bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 17
John 17
Igbo 1988
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 18 →
1
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, o legidere anya nꞌeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola. Biko, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.
2
I nyela ya ike nꞌebe mmadụ nile dị. Ee, i nyekwara ya ike nꞌebe ihe nile e kere eke dị, na ike inye ndị nile i nyere ya ndụ ebighị ebi.
3
Nke a bụkwa ụzọ ndụ ebighị ebi ahụ. Ka mmadụ mata na ọ bụ nanị gị bụ Chineke nꞌezie, ka ha matakwa na Jisọs Kraịst bụkwa onye ahụ i zitere nꞌụwa.
4
Enyela m gị otuto nile nꞌime ụwa a, ya mere arụsịrị m ọrụ nile ị chọrọ ka m rụọ.
5
Ma ugbu a, Nna m, mee ka otuto gị pụta ìhè nꞌahụ m ugbu a m guzo nꞌihu gị. Otuto ahụ m nwererị nꞌime gị mgbe a na-atọbeghị ntọ ala ụwa a.
6
“Ezila m ndị a ihe nile banyere gị. Gị onwe gị nyere m ha site nꞌụwa. Ha nile bụkwa nke gị. Ma ugbu a, i nyere m ha ka ha bụrụ nke m. Ha debekwara okwu gị nile.
7
Nꞌihi nke a ha maara na ihe nile i nwere bụ nke m. Ihe nile m nwere bụkwa nke gị.
8
Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m ka m nye ha. Ha anabatala ya, ghọta ya, jidesiekwa ya ike. Ha aghọtala na mụ onwe m si nꞌebe ị nọ bịa nꞌụwa. Ha kweere na m si nꞌebe ị nọ bịa, na ọ bụkwa gị onwe gị zitere m.
9
“Ugbu a ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a nile i nyere m. Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị nọ nꞌụwa. Kama ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a i nyere m, nꞌihi na ha bụkwa ndị nke gị.
10
Ndị nke gị nile bụkwa ndị nke m. Ha nile nꞌotu nꞌotu bụkwa otuto m.
11
Ma ugbu a ọ fọdụrụ nwa oge nta ka m hapụ ụwa. Aga m ahapụkwa ha nꞌụwa bịakwute gị. Biko Nna dị nsọ, site nꞌike dị nꞌaha gị chebe ndị nile i si nꞌụwa nye m, ka ha bụrụ otu dị ka mụ na gị siri bụrụ otu.
12
Mgbe mụ na ha nọ nꞌụwa echebere m ha site nꞌaha gị nke i nyere m. O nwekwaghị onye ọ bụla nꞌime ha lara nꞌiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa ọkụ ala mmụọ, dị ka akwụkwọ nsọ siri gbaa ama banyere ya.
13
“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị. Ma ana m ekwu ihe ndị a nꞌụwa ugbu a mụ na ha nọ, ka ha jupụta nꞌọṅụ m.
14
Enyela m ha okwu gị. Ma nꞌihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nꞌihi na ha sitere nꞌomenala ndị ụwa pụọ. Dị ka m si pụọkwa nꞌomume ọjọọ nile nke ụwa.
15
Ekpeghị m ekpere ka i wepụ ha nꞌụwa, kama ana m achọ ka i debe ha nke ọma. Ka ha ghara ịdaba nꞌaka onye ụrụala ahụ bụ ekwensu.
16
Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị nke ụwa.
17
Biko mee ha ka ha dị ọcha dịkwa nsọ site nꞌịnagide ozizi gị nile nꞌihi na ha bụ eziokwu.
18
Dị ka i siri zite m nꞌụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nꞌụwa.
19
Ọ bụkwa nꞌihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ nꞌime eziokwu ahụ.
20
“Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị a nanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nꞌihi ndị nile ga-ekwere na mụ, nꞌoge dị nꞌihu, site nꞌama ndị a ga-agba banyere m.
21
Isi ekpere m nꞌihi ha bụ ka ha nile nwee otu obi na otu mkpebi banyere ihe nile ha ga-eme, dị ka mụ na gị si nwekọọ. Nna, ee, dị ka gị onwe gị dị nꞌime m, dị ka mụ onwe m dịkwa nꞌime gị, achọrọ m ka ndị nile kweere na m nọgide nꞌime anyị. Mgbe ahụ ndị nile nọ nꞌụwa ga-esite nꞌomume dị otu a mata na gị onwe gị zitere m.
22
“Enyere m ha otuto i nyere m. Otuto ga-eme ka ha nile bụrụ otu dị ka anyị dịkwa.
23
Mgbe ahụ aga m ebikwa nꞌime ha, gị onwe gị ga-ebikwa nꞌime m. Anyị na ha ga-abụrụ ndị e jikọtara nꞌotu. Ụwa ga-esikwa otu a mata na gị onwe gị zitere m. Ha gaamatakwa na ị hụrụ ndị nile kweere na m nꞌanya, dị ka ị hụrụ m nꞌanya.
24
Biko Nna m, achọrọ m ka ndị nile kweere na m soro m bikọọ nꞌotu ebe. Ndị ahụ nile i nyere m site nꞌụwa, achọrọ m ka ha hụ otuto m nile, nke i nyere m site nꞌịhụnanya gị, nke i nwere nꞌebe m nọ malite na ntọ ala nke ụwa a.
25
“Nna onye ezi omume, nꞌezie, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Otu aka ahụ, ndị nile na-eso ụzọ m maara gị. Ha matakwara na ọ bụ gi zitere m.
26
Emeela m ka ha mata onye ị bụ. Aga m agakwa nꞌihu na-egosi ha ihe omimi nile dị nꞌime gị, tutuu ruo mgbe a ga-eme ka ịhụnanya i nwere nꞌebe m nọ dịgide nꞌime ha, tutuu ruo mgbe m ga-ebikwa nꞌime ha.”
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21