bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 5
John 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 6 →
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs laghachiri azụ na Jerusalem. Ọ gara nꞌihi otu mmemme ndị Juu ga-eme.
2
Nꞌime Jerusalem, otu ọdọ mmiri ntakịrị dị ya, aha ọdọ mmiri a bụ Betesda. Ọ dị nso nꞌahia ebe a na-ere atụrụ. Ọ dịkwa ọnụ ụzọ ise e si aba nꞌebe ahụ.
3
Igwe ndị ọrịa dina nꞌakụkụ ọdọ mmiri a. Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị ngwụrọ. Ụfọdụ bụ ndị isi. Ndị ọzọ bụ ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha nile nọ na-eche ka mmiri ahụ mee mkpọtụ.
4
Nꞌihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-abịa na mmiri ahụ gbarụọ ya. Mgbe mmiri a gbarụrụ, onye ọrịa ọ bụla buru ụzọ baa nꞌime ya ka a na-eme ka ahụ dị mma.
5
Ma ọ dị otu nwoke nọ nꞌakụkụ mmiri a nke nọrọla nꞌọrịa ihe ruru iri afọ atọ na asatọ.
6
Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ hụọla ahụhụ nꞌọrịa. Ọ bịarutere nso ebe nwoke ahụ nọ jụọ ya ajụjụ sị, “Nwoke, ị chọrọ ka ahụ dị gị mma?”
7
Onye ọrịa ahụ zara sị, “Ahụ enweghị ike ịdị m mma, nꞌihi na mgbe ọ bụla mmiri a mere mkpatọ enweghị m onye ọ bụla ga-ekuba m nꞌime ya. Ọ bụrụ na m achọọ ịbanye, onye ọzọ ga-esi nꞌazụ m kwatuo m, buru m ụzọ banye.”
8
Jisọs gwara ya okwu sị, “Nwoke, bilie, chilie ute gị laa!”
9
Nꞌotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma. O biliri chilie ute ya bido ịla nꞌụlọ ya. Ma ụbọchị ahụ Jisọs mere ka ahụ dị ya mma bụ ụbọchị izuike ndị Juu, ụbọchị nke asaa!
10
Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ nwoke a, ha baara ya mba, sị, “Taa bụ ụbọchị izuike, o zighị ezi nꞌiwu na ị gaebu ute gị.”
11
Ma nwoke a zara ha sị, “Onye ahụ mere ka ahụ dị m mma gwara m sị, ‘Chilie ute gị laa.’ ”
12
Ha jụrụ ya sị, “Onye bụ nwoke gwara gị ụdị okwu ahụ?”
13
Ma nwoke a amaghị onye gwọrọ ya! Igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ mgbe Jisọs mere ka ahụ dị ya mma. Jisọs banyekwara nꞌetiti igwe mmadụ a, nwoke ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ.
14
Mgbe e mesịrị, Jisọs hụrụ nwoke ahụ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, dụọ ya ọdụ sị, “Ugbu a ahụ adịla gị mma. Emehiekwala ọzọ. Ọ bụrụ na i mehie, ọrịa ka nke a njọ ga-abịakwasị gị.”
15
Nwoke a siri nꞌebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.
16
Nꞌihi nke a ndị Juu sogburu Jisọs, chọsiekwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Nꞌihi na ọ dịghị asọpụrụ ụbọchị izuike ha.
17
Ma Jisọs zara ha sị, “Nna m na-arụ ọrụ oge nile. Mụ onwe m na-arụkwa dị ka o si arụ.”
18
Nꞌihi okwu a Jisọs kwuru, ndị Juu chọsịrị ụzọ ike igbu ya. Ọ bụghị nanị na Jisọs rụrụ ọrụ nꞌụbọchị izuike, kama ọ sịrị na Chineke bụ Nna ya. Site nꞌokwu a ọ na-egosi na ya na Chineke ha.
19
Jisọs gwara ha sị, “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla site nꞌike nke aka ya. Ọ na-arụ ihe ọ bụla ọ hụrụ Nna ya na-arụ. Ihe ọ bụla Nna mere nke a ka Ọkpara Nna na-emekwa.
20
Nꞌihi na Nna hụrụ Ọkpara ya nꞌanya, ọ naegosikwa ya ihe nile ọ na-eme. Ọkpara Nna ga-emekwa ihe ịrịba ama dị iche iche karịa ọgwụgwọ nwoke a, ka o ju unu anya.
21
Dị ka Nna pụrụ ime ka mmadụ si nꞌọnwụ bilie, otu a ka Ọkpara Nna pụrụ ịkpọlitekwa onye ọ bụla nwụrụ anwụ ọ chọrọ site nꞌọnwụ.
