bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 13
John 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 14 →
1
Jisọs matara nꞌabalị ụbọchị mmemme ngabiga ahụ bụ ụbọchị ikpeazụ ya nꞌụwa. Ọ maara nke ọma na emesịa ọ ga-alaghachikwuru Nna ya. Ọ hụrụ ndị bụ nke ya nꞌanya hụkwa ha nꞌanya tutuu ruo ọgwụgwụ.
2
Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu tinyere atụmatụ ọjọọ nꞌime obi Judas. Atụmatụ a bụ na a ga-arara Jisọs nye nꞌabalị ahụ.
3
Jisọs maara na Chineke enyefeela ya ihe nile nꞌaka. Ọ matara na ọ si nꞌebe Chineke nọ bịa, matakwa na ọ ga-alaghachikwuru Chineke.
4
O sitere nꞌoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ yipụ uwe ya. O kekwasịrị akwa mmiri e ji ehicha ahụ nꞌukwu ya.
5
Ọ wụnyekwara mmiri nꞌime efere, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ. O ji akwa mmiri ahụ o kere nꞌukwu ya hichaa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya.
6
Mgbe ọ bịarutere ịsacha Pita ụkwụ, Pita sịrị ya, “Onyenwe m, o kwesịghị ka ị sachaa m ụkwụ.”
7
Ma Jisọs sịrị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme. Oge na-abịa mgbe ị ga-aghọta.”
8
Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ị gaghị asacha m ụkwụ.” Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, ị gaghị abụkwa onye na-eso ụzọ m.”
9
Mgbe ahụ Saịmọn Pita sịrị ya, “Ọ bụghị nanị ụkwụ m ka ị ga-asacha, kama sachaakwa aka m na isi m.”
10
Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla sara ahụ ya agaghị asakwa ya ọzọ. Nanị ihe ọ ga-eme iji dị ọcha bụla ịsa ụkwụ ya. Kama ọ bụghị onye ọ bụla nọ nꞌebe a dị ọcha.”
11
Jisọs maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu nile dị ọcha.”
12
Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya jụọ ha sị, “Unu ghọtara ihe m mere ugbu a?
13
Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma. Nꞌezie, abụ m Nna unu ukwu na Onyenwe unu.
14
Ebe ọ bụ na mụ onwe m, Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu ji ụgwọ ịsachakwa ụkwụ ibe unu.
15
Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m meere unu.
16
Nꞌezie, ohu adịghị ukwuu karịa nna ya ukwu. Onye e ziri ozi adịghị mkpa karịa onye ziri ya ozi.
17
Ugbu a unu maara ihe ndị a nile, meenụ ha. Obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ ma unu mee ha.
18
“Ọ bụghị unu nile ka m na-agwa okwu a. Ọ bụ m họpụtara unu. Amakwaara m unu nꞌotu nꞌotu. Akwụkwọ nsọ sịrị na onye ahụ mụ na ya rikọrọ nri ga-arara m nye. Nke a ga-emekwa nꞌoge na-adịghị anya.
19
Ana m agwa unu ugbu a tupuu ihe ndị a eme, ka unu kwere na m mgbe ha ga-emezu.
20
“Nꞌezie, onye ọ bụla nabatara onyeozi m nabatara m. Onye ọ bụla nabatara m nabatara Nna m onye zitere m.”
21
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, o nweghị udo nꞌime mmụọ ya. Ọ gwara ha sị, “Nꞌezie, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye.”
22
Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nꞌime obi ha onye ọ ga-abụ.
23
Jọn, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nꞌanya nọ Jisọs nso.
24
Saịmọn Pita fufeere Jọn isi sị ya, “Jụọ Jisọs onye ga-arara ya nye.”
25
Jọn tụgharịrị chee ihu ya nꞌebe Jisọs nọ jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?”
26
Jisọs sịrị ya, “Aga m esuru achịcha a nꞌime ofe. Onye ọ bụla m nyere ya, onye ahụ bụ onye ga-arara m nye.” Jisọs suuru achịcha ahụ nꞌime ofe nye ya Judas nwa Saịmọn Iskarịọt.
27
Mgbe Judas riri achịcha ahụ, ekwensu bara nꞌime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọ bụla ị chọrọ ime mee ya ngwangwa.”
28
Ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs ghọtara ihe ọ na-ekwu.
29
Ụfọdụ chere na Jisọs gwara Judas ka ọ gaa kwụọ ụgwọ nri ha riri ma ọ bụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ego. Nꞌihi na Judas bụ onye na-eche ego ha.
30
Judas hapụrụ na-atụfụghị oge, pụọ nꞌabalị ahụ.
31
Mgbe Judas hapụrụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ugbu a ka a ga-ekpughe ebube Nwa nke mmadụ. Ugbu a ka a ga-emekwa ka ebube Chineke pụta ìhè nꞌime ya.
32
Ọ bụrụ na e mee ka ebube Chineke pụta ihe nꞌime ya, Chineke ga-akpọbatakwa ya nꞌebube nke ya onwe ya, meekwa ka ebube a pụta ìhè na mgbe na-adịghị anya.
33
Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Aga m ala hapụ unu. Site ugbu a gaa nꞌihu unu ga-achọ m ma unu agaghị ahụ m. Nke a bụkwa ihe m gwara ndị Juu.
34
“Nꞌihi na m na-ahapụ unu, ana m enye unu iwu ọhụrụ. Hụritaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.
35
Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya. Nke a ga-eme ka ndị ụwa mata na unu bụ ndị ụwa mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”
36
Saịmọn Pita sịrị, “Nna anyị ukwu, olee ebe ị na-aga?” Jisọs sịrị, “Ị pụghị iso m gaa ebe m na-aga ugbu a. Kama emesịa, ị ga-abịa.”
37
Pita sịrị, “Gịnị ga-egbochi m isoro gị ugbu a? Ejikeere m ịnwụ nꞌihi gị.”
38
Jisọs jụrụ ya sị, “Ị sị na i jikeere ịnwụ nꞌihi m? Nꞌeziokwu tupuu oke ọkụkọ ebee akwa nꞌụtụtụ echi ị gaagọnarị m ugboro atọ.”
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21