bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 11
John 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 12 →
1
Nꞌoge a Lazarọs onye bi na Betani nọ nꞌahụ ọkụ. Betani bụ obodo nta ebe Meri na nwanne ya nwanyị Mata bi.
2
Nke a bụ Meri ahụ weere mmanu dị oke ọnụ ahịa tee Jisọs. O jikwara agịrị isi ya hichaa ụkwụ Jisọs. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs, bụ onye nọ nꞌọrịa.
3
Ụmụ nwanne nwanyị abụọ ndị a zipụrụ ozi ngwangwa zigara Jisọs sị ya, “Onyenwe anyị, enyi ọma gị nọ nꞌọnụ ọnwụ.”
4
Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa na-arịa ya abụghị nke ma-eweta ọnwụ, kama ọ bụ ọrịa a ga-esi na ya nye Chineke otuto. A ga-esitekwa nꞌime ya nye mụ onwe m bụ Ọkpara Chineke otuto.”
5
Ọ bụ ezie na Jisọs hụrụ Mata, Meri na Lazarọs nꞌanya,
6
ma ọ nọgidesịrị ike nꞌọrụ ya ruo ụbọchị abụọ ọzọ. Ọ dịghị mgbe o mere ngwangwa ịgakwuru ha.
7
Ma mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Ngwanụ, bilienụ ka anyị jeruo Judia.”
8
Ma ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi gwara ya sị, “Nꞌoge gara aga ka ndị Juu nwara ọnwụnwa ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”
9
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ nanị awa iri na abụọ dị nꞌotu ehihie nke ụbọchị. Nꞌime awa ndị a mmadụ nwere ike jegharịa nꞌime ya na-asụghị ngọngọ nꞌihi na ọ na-ahụ ìhè anyanwụ.
10
Ọ bụ nanị nꞌabalị ka egwu ịzọhie ụkwụ dị. Nꞌihi na ọchịchịrị dị.”
11
Jisọs gwakwara ha sị, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ugbu a ana m aga ịkpọte ya nꞌụra.”
12
Ndị na-eso ụzọ ya, ebe ha na-eche ihe banyere nanị ụra efu, sịrị, “Ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-etetanụ nꞌonwe ya.”
13
Ma Jisọs maara na ha aghọtaghị na ihe ọ na-akọwara ha bụ na Lazarọs anwụọla.
14
Ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Lazarọs anwụọla!
15
Ma nꞌihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nꞌebe ahụ. Nꞌihi na nke a ga-enye unu ohere ọzọ ikwere na m. Bịanụ, ka anyị gaa lee ya.”
16
Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị ibe ya bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst sị, “Ka anyị gaakwa soro ya nwụọ.”
17
Mgbe ha rutere Betani, Jisọs chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nꞌili ụbọchị anọ!
18
Betani dị nanị kilomita anọ site na Jerusalem.
19
Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasi ha obi.
20
Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya. Ma Meri nọdụrụ nꞌụlọ.
21
Mgbe Mata hụrụ Jisọs, ọ sịrị ya, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nꞌebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.
22
Ma ugbu a amara m na Chineke gaemere gị ihe ọ bụla ị ga-arịọ ya ka o mee.”
23
Jisọs zaghachiri ya sị, “Nwanne gị nwoke ga-adị ndụ ọzọ.”
24
Mata sịrị ya, “Amaara m na a ga-eme ka o bilie ọzọ mgbe a ga-emekwa ka ndị ọzọ bilie nꞌụbọchị mbilite nꞌọnwụ ikpeazụ ahụ.”
25
Ma Jisọs gwara ya sị, “Mụ onwe m bụ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa m na-enye ha ndụ ọzọ. Onye ọ bụla kweere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.
26
Ọ dịkwaghị onye dị ndụ nke nwere okwukwe nꞌime m, ga-anwụ anwụ. Mata, ị kweere nke a?”
27
Mata zara ya sị, “E, Onyenwe m, ekweere m na ị bụ Onye nzọpụta ahụ. Ọkpara Chineke, Onye anyị na-ele anya ya.”
28
Mgbe Mata gwasịrị Jisọs nke a, ọ hapụrụ ya bịakwute Meri, kpọpụta ya site nꞌebe ndị na-akwa akwa nọ, gwa ya na nzuzo sị, “Onyenwe anyị bịara, ọ chọrọ ịhụ gị.”
