bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 4
John 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 5 →
1
Mgbe Onyenwe anyị matara na ndị Farisii anụla na igwe mmadụ na-abịakwute ya ka o mee ha baptizim ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, kama ịgakwuru Jọn,
2
(ma ọ bụkwaghị Jisọs nꞌonwe ya na-eme ha baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim)
3
Jisọs hapụrụ Judia gaa Galili.
4
Ma ọ ghaghị isite nꞌetiti obodo ndị Sameria gafee mgbe ọ na-aga.
5
Ihe dị ka oge ehihie, ọ banyere obodo nta Saika nke dị nꞌime Sameria.
6
Ọ bịaruru nꞌolulu mmiri Jekọb. Olulu mmiri e gwuru nꞌala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya. Ike gwụrụ Jisọs nꞌihi ogologo ije o jere nꞌime anwụ. Nꞌihi ya ọ nọdụrụ ala nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ izu ike.
7
Mgbe nwa oge nta gafere, otu nwanyị onye Sameria bịara nꞌolulu mmiri ahụ ịdọrọ mmiri. Jisọs rịọrọ ya ka o nyetụ ya mmiri ọṅụṅụ.
8
Ma nꞌoge a ọ bụ nanị Jisọs nọ, nꞌihi na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌime obodo ịzụta nri.
9
O juru nwanyị ahụ anya na onye Juu ga-arịọ onye Sameria e ledara anya, ihe ọ bụla. Nke a bụ ihe a na-emetụbeghị mbụ. Ọ bụladị ekele ọnụ, ha adịghị ekelerịta onwe ha. Nwanyị a mere ka Jisọs mata nke a.
10
Ma Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị maara ụdị onyinye dị ebube Chineke ga-enye gị, matakwa onye m bụ, ị gaara arịọ ka m nye gị mmiri na-enye ndụ.”
11
Nwanyị a sịrị Jisọs, “I nweghị ụdọ ma ọ bụ bọketi. Olulu mmiri a dịkwa omimi. Ebeekwanụ ka ị ga-esi nweta mmiri ndụ ahụ ị ga-enye m?
12
E wezugakwa nke a, i chere na ị dị ukwuu karịa nna anyị ochie Jekọb onye gwuru olulu mmiri a? Olee otu ị ga-esi nye m mmiri dị mma karịa nke a ya na ụmụ ya na igwe ehi ya ṅụkwara?”
13
Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri a ga-emesị chọọ mmiri ọṅụṅụ ọzọ.
14
Ma mmiri nke m ga-enye onye ahụ ga-abụ isi iyi ebighị ebi nꞌime ya. Ọ ga na-asọgharị nꞌime ya ebighị ebi. Ọ ga-aghọkwa nꞌime ya ụzọ ndụ ebighị ebi.”
15
Nwanyị ahụ rịọrọ Jisọs sị ya, “Onyenwe anyị, biko nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ. Ka m hapụkwa ịga ụzọ a dị anya ọzọ, nꞌihi ịdọrọ mmiri.”
16
“Gaa kpọta di gị,” ka Jisọs gwara ya.
17
Nwanyị ahụ zara sị, “Enweghị m di.” Jisọs sịrị ya, “Ị kwuru eziokwu.
18
Nꞌihi na i nweela di ise, ma nwoke nke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ị bụ onye eziokwu.”
19
Nwanyị ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe anyị, ị ga-abụrịrị onye amụma!
20
Ma kọwaara m, gịnị mere unu ndị Juu jiri sị na Jerusalem bụ nanị ebe e kwesịrị ịnọ kpọọ isi ala nye Chineke. Anyị ndị Sameria sị na ọ bụ nꞌebe a, nꞌugwu Gerazim, ebe nna anyị ha kpọrọ isi ala nye Chineke.”
21
Jisọs zara ya sị, “Nwanyị, gee ntị ka m gwa gị, oge na-abịa mgbe ọ naagaghị adị mkpa ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Ma ọ bụ nꞌebe a ma ọ bụ na Jerusalem.
22
Ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Kama ọ bụ otu anyị siri kpọọ isi ala. Anyị na-esite nꞌime obi anyị kpọọ isi ala? Anyị na-akpọ isi ala site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ? Chineke bụ mmụọ. Anyị apụkwaghị ịkpọ isi ala nye ya nꞌụzọ ziri ezi ma ọ bụghị site nꞌinyeaka ya. Nke a bụ ụdị ịkpọ isi ala Chineke chọrọ site nꞌaka anyị. Unu bụ ndị Sameria maara ntakịrị banyere nke a. Unu na-akpọ isi ala nꞌisi. Anyị ndị Juu maara ihe nile banyere ya nꞌihi na nzọpụta rutere ụwa site nꞌaka ndị Juu!”
25
Nwanyị ahụ zara ya sị, “Amaara m na Onye nzọpụta ga-abịa, onye ahụ ha na-akpọ Kraịst. Mgbe ọ bịara, ọ gaeme ka ihe nile doo anyị anya.”
26
Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Abụ m Onye nzọpụta ahụ!”
27
Mgbe ọ na-ekwu okwu a, ndị na-eso ụzọ ya bịara. O juru ha anya ịhụ Jisọs ka ya na nwanyị a na-ekwurịta okwu. Ma ọ dịghị onye nꞌime ha jụrụ ya ihe mere o ji mee nke a ma ọ bụ ihe ha na-ekwu.
