bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
John 20
John 20
Igbo 1988
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 21 →
1
Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị, Meri Magdalin bịara nꞌili ebe e liri Jisọs, hụ na e nupụla nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ.
2
Ọ laghachiri azụ chọta Saimọn Pita na Jọn gwa ha sị, “Ha esitela nꞌime ili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Amaghị m ebe ha bujere ha.”
3
Pita na Jọn jiri ọsọ rute nꞌili ahụ.
4
Ma Jọn gbakarịrị Pita nꞌọsọ buru ụzọ ruo nꞌili ahụ.
5
Ma ọ banyeghị nꞌime ya, kama o nyonyere anya nꞌime ya hụ akwa e ji lie Jisọs ka ha ghasara nꞌala.
6
Mgbe Saimọn Pita rutere, ọ banyere nꞌime ili ahụ. Ọ hụkwara akwa e ji kechie ozu Jisọs ka ha gbasara nꞌala.
7
Akwa e ji kechie isi Jisọs dị otu ahụ ọ dị mgbe e kere ya nꞌisi Jisọs na mbụ.
8
Jọn nꞌonwe ya banyekwara hụ ihe ndị a nile, kwerekwa na Jisọs esitela nꞌọnwụ bilie nꞌezie.
9
Tutuu ruo mgbe ahụ, Jọn aghọtaghị na akwụkwọ nsọ kwuru na Jisọs ga-esi nꞌọnwụ bilie ọzọ. Ọ bụ ugbu a ka ha matara.
10
Mgbe Pita na Jọn hụsịrị ihe ndị a, ha laghachiri nꞌụlọ.
11
Ma Meri lọghachiri, nọgide nꞌili ahụ. O guzoro nꞌakụkụ ya na-akwa akwa. Mgbe ọ nọ na-akwa akwa, o hulatara ala nyoo anya nꞌime ili ahụ.
12
Ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha. Otu nọdụrụ ala nꞌebe ụkwụ Jisọs dị mgbe ọ tọgbọ nꞌili ahụ. Nke ọzọ nọdụkwara ebe isi ya dị.
13
Ndị mmụọ ozi ahụ jụrụ Meri ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji akwa akwa?” Meri zara ha sị, “Ọ bụ nꞌihi na ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.”
14
Mgbe Meri kwusịrị okwu a, ọ tụgharịrị hụ otu onye guzo ya nꞌazụ. Onye a bụ Jisọs, ma Meri amaghị na ọ bụ ya.
15
Jisọs jụrụ Meri ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji akwa akwa? Onye ka ị naachọ?” Ebe Meri chere na Jisọs bụ onye na-elekọta ogige ahụ, Meri zara sị ya, “Biko, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ Onyenwe m, gwa m. Gosi m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.”
16
Jisọs kpọrọ Meri aha sị, “Meri!” Meri tụgharịrị tie mkpu sị, “Onyenwe m!”
17
Jisọs sịrị ya, “Emetụla m aka nꞌihi na alakwurubeghị m Nna m nꞌeluigwe. Kama gaa chọta ụmụnna m gwa ha na m na-alakwuru Nna m na Nna unu. Ana m alakwuru Chineke m na Chineke unu kwa.”
18
Meri Magdalin hapụrụ ebe ahụ gbara ọsọ gaa chọta ndị na-eso ụzọ Jisọs sị ha, “Ahụrụ m Onyenwe anyị!” O zikwara ha ozi Jisọs ziri ha.
19
Nꞌanyasị ụbọchị ahụ ndị na-eso ụzọ Jisọs zukọtara nọdụ nꞌime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ nile e si abata nꞌụlọ ahụ nꞌihi na ha na-atụ egwu ihe ndị isi ndị Juu ga-eme ha. Ma na mberede, mgbe ha na-atụghị anya ya, Jisọs batara guzo nꞌetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!”
20
O gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nꞌihi na ha ahụla Onyenwe ha.
21
Ọzọ kwa Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu. Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.”
22
Mgbe ahụ o kusara ha ume sị ha, “Natanụ Mmụọ Nsọ.
23
Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharala onye ahụ. Ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara onye ahụ mmehie ya, a gaghị agbaghara onye ahụ.”
24
Ma Tọmọs onye a na-akpọ Didimọs otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs, anọghị ya mgbe Jisọs bịara.
25
Mgbe ndị ọzọ gwara ya na ha ahụla Jisọs, o kweghị. Ọ sịrị, “Ọ bụ nanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ntu kpọpuru ya aka. Ọ bụ nanị mgbe m tinyere aka m nꞌapa ntu ndị a, ọ bụkwa nanị mgbe m tinyere aka m nꞌakụkụ ya ebe a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere na o sitela nꞌọnwụ bilie.”
26
Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nꞌetiti ha. E mechisịrị ụzọ nile. Na mberede, Jisọs batara guzo nꞌetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
27
Ọ gwara Tọmọs sị ya, “Rụnye mkpịsị aka gị nꞌapa ntu dị m nꞌaka, tinyekwa aka gị nꞌakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe kama kwere!”
28
Tọmọs tiri mkpu sị, “Onyenwe m na Chineke m!”
29
Ma Jisọs zara sị ya, “I kweere ugbu a nꞌihi na i ji anya gị hụ. Ma ngọzi dịịrị ndị na-ahụghị m ma kwere.”
30
Ọ dị ọtụtụ ọrụ ebube ọzọ Jisọs rụrụ nke ndị na-eso ụzọ ya hụrụ. Ma edeghị ha nꞌime akwụkwọ a.
31
Kama e dere ihe ndị a nile ka unu site nꞌịgụ ya kwere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ka unu kwere na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụrụ na unu ekwere, unu ga-enwe ndụ ọhụrụ site nꞌaha ya.
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21