bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 12
John 12
Igbo 1988
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 13 →
1
Ụbọchị isii tupuu e mee mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani. Betani bụ obodo Lazarọs, nwoke ahụ Jisọs mere ka o site nꞌọnwụ bilie.
2
Ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata jere ozi isi nri ahụ. Lazarọs bụ otu onye nꞌime ndị sooro nọdụ na nri ahụ.
3
Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ dị oke ọnụ ahia tee Jisọs nꞌụkwụ. O jikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ Jisọs. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nꞌisi mmanụ oke ọnụ ahia ahụ.
4
Ma Judas Iskariọt, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Kraịst, onye ahụ ga-arara Jisọs nye nꞌaka ndị Juu, tamụrụ ntamụ sị,
5
“Nke a bụ itufu ego, a gaara ere mmanụ a nweta ego dị ukwuu, were ya kee ndị ogbenye.”
6
Ma Judas ekwughị nke a nꞌihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nꞌobi. Kama Judas bụ onye na-eche ego ndị na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe ụfọdụ, ọ naamanye aka nꞌego ahụ zụfuo nꞌonwe ya.
7
Jisọs zara sị, “Hapụnụ nwanyị a ka ọ rụọ ọrụ ọ na-arụ. Ọ na-akwado m nꞌihi olili a ga-eli m!
8
Unu nwere ike inyere ndị ogbenye aka mgbe ọ bụla unu chọrọ, ma ọ bụghị mụ na unu gaanọ mgbe nile.”
9
Ọtụtụ ndị Juu nụrụ na Jisọs nọ nꞌebe ahụ. Ha bịara ịhụ ya. Ha bịakwara ịhụ Lazarọs, onye Jisọs mere ka o si nꞌọnwụ bilie.
10
Ma ndị isi nchụaja gbakwara izu igbu Lazarọs.
11
Nꞌihi na ọ bụ nꞌihi Lazarọs ka ọtụtụ mmadụ ji kwere na Jisọs.
12
Ụbọchị nke ọzọ ya, ozi rutere ndị Juu ntị na Jisọs na-abịa Jerusalem.
13
Ọtụtụ mmadụ weere igu nkwụ pụọ izute ya. Ha na-eti mkpu na-asị, “Hozaana! Ngọzi dịrị eze Izirel! Ngọzi dịrị Onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.”
14
Nꞌoge a, Jisọs nꞌonwe ya nọkwasịrị nꞌelu nwa inyinya ibu imezu amụma ahụ e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị,
15
“Atụla egwu ada Zayọn! Lee eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ na-anọkwasị nꞌelu nwa inyinya ibu!”
16
Nꞌoge ahụ, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị na Jisọs na-emezu ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ nanị mgbe Jisọs laghachiri nꞌeluigwe, ka ha chọpụtara na ọtụtụ ihe ndị amụma dere banyere ya mezuru.
17
Ndị nọ mgbe Jisọs mere ka Lazarọs si nꞌọnwụ bilie, gwakwara ndị ọzọ banyere ya.
18
Nke a mere ọtụtụ mmadụ ji pụọ izute Jisọs. Nꞌihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ebube nile ọ rụrụ.
19
Mgbe ndị Farisii hụrụ ndị mmadụ ka ha na-agbakọ ịhụ Jisọs, ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Unu gbara nkịtị? Lee! Mmadụ nile na-eso ya!”
20
Ụfọdụ ndị Griik so nꞌime ndị ahụ bịara Jerusalem nꞌihi mmemme ahụ.
21
Ha bịakwutere Filip nwoke si nꞌobodo nta a na-akpọ Betsaida gwa ya sị, “Biko, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.”
22
Filip pụrụ gaa gwa Anduru. Ya na Anduru soro gaa gwa Jisọs.
23
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Oge ahụ abịala mgbe a ga-ebuli Nwa nke mmadụ elu.
24
Eziokwu ka m na-agwa unu. Mkpụrụ ọka apụghị ịmị mkpụrụ karịakwa ma ọ dabara nꞌala nwụọ. Ma o meghị otu a ọ pụghị ịmị mkpụrụ. Kama ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị mkpụrụ hie nne.
25
Onye ọ bụla hụrụ ndụ ya nꞌanya ga-etufu ya. Onye ọ bụla kpọrọ ndụ ya asị nꞌụwa a, gaedebe ya ruo ebighị ebi.
