bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 18
John 18
Igbo 1988
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 19 →
1
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gafee iyi ntakịrị a na-akpọ Kidrọn. Ha bịaruru nꞌotu ubi a gbara ogige dị nꞌebe ahụ. Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌime ubi a.
2
Judas, onye gaarara ya nye matakwara ebe ahụ. Nꞌihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya naanọkarị nꞌebe ahụ.
3
Ndị isi nchụaja na ndị Farisii dunyere Judas ụfọdụ ndị agha na ndị uwe ojii. Ndị a ji ọkụ na ngwa agha ha bịa nꞌebe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ.
4
Ebe Jisọs maara ihe nile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ bịakwutere ndị ahụ jụọ ha sị, “Onye ka unu na-achọ?”
5
Ha zara ya sị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Jisọs sịrị ha, “Abụ m Jisọs onye unu na-achọ.” Judas onye rara ya nye so ha guzo nꞌebe ahụ.
6
Mgbe Jisọs gwara ha na ya bụ Jisọs onye ha na-achọ, ha daghachiri azụ, daa nꞌala.
7
Jisọs jụkwara ha ajụjụ ọzọ sị, “Onye ka unu na-achọ?” Ha zara sị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.”
8
Jisọs sịrị, “Agwala m unu na abụ m Jisọs. Ebe ọ bụ m ka unu nile na-achọ hapụnụ ndị ọzọ a ka ha laa.”
9
O kwuru nke a iji imezu okwu ahụ o kwuru mgbe o kpere ekpere sị, “Etufughị m onye ọ bụla nꞌime ndị ahụ i nyere m.”
10
Mgbe ahụ, Saimọn Pita mịpụtara mma ya were ya gbupụ ntị aka nri onye a na-akpọ Malkus. Malkus a bụ ohu onyeisi nchụaja.
11
Ma Jisọs gwara Pita sị, “Mịghachi mma gị nꞌọbọ ya! Ị̀ na-eche na m agaghị aṅụ site nꞌiko ahụhụ ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?”
12
Ya mere ndị agha ahụ na ndị uwe ojii ahụ jidere Jisọs, kee ya agbụ.
13
Emesịa, ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas ọgọ nwoke Kaịfas. Kaịfas bụ onyeisi nchụaja nꞌafọ ahụ.
14
Kaịfas bụkwa onye ahụ gwara ndị Juu sị, “Ọ bara uru ka otu onye nwụọ nꞌihi mmadụ nile.”
15
Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ Jisọs, nke onyeisi nchụaja maara, sooro Jisọs. Ma ha na-eso ya nꞌazụ site nꞌebe dị anya. Ha sokwa Jisọs baa nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ.
16
Mgbe ha bịarutere nꞌobi onyeisi nchụaja ahụ, Pita guzoro nꞌezi nꞌọnụ ụzọ e si abata nꞌime ya. Onye nke ọzọ na-eso ụzọ Jisọs nke onyeisi nchụaja maara, bịara gwa nwagbọghọ na-eche ọnụ ụzọ ihe banyere Pita. Emesịa, ọ kpọbatara Pita.
17
Nwagbọghọ ahụ jụrụ Pita ajụjụ sị, “Ị bụghị otu onye nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs?” Ma Pita zara ya sị, “Mbaa! Abụghị m onye na-eso ụzọ ya!”
18
Nꞌabalị ahụ, oyi na-atụ. Ndị agha na ndị na-ejere onyeisi nchụaja ozi nọ nso nꞌakụkụ ọkụ a kwanyere nꞌebe ahụ na-anya ọkụ. Pita gara soro ha guzo na-anyakwa ọkụ.
19
Nꞌoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ malitere ijụ Jisọs ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ihe ọ na-ezi ha.
20
Jisọs zara ya sị, “Nꞌihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu nile m kwuru. Ekwuru m okwu Chineke nꞌime ụlọ ekpere na nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọ bụla na nzuzo.
21
Gịnị mere i ji ajụ m ụdị ajụjụ a? Jụọ ndị gere m ntị! Ha makwaara ihe nile m kwuru.”
22
Otu onye nꞌime ndị agha guzo nꞌakụkụ Jisọs bịaketara nso pịa Jisọs aka nꞌanya, jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji si otu a na-asa onyeisi nchụaja ajụjụ?”