22
Nna adịghị ekpe mmadụ ọ bụla ikpe. Ọ hapụụrụ Ọkpara Nna ikpe ikpe nile.
23
Ka mmadụ nile nye Ọkpara Nna nsọpụrụ dị ka ha si enye Nna. Onye ọ bụla na-adịghị asọpụrụ Ọkpara adịghị asọpụrụ Nna. Nꞌihi na ọ bụ Nna zitere ya.
24
“Ka m gwa unu eziokwu, mmadụ ọ bụla nụrụ okwu m ma kwerekwa na Chineke onye zitere m, nwere ndụ ebighị ebi. Ọmụma ikpe adịkwaghị nye onye ahụ. Kama o sitela nꞌọnwụ banye na ndụ.
25
Nꞌeziokwu, oge na-abịa, oge ahụ eruokwala nso mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anọ nꞌili ha nụ olu m. Ndị nile nụrụ olu m ga-adịkwa ndụ.
26
Dị ka ndụ na-esite nꞌaka Chineke bịa, otu a kwa ka Nna si mee ka ndụ site nꞌaka Ọkpara ya bịa.
27
Ọ na-enye Ọkpara ike nile, ikpe mmadụ nile ikpe nꞌihi mmehie ha, nꞌihi na ọ bụ Nwa nke mmadụ, Onyenwe abube nile.
28
Ka ọ hapụ iju unu anya, oge na-abịa mgbe ndị nwụrụ anwụ nọkwa nꞌili gaanụ olu Ọkpara Chineke.
29
Ha ga-esitekwa nꞌili ha pụta. Ndị rụrụ ezi ọrụ ga-abanye na ndụ ebighị ebi. Ma ndị ọrụ ọjọọ ga-abanye nꞌọmụma ikpe ebighị ebi.
30
Mụ onwe m adịghị ekpe ikpe dị ka m si chọọ. Ana m ekpe ikpe dị ka Nna si chọọ. Ikpe m na-ekpe ziri ezi. Mkpa m abụghị ime ihe m chọrọ. Ana m achọ ime uche Nna m, onye zitere m.
31
“Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, nke a abụghị ezi ama.
32
Onye ọzọ dị nke na-agba ama banyere m. Jọn omee baptizim bụ onye ahụ na-agba ama banyere m.
33
Unu ezigala ndị gara jụọ ya ajụjụ. Ama Jọn gbakwara bụ eziokwu.
34
Ọ bụghị na m na-atụkwasị obi nꞌama mmadụ. Emere m ka unu cheta ama Jọn ka unu kwere na m, ka a zọpụta unu.
35
Jọn dị ka ìhè nwuru nwa oge nta. Unu ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ya ritekwa uru site na ndụ ya.
36
Ma enwere m ama karịrị ama Jọn. Ọrụ ebube nile m rụrụ gosiri na ọ bụ Nna m zitere m. Ha bụ ọrụ nke Nna m nyefere m nꞌaka ịrụ.
37
Nna m, onye zitere m, gbakwara ama banyere m. Ọ bụ ezie na ọ pụtaghị ka unu hụ ya anya, unu anụbekwaghị olu ya.
38
Ma unu jụrụ ige ntị nꞌihe onye Chineke zitere na-ekwu. Nke a bụ nꞌihi na okwu Chineke adịghị nꞌime unu.
39
“Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nꞌihi na unu chere na unu ga-esite nꞌihe e dere nꞌime ya nwee ndụ ebighị ebi. Ma akwụkwọ nsọ ndị a na-ekwu ihe banyere m.
40
Ma unu achọghị ịbịakwute m ka m nye unu ndụ ebighị ebi.
41
“Adịghị m achọ otutu mmadụ.
42
Ma amaara m unu. Amaara m na ịhụnanya Chineke adịghị nꞌime unu.
43
Abịara m nꞌaha Nna m ma unu anabataghị m. Ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nꞌaha nke ya onwe ya ọ bụ ya ka unu ga-anabata.
44
Unu ga-esi aṅaa kwere, ebe ọ bụ na unu na-achọ otuto mmadụ ibe unu? Ma unu achọghị otuto si nꞌebe Chineke nọ pụta.
45
“Agaghị m ebo unu ihe ọ bụla nꞌebe Nna nọ. Mosisi bụ onye ga-ebo unu ebubo nile. Ee, Mosisi ahụ unu na-atụkwasị obi na ọ ga-eduba unu nꞌeluigwe.
46
Ebe unu jụrụ ikwere ihe Mosisi dere banyere m, unu ajụkwala ikwere na Mosisi. Nke a mere unu ji jụ ikwere na m.
47
Ebe ọ bụ na unu ekwenyeghị nꞌihe Mosisi dere, unu ga-esi aṅaa kwere na m?”
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21