29
Mgbe Meri nụrụ nke a, ọ gbapụtara nꞌụlọ ahụ ịga izute Jisọs.
30
Ruo mgbe a, Jisọs abịarubeghị Betani. Ọ nọ nꞌebe ahụ Mata zutere ya.
31
Mgbe ndị Juu nọ nꞌụlọ na-akasi Meri obi hụrụ ya ka ọ na-apụ ngwangwa, ha chere na ọ na-aga nꞌakụkụ ili ịkwa akwa. Ha sooro ya.
32
Mgbe Meri rutere nꞌebe Jisọs nọ, ọ dara nꞌụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nꞌebe a, nwanne m nwoke Lazarọs agaraghị anwụ.”
33
Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa akwa, hụkwa ndị ahụ bịara ileta ha ka ya na ha na-akwa akwa, o metụrụ ya nꞌobi. O nwere ọmiko dị ukwuu nꞌebe ha nọ.
34
Ọ jụrụ ha sị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.”
35
Anya mmiri pụtara Jisọs nꞌanya!
36
Ndị Juu ahụ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Nꞌeziokwu Jisọs hụrụ ha nꞌanya nke ukwuu.”
37
Ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nwoke a gwọrọ onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka Lazarọs hapụ ịnwụ?”
38
Jisọs sụrụ ude nꞌime onwe ya nke ukwuu, bịarute ili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba. E jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya.
39
Jisọs nyere iwu sị, “Bupụnụ nkume a!” Ma Mata, nwanne nwanyị Lazarọs sịrị, “Ozu ya ebidola isi isi ugbu a, nꞌihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
40
Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ̀ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na i kwere i ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
41
Mgbe ahụ ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nꞌelu kpọkuo Chineke sị, “Nna, ekelee m gị nꞌihi na ị na-anụ olu m.
42
Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe nile. Ana m ekwu nke a nꞌihi ndị a gbara m gburugburu nꞌebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.”
43
Mgbe o kwusịrị okwu a, o jiri oke olu kpọọ oku sị, “Lazarọs! Pụta!”
44
Lazarọs pụtara. E jiri akwa ozu kekọtaa aka ya na ụkwụ ya. E jikwa akwa ozu kee ihu ya. Jisọs nyere ha iwu sị, “Tọpụnụ ya ka ọ laa!”
45
Ọtụtụ ndị Juu bịara ileta Meri hụrụ ihe a Jisọs mere. Ha kweere na ya.
46
Ma ụfọdụ nꞌime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe Jisọs mere.
47
Mgbe ahụ ndị isi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ ịchọ ihe ha ga-eme. Onye ọ bụla nꞌetiti ha na-ajụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nꞌihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama.
48
Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nꞌihu mmadụ nile ga-esokwa ya. Ndị Rom ga-abịakwa tigbuo anyị kwatuo ụlọ nsọ ukwu Chineke anyị ma mebisie obodo anyị.”
49
Kaịfas, onyeisi nchụaja nꞌafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe.
50
Ọ dị mma ka otu nwoke a nwụọ nꞌihi mmadụ nile, kama a ga-emebi mba a nile.”
51
Kaịfas ekwughị nke a site nꞌechiche ya. Nꞌokwu a o kwuru, ọ na-ebu amụma na Jisọs aghaghị ịnwụ nꞌihi mba ahụ.
52
Ọ bụghị nꞌihi mba ahụ nanị, kama nꞌihi ụmụ Chineke ndị gbasara nꞌime mba nile. Ka ọ chịkọta ha nꞌotu.
53
Ya mere, site nꞌụbọchị ahụ ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi mee ka Jisọs nwụọ.
54
Nꞌihi nke a Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe mmadụ nile ga-ahụ ya. O siri nꞌebe ahụ pụọ gaa nꞌakụkụ ọzara. Ọ gara nꞌotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Nꞌebe ahụ ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ.
55
Mmemme ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nꞌakụkụ ala ndị Juu nile bịa Jerusalem. Ha bịara tupuu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha, dị ka omenala si dị.
56
Mgbe ha rutere Jerusalem, ha malitere ịchọ Jisọs. Ha na-ajụrịta onwe ha ajụjụ mgbe ha nọ nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ sị, “Gịnị ka i chere? Ọ̀ ga-abụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”
57
Ma nꞌoge ahụ, ndị isi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọ bụla hụrụ Jisọs gwa ha otu mgbe ahụ ka ha jide ya.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21