bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 19
John 19
Igbo 1988
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 20 →
1
Mgbe ahụ Pailet nyere ndị agha ya iwu ka a pịa Jisọs ihe.
2
Ndị agha ya jikwa ogwu kpaa okpu nke ha kpukwasịrị Jisọs nꞌisi ka ọ bụrụ okpueze ya. Ha yinyekwara ya uwe ndị eze.
3
Emesịa, ha kpọrọ isi ala nꞌihu ya, nꞌọnọdụ ịkwa emu, na-asị, “Ka eze ndị Juu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!” Ha jikwa aka ha tie ya ihe otiti.
4
Pailet pụkwara nꞌezi jekwuru ndị Juu sị ha, “Lee! Ana m akpọpụtara unu nwoke a. Maranụ na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọ bụla nꞌime ya.”
5
A kpọpụtara Jisọs ka ndị Juu hụ ya anya. Okpu ogwu ahụ dị ya nꞌisi. O yikwa uwe ahụ ha yinyere ya nꞌahụ. Pailet gwara ndị Juu sị, “Leenụ onye unu chọrọ!”
6
Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ Jisọs, ha bidoro iti mkpu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe! Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet zara sị ha, “Kpọrọnụ ya gaa kpọgide ya nꞌonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọ bụla nꞌime ya.”
7
Ndị Juu gwara Pailet sị, “Iwu anyị kwuru na o kwesịrị ịnwụ nꞌihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke!”
8
Mgbe Pailet nụrụ nke a ọ tụrụ egwu nke ukwuu.
9
O duuru Jisọs baa nꞌụlọ ikpe ya, jụọ ya sị, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs egheghị ya ọnụ.
10
Pailet jụrụ Jisọs sị, “Ị̀ chọghị ikwuru m okwu? Ị̀ maghị na m nwere ike ikpọgide gị nꞌobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?”
11
Jisọs zara ya sị, “Ị garaghị enwe ike ọ bụla nꞌebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nꞌelu rute gị aka. Ọ bụ ndị dutere m nꞌebe ị nọ nwere mmehie karịa.”
12
Okwu a mere ka Pailet chọsie ike ịhapụ Jisọs. Ma ndị isi ndị Juu gwara ya sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, i gosiri na ị bụkwaghị enyi Siza. Nꞌihi na onye ọ bụla na-eme onwe ya eze na-edo onwe ya imegide Siza.”
13
Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nye ha. Ọ nọdụrụ ala nꞌoche ikpe ya nꞌebe a na-akpọ Pevumentị.
14
Ihe ndị a mere nꞌihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie nꞌụbọchị ọ ga-abụ o jie, bọọ, mmemme Ngabiga ebido. Pailet sịrị ha, “Leenụ eze unu!”
15
Ma ndị Juu jiri oke olu tie mkpu sị, “Were ya pụọ! Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nꞌobe?” Ma ndị Juu zara sị, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza!”
16
Mgbe ahụ Pailet kpọnyere ha Jisọs ka ha kpọgbuo ya. Ndị soja duuru ya pụọ.
17
Jisọs buuru obe ya gaa nꞌebe a na-akpọ Gọlgọta.
18
Nꞌebe ahụ ka ha kpọgidere ya nꞌobe. A kpọgidekwara mmadụ abụọ ọzọ nꞌobe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌaka nri ya, onye nke ọzọ nꞌaka ekpe ya.
19
O nwere ihe Pailet dere kụpanye nꞌelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a, “Jisọs onye Nazaret, Eze Ndị Juu.”
20
Ma ebe a nọkwa kpọgide Jisọs nꞌobe dị nso nꞌobodo Jerusalem. Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe Pailet dere, nꞌihi na o dere ya nꞌasụsụ atọ, Hiburu, Griik na Latin.
21
Emesịa, ndị isi nchụaja bịakwutere Pailet rịọ ya sị, “Gbanwee ihe i dere nꞌelu obe ahụ. Ị garaghị ede na ọ bụ eze ndị Juu, kama na ọ sịrị, ‘Mụ onwe m bụ Eze ndị Juu!’ ” Ma Pailet gwara ha sị, “Agaghị m agbanwe ihe m dere. Ka ọ dịrị otu m siri dee ya.”
23
Mgbe ndị agha rụsịrị ọrụ ịkpọgide Jisọs nꞌelu obe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Ma ha ekeghị otu uwe mwụda ya, nꞌihi na a kpara ya akpa. O nweghị ebe a dụkọtara ya adụkọta.