23
Ma Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe dị njọ m kwuru, gbagide ihe ọjọọ ahụ ama, ma ọ bụrụ na ihe m kwuru bụ eziokwu, gịnị mere i ji eti m ihe?”
24
Mgbe ahụ Anas nyere iwu ka e duru Jisọs nꞌagbụ jekwuru Kaịfas onyeisi nchụaja.
25
Ma mgbe Saimọn Pita nọ nꞌakụkụ ọkụ ahụ na-anya ọkụ, a jụrụ ya ajụjụ nke ugbo abụọ sị, “Ị bụghị otu onye nꞌime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma Pita gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.”
26
Ohu onyeisi nchụaja, onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụghị gị ka m hụrụ nꞌime ubi ahụ a gbara ogige, gị na Jisọs?”
27
Ma Pita gọkwara agọ sị, “Amaghị m ihe i na-ekwu!” Otu mgbe ahụ oke ọkụkọ kwara akwa.
28
E sitere nꞌụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nꞌụlọ Pailet onye na-achị Jerusalem. Ọ bụkwa nꞌisi ụtụtụ ka ha mere nke a. Ma ndị Juu abanyeghị nꞌụlọ Pailet. Ha achọghị imerụ onwe ha nꞌihi na ọ ga-egbochi ha iri nwa atụrụ e gburu e ji mee mmemme Ngabiga.
29
Pailet pụtara jụọ ha sị, “Gịnị ka unu nwere megide nwoke a? Olee nsogbu unu na ya nwere?”
30
Ha zara ya sị, “Anyị agaraghị ejide ya ma ọ bụrụ na o meghị ihe ọjọọ.”
31
Mgbe ahụ Pailet zara sị ha, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nꞌonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ma ndị Juu ahụ nile sịrị, “Enyeghị anyị ike igbu onye ọ bụla.”
32
Okwu a ndị Juu kwuru mezuru amụma Jisọs buru banyere otu ọ ga-esi nwụọ.
33
Ya mere, Pailet batara nꞌime ụlọ ikpe ya zie ozi ka a kpọọ Jisọs ka ọ bịakwute ya. Mgbe ọ bịara, Pailet jụrụ ya ajụjụ sị, “Gwa m, ị bụ eze ndị Juu?”
34
Jisọs zara ya sị, “Nke a ọ bụ ihe i chepụtara nꞌuche gị, ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị?”
35
Pailet jụrụ ya sị, “Abụ m onye Juu? Ndị ala gị na ndị isi nchụaja unu duuru gị bịakwute m. Ọ bụ nꞌihi gịnị? Gịnị ka i mere?”
36
Jisọs zara ya sị, “Abụghị m eze nke ụwa a. A sị na m bụ eze nke ụwa a, ndị na-eso ụzọ m gaara alụ ọgụ ịgbochi ndị Juu ijide m. Ma alaeze m abụghị nke ụwa.”
37
Mgbe ahụ Pailet sịrị, “Ọ pụtara na ị bụ eze?” Jisọs zara sị ya, “Otu ahụ ka ọ dị. Amụrị m nꞌihi nke a. Abịakwara m nꞌụwa ịgba ama banyere eziokwu ahụ. Ọ bụkwa ndị ọ bụla hụrụ eziokwu nꞌanya na-ege m ntị.”
38
Pailet jụrụ ya sị, “Gịnị bụ eziokwu ahụ?” Ma tupuu Jisọs asaa ihe ọ bụla Pailet pụrụ nꞌezi jekwuru ndị Juu gwa ha sị, “Ajụọla m nwoke a ajụjụ chọpụta na ọ dịghị ihe kwesịrị ahụhụ o mere.
39
Ma ebe ọ bụ omenala unu ịhapụrụ unu otu onye nꞌafọ nile nꞌoge mmemme Ngabiga unu, unu chọrọ ka m hapụrụ unu nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?”
40
Mgbe ahụ ndị Juu nile zukọrọ nꞌebe ahụ tiri mkpu sị, “Mbaa! Ọ bụghị nwoke a! Barabas ka anyị chọrọ ka ị hapụ!” Ma Barabas bụ onye naapụnara mmadụ ihe nꞌike.
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 19 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21