bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 21
John 21
Igbo 1988
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nꞌakụkụ osimiri Galili. Lee otu o si mee.
2
Ụfọdụ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saịmọn Pita na Tọmọs onye a na-akpọ Didimọs, na Jemes, na Jọn, ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya.
3
Saịmọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha zara sị ya, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nꞌime ụgbọ mmiri, pụọ igbu azụ. Ma nꞌabalị ahụ nile ha egbuteghị azụ ọ bụla.
4
Mgbe chi na-abọ ha hụrụ otu nwoke guzo nꞌakụkụ mmiri. Ma ha amataghị na ọ bụ Jisọs.
5
Jisọs kpọkuru ha sị, “Ụmụnta, unu gbutere ihe ọ bụla?” Ha zara sị ya, “È, è.”
6
Ọ gwara ha sị, “Tụnyenụ ụgbụ unu nꞌakụkụ aka nri ụgbọ unu. Unu gaegbutekwa ọtụtụ azụ.” Ha tụnyere ụgbụ ha, ma ha enwekwaghị ike ịdọpụta ya nꞌihi na ọtụtụ azụ dị nꞌime ya, nke mere ka ụgbụ ahụ dị arọ nke ukwuu.
7
Mgbe ahụ Jọn gwara Pita sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saịmọn Pita yiiri uwe ya (nꞌihi na ọ gba ọtọ), wụba nꞌime mmiri gwuru mmiri pụọ gaa nꞌelu ala.
8
Ndị ozi ndị ọzọ nọgidere nꞌime ụgbọ ahụ dọpụta ụgbụ ahụ nke azụ juru nꞌime ya. Ila nọ ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise site nꞌala ọnụ mmiri.
9
Mgbe ha pụtara nꞌelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nꞌelu ya. Achịcha dịkwa nꞌebe ahụ.
10
Jisọs gwara ha sị, “Wetanụ ụfọdụ nꞌime azụ unu gbutere.”
11
Saịmọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nꞌelu ala. Ila dị narị azụ abụọ na iri ise na atọ nꞌime ụgbọ ahụ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị!
12
Emesịa, Jisọs kpọrọ ha sị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime ndị ozi ya jụrụ ya onye ọ bụ. Nꞌihi na ha maara onye ọ bụ.
13
Jisọs weere achịcha ahụ nye ha. Otu aka ahụ o nyekwara ha azụ.
14
Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya malite nꞌoge o si nꞌọnwụ bilie.
15
Mgbe ha risịrị nri, Jisọs kpọrọ Saịmọn Pita jụọ ya sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya karịa ndị a nile?” Pita zara sị ya, “Ee Onyenwe m, ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.”
16
Jisọs jụrụ Pita ajụjụ nke ugboro abụọ sị ya “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya?” Pita zara sị ya, “Ee, Onyenwe m, ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.”
17
Jisọs jụrụ Pita ajụjụ nke ugboro atọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya?” O wutere Pita na Jisọs jụrụ ya ajụjụ a nke ugboro atọ. Pita zara sị ya, “Onyenwe m ị maara ihe nile. Ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.
18
Nꞌezie asị m gị, na mgbe ị bụ okorọbịa i mere ihe dị gị mma nꞌanya. Ị gara ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi ị ga-esite aka gị, mgbe ndị ọzọ ga-edu gị. Ha ga-edu gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”
19
Jisọs kwuru nke a igosi ụdị ọnwụ Pita gaanwụ nꞌihi inye Chineke otuto. Mgbe ahụ, Jisọs sịrị Pita, “Soro m.”
20
Pita chigharịrị hụ onyeozi ahụ naadabere nꞌobi Jisọs ka ọ na-esokwa ha nꞌazụ. Ọ bụ onyeozi ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ banyere onye nꞌime ha ga-arara ya nye.
21
Pita jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, gịnị ka i nwere ikwu banyere nwoke a?”
22
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ dị ndụ tutuu ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m nꞌazụ.”
23
Ndị ozi Jisọs kwuritara nꞌetiti onwe ha si na onyeozi a agaghị anwụ anwụ. Ma nke a abụghị ihe Jisọs kwuru. Nanị ihe o kwuru bụ, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ dị ndụ tutuu ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụụrụ gị?”
24
Ọ bụ otu onyeozi ahụ bụ onye naagba ama ihe ndị a nile, ma deekwa ha nꞌakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ọ gbara bụ eziokwu.
25
Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha nile nꞌotu nꞌotu nꞌakwụkwọ, ụwa nile agaghị aba akwụkwọ nile a ga-ede banyere ha.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21