bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 9
John 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 10 →
1
Otu ụbọchị mgbe Jisọs na-agafe nꞌụzọ, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì, onye kpuru ìsì site nꞌafọ nne ya.
2
Ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere nwoke a ji kpuo ìsì site nꞌoge a mụrụ ya? Onye mehiere? Ọ bụ nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya?”
3
Jisọs zara ha sị, “Nwoke a emehieghị. Ndị mụrụ ya emehiekwaghị. Kama Chineke chọrọ ka o site nꞌọgwụgwọ a ga-agwọ nwoke a gosi ịdị ike ya.
4
Chineke enyela anyị ọrụ ọ chọrọ ka anyị rụọ. O kwesịrị ka m rụọ ya ngwangwa. Nꞌihi na ọ bụ nanị nwa oge fọdụrụ tupuu o ruo anyasị. A naghị ejikwa anyasị arụ ọrụ.
5
Ugbu a m nọ nꞌụwa, ana m eme ka ìhè m naenwu nꞌime ụwa.”
6
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, ọ bụsara ọnụ mmiri nꞌala gwakọta ọnụ mmiri na aja were aja ahụ tee onye ìsì ahụ nꞌanya.
7
Ọ gwara ya ka ọ gaa saa anya ya nꞌolulu mmiri Silom. (Silom pụtara “Nziga”). Nwoke a gara saa anya ya mmiri. Mgbe ọ na-alọghachi, o bidoro ịhụ ụzọ.
8
Ma mgbe ndị agbata obi ya hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye a ọ̀ bụghị onye ahụ kpuru ìsì? Nwoke a ọ̀ bụghị onye arịrịọ ahụ?”
9
Ụfọdụ sịrị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụghị ya.” Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ onye yiri ya.” Ma nwoke ahụ sịrị, “Abụ m onye ìsì ahụ.”
10
Ha jụrụ ya ihe mere ya o jiri bido ịhụ ụzọ.
11
Ọ gwara ha sị, “Nwoke ahụ a na-akpọ Jisọs gwọrọ ụrọ tee m nꞌanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa anya gị nꞌọdọ mmiri Silom.’ E mere m nke a malitekwa ịhụ ụzọ!”
12
Ha jụrụ ya sị, “Ugbu a, ebe ka Jisọs nọ?” Ọ zara ha sị, “Amaghị m.”
13
Ha duuru ya bịa nꞌihu ndị Farisii.
14
Ọ bụ nꞌụbọchị Satọde ka Jisọs mere ka nwoke a hụ ụzọ. Ndị Juu adịghị arụ ọrụ ọ bụla nꞌụbọchị ahụ nꞌihi na ọ bụ ụbọchị izuike.
15
Ndị Farisii gwara nwoke ahụ ka ọ kọwaa otu ihe nile siri mee. Nwoke ahụ gwara ha otu Jisọs si gwakọtaa ụrọ tee ya nꞌanya na otu o si gaa saa anya ya nꞌọdọ mmiri Silom malite ịhụ ụzọ.
16
Mgbe ahụ ndị Farisii sịrị, “Ọ bụghị Chineke zitere nwoke a a na-akpọ Jisọs. A sị na ọ bụ onye Chineke zitere, ọ garaghị arụ ọrụ nꞌụbọchị izuike.” Ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ dị otu a?” Nkewa batara nꞌetiti ha.
17
Ndị Farisii jụrụ nwoke a ajụjụ ọzọ sị, “Gịnị ka i chere banyere Jisọs?” Ọ zara ha sị, “Nꞌuche m, ọ bụ onye amụma si nꞌebe Chineke nọ bịa!”
18
Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ. Ha ziri ozi ka a kpọọ ndị mụrụ ya.
19
Mgbe ndị mụrụ ya bịara, ha jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ bụ unu mụrụ nwoke a? Ọ dị mgbe o kpuru ìsì? Ọ bụrụ na o kpuru ìsì site na mgbe unu mụrụ ya, gịnị mere o ji na-ahụ ụzọ ugbu a?”
20
Ndị mụrụ ya zara sị, “Nke a bụ nwa anyị. Anyị makwaara na o kpuru ìsì site nꞌoge anyị mụrụ ya. Ma anyị amaghị ihe mere o ji na-ahụ ụzọ ugbu a.
21
Anyị amaghị onye meghere anya ya. Unu jụọ ya. Ya onwe ya abụghị nwanta. O nwere ike ịsara ọnụ ya.”
22
Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nꞌihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị Juu ekpebiela na ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nꞌụlọ ekpere ha.
23
Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
24
Ndị Juu kpọrọ nwoke a ọzọ sị ya, “Nye Chineke otuto nꞌihi ihe o meere gị chefuo nwoke a bụ Jisọs nꞌihi na anyị maara na ọ bụ onye mmehie.”
25
Ma nwoke ahụ zara sị ha, “Amaghị m ma Jisọs ọ bụ onye mmehie, ma ọ bụ onye ezi omume. Ma ọ dị otu ihe m maara, na mbụ abụ m onye kpuru ìsì, ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
26
Ndị isi ndị Juu ahụ jụrụ ya ọzọ sị, “Gịnị ka Jisọs mere? Gịnị ka o mere nꞌanya gị tupuu ị malite ịhụ ụzọ?”
27
Nwoke ahụ zara sị ha, “Agwala m unu ihe nile. Ma unu achọghị ikwere nꞌihe m gwara unu. Gịnị ọzọ kwa ka unu na-ajụ m? Unu chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya?”
28
Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya. Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosisi.
29
Anyị maara na Chineke gwara Mosisi okwu, ma nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
30
Onye ìsì ahụ sịrị ha, “Unu ahụla ọrụ ebube Jisọs rụrụ, otu o si gwọọ onye ìsì ma unu na-asị na unu amaghị ebe o siri bịa.
31
Chineke adịghị anụ ekpere onye mmehie. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla na-arụ ọrụ ya, na-eme ihe ọ na-achọ, ọ bụ onye ahụ ka Chineke na-anụ olu ya.
32
Site na mgbe e kere ụwa ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. Anyị anụbeghị ya na ntị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì site nꞌoge a mụrụ ya.
33
Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nꞌebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọ bụla.”
34
Ha zara ya sị, “Gị onye a mụrụ nꞌime mmehie, ọ̀ bụ izi anyị ihe ka ị na-eme nke a?” Ha chụpụrụ ya site nꞌetiti ha.
35
Ma Jisọs nụrụ na ha chụpụrụ ya. Mgbe ọ chọtara nwoke ahụ, ọ gwara ya okwu sị ya, “Ì kweere nꞌỌkpara Chineke?”
36
Nwoke ahụ zara ya sị, “Onye bụ Ọkpara ahụ, Onyenwe m, ka m nwee ike ikwere na ya?”
37
Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị na-ahụkwa ya. Ya onwe ya bụkwa onye gị na ya na-ekwurịta okwu!”
38
Onye ìsì ahụ a gwọrọ zara sị ya, “Ekwerela m.” Ọ kpọrọ isi ala nye Jisọs.
39
Mgbe ahụ Jisọs sịrị, “Ọ bụ nꞌihi ikpe ka m ji bịa nꞌụwa. Ka ndị naadịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.”
40
Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nꞌebe ahụ nụrụ okwu a, ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya. “Anyị onwe anyị, anyị kpuru ìsì?”
41
Jisọs zara sị ha, “A sị na unu kpuru ìsì, unu agaraghị enwe mmehie. Ma ugbu a unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’ Nꞌihi ya, mmehie unu naadịgide.”
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21