bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 14
John 14
Igbo 1988
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 15 →
1
“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m.
2
Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha.
3
Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ.
4
Unu maara nke ọma ebe m na-aga.”
5
Ma Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ahụ?”
6
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
7
Ọ bụrụ na ị maara onye m bụ, ị ga-amatakwa Nna m. Site taa unu amatala ya. Unu ahụkwala ya.”
8
Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị ọ bụrụ na i zi anyị Nna ahụ afọ ga-eju anyị.”
9
Jisọs zara ya sị, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ̀ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna ahụ. Gịnị mere i ji na-asị m, ‘Zi m Nna ahụ?’
10
Ọ bụ na i kweghị na m nọ nꞌime Nna m, na Nna m nọkwa nꞌime m? Okwu nile m na-ekwu esitekwaghị nꞌebe m nọ pụta. Ha bụ okwu nke Nna m. Nna m bi nꞌime m na-arụkwa ọrụ ya nꞌọnwe ya.
11
Kwere ihe m gwara gị. Ebi m nꞌime Nna m, Nna m bikwa nꞌime m. Ọ bụrụ na i kwereghị okwu ọnụ m, kwere nꞌihi ọrụ ndị a nile m na-arụ.
12
“Nꞌeziokwu, ana m agwa unu sị, onye ọ bụla tụkwasịrị m obi ga-enwe ike mee ihe ndị a nile. Ọ ga-enwekwa ike ime karịa ihe ndị a nꞌihi na m na-alakwuru Nna m.
13
Ihe ọ bụla unu gaarịọ site nꞌaha m, aga m enye unu ya. Aga m enye ya ka e site na ya nye Nna m otuto nꞌihi ihe Ọkpara ya na-eme.
14
Ihe ọ bụla unu rịọrọ nꞌaha m, aga m eme ya.
15
“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu debe ihe nile m nyere unu nꞌiwu.
16
Aga m arịọ Nna m ka o zitere unu Onye nkasịobi, onye ga-anọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi. Onye a ga-abụ Mmụọ nke eziokwu.
17
Ndị bi nꞌụwa agaghị anabata ya, nꞌihi na ha apụghị ịhụ ya anya. Ha amakwaghị ya. Ma unu onwe unu maara ya, nꞌihi na unu na ya nọ ugbu a. O bikwa nꞌime unu.
18
Agaghị m ahapụ unu ka unu nọdụ nanị unu. Aga m abịakwutekwa unu.
19
Na mgbe na-adịghị anya site ugbu a, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu onwe unu ga-ahụ m anya. Nꞌihi na m na-adị ndụ unu onwe unu gaadịkwa ndu.
20
Mgbe ụbọchị ahụ bịara, ihe nile ga-edo unu anya. Unu ga-amata na m nọ nꞌime Nna m na unu nọkwa nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime unu.
21
Onye na-anabata ihe m nyere nꞌiwu ma na-edebekwa ya bụ onye hụrụ m nꞌanya. Onye hụrụ m nꞌanya ka Nna m ga-ahụ nꞌanya. Aga m ahụkwa ya nꞌanya gosikwa ya onwe m.”
22
Judas (ọ bụghị nke raara ya nye) sịrị ya, “Onyenwe ayị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”
23
Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m nꞌanya, ọ ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nꞌanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nꞌebe onye ahụ nọ soro ya biri.
24
Onye na-ahụghị m nꞌanya agaghị edebe okwu m. Okwu nile unu nụrụ nꞌọnụ m abụghị nke m. Ha bụ okwu Nna m, onye zitere m.
25
Agwala m unu ihe ndị a ugbu a mụ na unu nọ.
26
Ma Onye nkasịobị ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nꞌaha m, ga-ezi unu ihe nile. Ọ gaechetara unu ihe nile m gwara unu.
27
“Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
28
Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m.
29
Ana m agwa unu ihe ndị a mgbe ihe ọ bụla na-emebeghị, ka ọ bụrụ na mgbe o mere unu ga-enwe okwukwe.
30
“Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nꞌihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. Ọ nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe m nọ.
31
Ọ na-abịa ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nꞌanya. Ka ụwa matakwa na m na-eme ihe Nna m nyere m nꞌiwu ime. Bilienụ ka anyị si nꞌebe a pụọ.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21