bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 2
John 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 3 →
1
Mgbe ụbọchị abụọ gafere e nwere ọlụlụ dị na nwụnye nꞌobodo Kena nke dị na Galili. Nne Jisọs nọ nꞌebe ahụ.
2
A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịa na mmemme ọlụlụ di na nwụnye ahụ.
3
Ọ dịghị anya mgbe ha nọ nꞌebe ahụ, mmanya ha na-aṅụ gwụrụ. Nne Jisọs bịakwutere ya gwa ya sị, “Mmanya ha agwụchaala!”
4
Ma Jisọs zara nne ya sị, “Nne, nke a abụghị nsogbu m. Oge m ji eme ihe ịrịba ama erubeghị.”
5
Nne ya gwara ndị na-eje ozi nꞌebe ahụ sị, “Ihe ọ bụla ọ sị unu mee, meenụ ya.”
6
Nꞌụlọ ahụ ha nọ, a dọbara ite mmiri isii buru ibu. Otu nꞌime ite ndị a na-eri ihe dị ka iri lita mmiri ạnọ. Nꞌime ite a ka ndị Juu na-agbanye mmiri ha ji asa ụkwụ ha, na aka ha, na ihu ha, tupuu ha ekpee ekpere.
7
Jisọs gwara ndị na-eje ozi ahụ okwu sị, “Kujuonụ ite ndị a na mmiri!” Ndị ahụ mere ihe ọ gwara ha.
8
Emesịa Jisọs sịrị ha, “Sitenụ nꞌime ite a kuru ihe ọṅụṅụ bulaara onyeisi oche oriri ọlụlụ di na nwụnye a!” Ha mekwara ihe Jisọs gwara ha.
9
Mgbe onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ, (ma ọ maghị ebe o si pụta nanị ndị na-eje ozi maara), ọ kpọrọ di nwanyị ọhụrụ ahụ sị ya, “Nꞌoge mmemme ọ bụla, a na-eburu ụzọ nye mmanya dị ụtọ. Mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ruo na mgbe ‘Kama mmanya dọrọ nꞌite ka ọ dọrọ nꞌafọ,’ e bido na-ebupụta mmanya na-adịghị ụtọ. Ma i meghị nke a! I debere mmanya ọma a ruo ugbu a.”
11
Nke a bụ ọrụ ịtụnanya mbụ Jisọs rụrụ nꞌobodo Kena dị nꞌime Galili. Site nꞌihe ịtụnanya a, Jisọs zipụtara ike ya. Ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.
12
Mgbe oriri ọlụlụ nwụnye ahụ gwụsịrị, Jisọs hapụrụ obodo Kena gaa nꞌobodo Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya. Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa. Ya na ha nọrọ na Kapanọm ụbọchị ole na ole.
13
Ma mgbe ụbọchị ncheta oriri Ngabiga na-abịaru nso, (mmemme a bụ nke ndị Juu na-eji echeta ụbọchị Chineke napụtara ha nꞌaka ọnwụ nꞌala Ijipti), Jisọs gara Jerusalem.
14
Nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, ọ hụrụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa. Ụfọdụ na-ere atụrụ na ehi. Ndị ọzọ na-ere nduru. Ndị ọzọ kwa na-agbanwe ego nke ndị si mba ọzọ jiri bịa Jerusalem.
15
Jisọs weere eriri meere onwe ya ụtarị. O ji ụtarị a chụpụsịa ndị nile na-ere ahịa site nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, ha na atụrụ ha na ehi ha. O kpugharịkwara tebulu ndị na-agbanwe ego mee ka ego ha wufuo nꞌala.
16
Ọ baara ndị ahụ na-ere nduru mba, sị, “Sitenụ nꞌebe a wepụ ihe ndị a! Unu emeela ụlọ nsọ Nna m ebe a na-anọ azụ ahịa!”
17
Nꞌoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya chetara ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ihe banyere ụlọ gị, Chineke, ka mkpụrụ obi m na-achọsi ike.”
18
Ndị Juu nọ nꞌebe ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onye nyere gị ike i ji chụpụ ndị a nꞌezi? Mee ihe ga-egosi anyị na ọ bụ Chineke zitere gị!”
19
Ma Jisọs zara ha sị, “Kwatuonụ ụlọ nsọ a, aga m ewulikwa ya elu nꞌime ụbọchị atọ!”
20
Ndị Juu tiri mkpu sị, “Gịnị? Ụlọ nsọ a anyị ji iri afọ abụọ na ise wuo, ọ bụ ya ka ị sị na ị ga-ewu nꞌabalị atọ?”
21
Ma Jisọs na-ekwurị okwu banyere anụ ahụ ya.
22
Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu a. Ma mgbe e mere ka Jisọs site nꞌonwụ bilie, okwu a doro ha anya. Mgbe ahụ kwa, ha kweere nꞌakwụkwọ nsọ, na okwu nile Jisọs gwara ha.
23
Nꞌihi ihe ịrịba ama nile Jisọs mere na Jerusalem, igwe mmadụ kweere na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌezie.
24
Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nke iwere onwe ya nye ha, nꞌihi na ọ maara ihe mmadụ nile bụ.
25
Ọ chọghị ka onye ọ bụla gwa ya ihe banyere mmadụ. Nꞌihi na ọ maara ihe dị mmadụ nꞌobi, matakwa na mmadụ pụrụ ịgbanwe mgbe ọ bụla.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21