bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 16
John 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 17 →
1
“Ana m agwa unu ihe ndị a nile ka unu ghara ịda mba nꞌokwukwe unu.
2
Ha ga-esite nꞌụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ha ga-egbu unu. Ha gaechekwa na ha na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.
3
Ha ga-eme ihe ndị a nꞌihi na ha amaghị Nna m, na mụ onwe m.
4
Ma agwara m unu ihe ndị a ka unu hapụ ichefu okwu ndị a mgbe ihe ndị a ga-eme. Agwaghị m unu na mmalite nꞌihi na mụ na unu nọ nꞌoge ahụ.
5
“Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ana m ala ebe m siri bịa. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nꞌetiti unu jụrụ m sị, ‘Olee ebe ị naaga?’
6
Ma nꞌihi na m gwara unu okwu ndị a, obi unu ejupụtala na mwute.
7
Nꞌezie, ọ dị mkpa ka m hapụ unu laa. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye nkasịobi ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya.
8
“Mgbe ọ bịara ọ ga-ama ụwa ikpe mmehie. Ọ ga-akọwara ha ezi omume nke Chineke. Ọ ga-agwakwa ha ihe banyere ikpe nke Chineke.
9
Ọ ga-ama ha ikpe mmehie nꞌihi na ha ekwenyeghị na m.
10
Ọ ga-akọwara ha ihe banyere ezi omume Chineke nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Ma unu agaghị ahụkwa m ọzọ.
11
Ọ ga-akọwara ha banyere ikpe Chineke, nꞌihi na e kpeela onye na-achị ụwa a bụ ekwensu ikpe.
12
“Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a o siiri unu ike ịnabata ha.
13
Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime.
14
Ọ ga-enye m otuto, nꞌihi na ọ ga-anata ihe nile site nꞌaka m. Ihe ndị a nile ka ọ ga-ezikwa unu.
15
Ihe nile Nna m nwe bụ nke m. Nke a mere m ji sị na ọ ga-ezi unu ihe nile m ga-agwa ya.
16
Ọ fọdụrụ nwa oge ugbu a unu agaghị ahụkwa m anya ọzọ. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ. Nke a bụ nꞌihi na ana m alakwuru Nna m.”
17
Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị ka okwu dị otu a pụtara? Gịnị ka o bu nꞌobi mgbe ọ na-asị, ‘Ana m alakwuru Nna m?’ Nke a edoghị anyị anya.”
18
Ndị ọzọ sịkwara, “Gịnị ka ọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ọ̀ fọdụrụ nwantịị unu agaghị ahụ m anya ọzọ ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, unu ga-ahụkwa m anya?’ ”
19
Jisọs matara ihe dị ha nꞌobi. Ọ maara na ha chọrọ ka a kọwaara ha. Nꞌihi ya, ọ sịrị ha, “Ùnu na-ajụrịta onwe unu ihe banyere okwu m kwuru?
20
Nꞌezie, unu ga-akwa akwa tie aka nꞌobi na mwute. Ma ndị ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma mgbe iru uju unu gafesịrị unu ga-aṅụrị ọṅụ.
21
Mgbe nwanyị dị ime na-achọ ịmụ nwa, ọ naanọ nꞌọnọdụ mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nꞌihi na ọ mụpụtala nwa nwoke ya.
22
Unu nọ nꞌọnọdụ iru uju ugbu a. Ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, aga m ahụ unu anya ọzọ. Mgbe ahụ unu ga-aṅụrị ọṅụ. Mmadụ ọ bụla apụkwaghị ịnapụ unu ọṅụ unu mgbe ahụ.
23
Mgbe ụbọchị ahụ ga-erukwa, ọ dịghị ihe ga-adị unu mkpa. Ọ dịkwaghị ihe unu ga-arịọ nꞌaka m. Unu ga-ajụ Nna m ihe nile. Ọ ga-enyekwa unu nꞌihi na unu na-arịọ ha nꞌaha m.
24
Ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nꞌaha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka ọṅụ unu zuokwa oke.
25
“Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m naagaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu nile ihe banyere Nna m nꞌụzọ unu gaaghọta ya.
26
Nꞌụbọchị ahụ, unu ga-esite nꞌaka m rịọ Nna m ihe nile. Ọ gaghị adịkwa mkpa na m ga-agwa Nna m ka o meere unu ihe unu chọrọ.
27
Nꞌihi na Nna m nꞌonwe ya hụrụ unu nꞌanya. Ọ hụrụ unu nꞌanya nꞌihi na unu hụrụ m nꞌanya kwerekwa na m si nꞌebe Chineke nọ bịa.
28
Esi m nꞌebe Nna m nọ pụta, bịa nꞌime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna m.”
29
Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Lee! Ugbu a ka okwu gị doro anya! Ọ bụkwaghị ilu ka i ji ekwu okwu.
30
Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe nile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọ bụla gwa gị ihe ọ bụla. Nꞌihi nke a anyị kweere na i si nꞌebe Chineke nọ bịa.”
31
Jisọs jụrụ ha sị, “Unu ekwerela ugbu a?
32
Lee! Oge na-abịa, nꞌezie oge ahụ eruola mgbe a ga-eme ka unu gbasasịa. Onye ọ bụla nꞌụzọ nke aka ya. Mgbe ahụ unu ga-ahapụ nanị m. Ma ọ bụghị nanị m ga-anọ nꞌihi na mụ na Nna m ga-anọ.
33
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21