26
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ijere m ozi, ya so m. Ndị ozi m ga-anọkwa nꞌebe mụ onwe m nọ. Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla abụrụ onyeozi m, Nna m ga-asọpụrụ ya.
27
Ugbu a, mkpụrụ obi m jupụtara nꞌihe mgbu. Gịnị ka m ga-ekwu? M ga-arịọ Nna m ka ọ zọpụta m site nꞌihe na-akwado ịdakwasị m? Mbaa! Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji bịa nꞌụwa.
28
Nna m biko wetara aha gị ugwu na otuto.” Olu siri nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Enyela m aha m otuto. Aga m enyekwasịkwa aha m otuto ọzọ.”
29
Igwe ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ, ndị nụrụ olu ahụ kwuru sị, “Ọ bụ egbe eluigwe.” Ụfọdụ sịrị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”
30
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Olu a abịaghị nꞌihi m. Olu a bịara nꞌihi unu.
31
Nke a bụ oge a ga-ekpe ụwa ikpe. Ugbu a bụ oge ịchụda ekwensu.
32
Mgbe e weliri m elu aga m adọta mmadụ nile nye onwe m.”
33
Jisọs kwuru nke a igosi ụdị ọnwụ nke ọ ga-anwụ.
34
Ndị mmadụ jụrụ ya sị. “A na-akuziri anyị nꞌime akwụkwọ iwu na onye ahụ bụ Onye nzọpụta agaghị anwụ anwụ. Na ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị mere i ji na-asị na Onye nzọpụta ga-anwụ?”
35
Jisọs zara ha sị, “Ìhè m nwere nanị nwa oge nta ọ ga-enwuru unu. Jegharịanụ nꞌìhè a, ugbu a unu nwere ya ka ọchịchịrị hapụ ịbịakwasị unu. Nꞌihi na onye ọ bụla na-ejegharị nꞌọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.
36
Ugbu a unu nwere ìhè a, nabataranụ ya onwe unu. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-aghọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe o kwusịrị nke a Jisọs hapụrụ ha pụọ zoo onwe ya.
37
Ma ọ bụ ezie na ha hụrụ ọrụ ebube nile ọ rụrụ nꞌetiti ha, ha ekwereghị na ya.
38
Nke a bụ ihe Aịzaya onye amụma kwuru nꞌoge ya sị, “Onyenwe anyị, onye kweere akụkọ anyị? Onye gaanabata ọrụ ebube nile nke Chineke dị ka ihe ngosi?”
39
Ma ha ekwereghị nꞌihi na Aịzaya kwukwara ọzọ sị,
40
“Chineke emeela ka ha kpuo ìsì. O meela ka obi ha kpọchie. He enweghị ike ịhụ. Ha apụghị ịghọtakwa. Ha agaghị abịakwute Chineke ka ọ gwọọ ha.”
41
Aịzaya kwuru ihe ndị a banyere Jisọs. Nꞌihi na ọ hụrụ ebube Kraịst.
42
Ma ụfọdụ nꞌime ndị isi nchụaja kweere na ya. Ma ha ekwupụtaghị nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị Farisii. Ha achọkwaghị ka achụpụ ha site nꞌụlọ ekpere ndị Juu.
43
Nꞌihi na ha chọrọ otuto mmadụ, karịa otuto nke Chineke.
44
Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọ bụla tụkwasịrị m obi, tụkwasịrị Chineke obi.
45
Nꞌihi na onye ọ bụla hụrụ m ahụla onye zitere m.
46
Abịara m nꞌime ụwa dị ka ìhè ka ndị nile tụkwasịrị m obi hapụ ijegharị nꞌọchịchịrị.
47
Ọ bụrụ na onye ọ bụla nụrụ okwu m ajụ ịtụkwasị m obi, ọ bụghị m ga-ekpe ya ikpe. Abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.
48
Onye ọ bụla jụrụ m, jụkwa ozi m, nwere onye na-ekpe ya ikpe. Okwu nile m kwuru ka a ga-eji kpee ya ikpe.
49
Okwu ndị a esiteghị nꞌaka m. Ha sitere nꞌaka Nna m onye zitere m. Ọ bụ ya na-agwa m ihe m na-ekwu.
50
Amakwara m na iwu ya naeweta ndụ ebighị ebi. Ya mere, ihe ọ bụla ọ gwara m ka m na-ekwu.”
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21