kpọọ unu asị.
19
A sịkwarị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nꞌanya. Ma ugbu a unu abụghị nke ụwa. Nꞌihi na mụ onwe m si nꞌime ụwa kpọpụta unu. Ọ bụkwa nꞌihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị.
20
Unu chetakwa ihe m gwara unu malite na mbụ, na ohu adịghị ukwuu karịa onyenwe ya. Nꞌihi nke a ebe ụwa kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ha agaghị erube isi nꞌokwu unu, nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌihe m ziri ha.
21
Ee, ha ga-eme unu ihe nile ndị a nꞌihi na unu bụ ndị nke m, na nꞌihi na ha amaghị Onye ahụ zitere m.
22
“Ọ bụrụ na abịaghị m nꞌụwa, ikpe agaraghị ama ha. Ma ugbu a abịala m gwa ha okwu ndị a nile. Ya mere, ha enweghị agụgọ ọ bụla.
23
Onye ọ bụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị.
24
A sị na ọrụ nile m rụrụ nꞌetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọ bụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu ha ahụzuola ọrụ ịrịba ama ndị a nile, ma ha nọgidekwara naakpọ mụ na Nna m asị.
25
Ma mmeso ndị a nile emeela ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ha akpọọla m asị, ma emeghị m ha ihe ọjọọ ọ bụla.’
26
“Ma Onye ndụmọdụ ahụ ga-abịa, Onye ahụ bụ Mmụọ eziokwu ahụ, Onye ga-esite nꞌebe Nna m nọ bịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwara unu ihe nile banyere m.
27
Ma unu onwe unu aghaghị ịgwakwa mmadụ nile ihe banyere m, nꞌihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21