24
Ha gwarịtara onwe ha sị, “Ka anyị hapụ ịdọka uwe a, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere iwere ya.” Ma okwu a mezuru ihe e buru nꞌamụma sị, “Ha kere uwe m nꞌetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwuda m.” Nke a bụ ihe ha mere.
25
Meri, nne Jisọs guzo nso nꞌebe ahụ a kpọgidere Jisọs nꞌobe, ya na nwanne ya nwanyị bụ nwụnye Kleopas na Meri Magdalin.
26
Mgbe Jisọs hụrụ nne ya ka o guzo nso nꞌebe Jọn guzo, Jọn bụ otu onye nꞌime ndị na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nꞌanya, ọ gwara ya sị, “Nwanyị, lee nwa gị nwoke.”
27
Ọ gwakwara Jọn sị, “Lee nne gị.” Site nꞌụbọchị ahụ, Jọn duuru Meri laa nꞌụlọ ya.
28
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs matara na ọ rụzuola ọrụ ya nile. Imezu ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ, o kwuru sị, “Agụụ mmiri na-agụ m.”
29
Ite mmanya ọra dọ nso nꞌebe ahụ. Ndị agha gbara ọsọ were ogbo denye nꞌime mmanya ahụ. Ha kenyere ogbo a nꞌosisi, welie ya elu tinye ya nꞌọnụ Jisọs.
30
Mgbe Jisọs detụrụ ya ọnụ, o tiri mkpu sị, “Ọ gwụchaala!” O hulatara isi ya, kwụsị iku ume.
31
Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị a a kpọgidere nꞌobe nọgide nꞌebe ahụ tutuu chi abọọ. Nꞌihi na echi ya bụ ụbọchị izuike. Ha jekwuru Pailet rịọ ya ka ọ gwa ndị agha ya ka ha gbajisịa ụkwụ ha. Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ka ndị a nwụọ ọsịịsọ. Ọzọ kwa, nꞌihi na ha chọkwara ibupụ ahụ ha.
32
Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ ndị ahụ a kpọgidere nꞌobe nꞌakụkụ Jisọs.
33
Ma mgbe ha bịaruru nꞌebe Jisọs nọ, lee ya anya, ha hụrụ na ọ nwụọla. Nꞌihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya.
34
Kama otu onye nꞌime ndị agha ahụ weere ùbe o ji nꞌaka maa Jisọs nꞌakụkụ. Nke a mere ka ọbara na mmiri site nꞌakụkụ ya sọpụta.
35
Akụkọ a bụ eziokwu. Onye dere akụkọ a nọ mgbe ihe ndị a nile na-eme, hụkwa ha. Ọ chọkwara ka unu kwere.
36
Nꞌihi na ihe ndị a nile mezuru ihe akwụkwọ nsọ kwuru. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Otu ọkpụkpụ agaghị agbaji agbaji nꞌahụ ya.”
37
Ọzọ kwa, akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mara ùbe anya.”
38
Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo a na-akpọ Josef, onye si nꞌobodo a na-akpọ Arimatia, jekwuuru Pailet, rịọ ya ka o nye ya ike ibutu ozu Jisọs. Pailet nyere ya ike. Josef gara butuo ozu Jisọs.
39
Nikọdimọs bịakwara nꞌebe ahụ. Nke a bụ nwoke ahụ bịakwutere Jisọs nꞌabalị. O wetara mmanụ otite na-esi isi ụtọ.
40
Ha abụọ, Nikọdimọs na Josef onye Arimatia, kwadoro ozu Jisọs. Ha jiri akwa kechie ahụ ya dị ka omenala ndị Juu si dị.
41
Ebe a nọ kpọgide Jisọs nꞌobe dị nso nꞌebe nwa ọgba ntakịrị dị. Nꞌime ọgba a, otu ili dị ya nke mmadụ ọ bụla na-ejibeghị mee ihe ọ bụla.
42
Nꞌime ili a ka ha dọnyere ozu Jisọs, nꞌihi na ili a dị nso. Ọzọ kwa, Nikọdimọs na Josef na-eme ngwangwa nꞌihi na ha chọrọ imechasị ihe nile tupuu ụbọchị izuike ebido. Nꞌihi na ụbọchị izuike ndị Juu na-ebido nꞌelekere isii nke abalị ụbọchị ahụ.
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 20 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21