28
Otu mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ gbara ọsọ laghachi azụ nꞌime obodo gaa gwa onye ọ bụla bi nꞌobodo ahụ sị,
29
“Bịanụ lee nwoke gwara m ihe nile m mere! Ọ̀ ga-abụ na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ?”
30
Ya mere, ọtụtụ mmadụ siri nꞌime obodo ahụ pụta ịhụ Jisọs.
31
Mgbe ihe ndị a na-eme ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ na-arịọ ya ka o rie nri ha zụtara.
32
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ dịghị mkpa! Ọ dị ihe oriri m nwere iri nke unu na-amaghị ihe ọ bụla banyere ya.”
33
Ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha sị, “Onye kwanụ nyere ya ihe oriri?”
34
Ma Jisọs kọwaara ha sị, “Nri m bụ ime ihe bụ uche Chineke onye zitere m, na ịrụcha ọrụ o nyere m ka m rụọ.
35
Ùnu chere na owuwe ihe ubi naebido nanị nꞌọnwa asatọ nꞌafọ? Leenụ anya gburugburu unu! Ọtụtụ mkpụrụ obi ụmụ mmadụ achaala dị ka mkpụrụ ubi. Ha dịkwa mma ọghụghọ.
36
Ndị ga-aghọ ha ga-enwe ụgwọ ọrụ dị mma. Ha ga-aghọtakwa mkpụrụ obi ndị ga-abanye nꞌime ọba nke eluigwe. Lee! ọṅụ dị ukwuu dị na-eche ndị na-akụ mkpụrụ na ndị na-ewe ihe ubi a.
37
Ilu ahụ bụ eziokwu nke na-asị, ‘Otu onye na-akụ mkpụrụ nꞌubi, ma onye ọzọ na-aghọ mkpụrụ ubi ahụ.’
38
Ana m ezipụ unu ka unu gaa wee ihe ubi nꞌebe unu na-aghaghị mkpụrụ. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu na-ewe mkpụrụ nke ọrụ ha.”
39
Ọtụtụ nꞌime ndị sitere nꞌobodo Sameria kweere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌihi ama nwanyị ahụ gbara, na-asị, “Ọ gwara m ihe nile m mere.”
40
Mgbe ha pụtara ịhụ Jisọs nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ, ha rịọrọ ya ka o soro ha nọdụ nꞌobodo ha. O sooro ha gaa nọdụ ụbọchị abụọ.
41
Ọtụtụ ndị ọzọ kwa kweere na ya nꞌihi okwu ha nụrụ site nꞌọnụ ya.
42
Ha gwara nwanyị ahụ sị, “Nꞌezie, anyị ekwerela ugbu a, nꞌihi na anyi anụla okwu ya nꞌonwe anyị. Ọ bụkwaghị nanị nꞌihi na ị gwara anyị.”
43
Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gwụsịrị, Jisọs hapụrụ obodo ahụ chee ihu ya ịga nꞌime Galili.
44
Dị ka Jisọs si ekwu, “Onye amụma adịghị enwe ugwu nꞌala a mụrụ ya.”
45
Mgbe Jisọs bịaruru ala Galili, ndị obodo ahụ weere obi ha nile nabata ya. Nꞌihi na ọtụtụ nꞌime ha nọ na Jerusalem nꞌụbọchị mmemme Ngabiga ahụ hụ ụfọdụ ihe ịrịba ama Jisọs rụrụ.
46
Ma mgbe Jisọs na-agagharị na Galili ọ bịaruru Kena. Nke a bụ obodo ahụ ebe o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. Mgbe ọ nọ nꞌebe ahụ, otu onye na-arụ ọrụ eze, nke bi nꞌobodo Kapanọm, nke nwere nwa nwoke ahụ na-esighị ike,
47
nụrụ na Jisọs esila Judia laghachi Galili. Nwoke a mere ngwangwa gaa Kena. Nꞌebe ahụ ka ọ hụrụ Jisọs rịọ ya ka ọ bịaruo Kapanọm gwọọ nwa ya nwoke nke nọ nꞌọnụ ọnwụ.
48
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Ọ bụ nanị mgbe unu hụrụ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama ka unu ga-ekwere?”
49
Nwoke ahụ rịọsịrị ya ike sị, “Onyenwe anyị biko soro m ugbu a tupuu nwa m anwụọ.”
50
Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Laa nꞌụlọ gị. A gwọọla nwa gị!” Nwoke ahụ kweere nꞌihe Jisọs kwuru. Ọ hapụrụ ebe ahụ laa nꞌụlọ ya.
51
Mgbe ọ nọ nꞌụzọ ndị ohu ya jiri ozi ọma bịakwute ya sị, “Ahụ adịla nwa gị nwoke mma.”
52
Ọ jụrụ ha sị, “Olee oge ahụ ji dị ya mma?” Ha gwara ya sị, “Ụnyaahụ, nꞌoge ehihie, nꞌihe dị ka elekere nke mbụ, oyi ahụ kwụsịrị ya.”
53
Otu mgbe ahụ nwoke a ghọtara ihe mere ahụ jiri dị nwa ya mma. Oge ahụ bụ mgbe Jisọs gwara ya sị, “Ahụ nwa gị nwoke adịla ya mma.” Nwoke ahụ na ezinụlọ ya nile kweere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.
54
Nke a bụ ihe ịrịba ama nke abụọ Jisọs mere na Galili mgbe ọ hapụrụ Judia.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21