bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 11
Matthew 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 12 →
1
Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ, bido na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche izisa ozi ọma.
2
Jọn omee baptizim nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube nile Jisọs na-arụ, o ziri ndị na-eso ụzọ ya ozi ka ha gaa jụọ Jisọs ajụjụ sị,
3
“Ọ̀ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ya, ka ọ dị onye ọzọ anyị kwesịrị ile anya ọbịbịa ya?”
4
Jisọs gwara ndị ahụ Jọn zitere okwu sị, “Laghachikwanụ azụ gwa Jọn ihe banyere ọrụ ebube unu hụrụ m na-arụ.
5
Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ dị ndị ekpenta ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, kwuokwa okwu ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ Jọn ihe banyere ozi ọma a na-ezisara ndị ogbenye.
6
Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzi na-adịrị ndị na-enweghị obi abụọ nꞌebe m nọ.”
7
Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nꞌọzara ileta Jọn gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị?
8
Ka ùnu lere anya ịhụ onye yi uwe ndị eze? Ndị na-eyi uwe ndị eze bi nꞌobi eze.
9
Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ onye amụma? Ọ bụrụ otu a, unu hụrụ onye karịrị onye amụma.
10
Nꞌihi na Jọn bụ onye ahụ e kwuru ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Lee ana m ezite onyeozi m nꞌihu gị onye ga-edoziri gị ụzọ.’
11
“Nꞌezie, ọ dịghị nwoke ọ bụla nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe dị ukwuu karịa Jọn.
12
Site nꞌoge Jọn omee baptizim malitere izisa ozi ọma ruo ugbu a, ndị ụwa ji ike na-egbochi ọganihu alaeze eluigwe. Ma ọ bụkwa nanị ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na-eji ike abanye nꞌime ya.
13
Nꞌihi na tupu Jọn abịa, Mosisi na ndị amụma nile kwuru okwu banyere alaeze a.
14
Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ihe iwu ahụ na ndị amụma kwuru, Jọn bụ Ịlaịja ahụ, nke ha gbara ama na ọ ga-abịa.
15
Ọ bụrụ na unu nwere ntị ịnụ ihe, nụrụnụ okwu a.
16
“Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nꞌọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nꞌama, ndị na-asị ibe ha,
17
‘Anyị na-afụrụ unu opi, ma unu ekweghị ite egwu. Anyị na-abụrụ unu abụ ili ozu, ma unu akwaghị akwa.’
18
Jọn bịara nọọ nꞌetiti unu, o soghị unu rie nri, o sokwaghị unu ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Nꞌihi nke a unu sịrị na Jọn bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị.
19
Ma Nwa nke mmadụ bịara soro ndị mmadụ na-eri nri, na-anụkwa ihe ọṅụṅụ, ma gịnị ka unu na-ekwu banyere m? ‘Lee onye na-eri oke nri, na onye oke aṅụmaṅụ abịala!’ Unu na-akpọkwa m enyi ndị ọnaụtụ, na enyi ndị mmehie. Otu ọ dị, e sitela nꞌọrụ ọma a rụpụtara gosi na ụzọ ọ bụla Chineke si arụ ọrụ ya ziri ezi.”
20
Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọcha obodo nile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, nꞌihi na obodo ndị a echegharịghị bịakwute Chineke.
21
“Ahụhụ dịrị gị obodo Korazin, ahụhụ dịkwara gị obodo Betsaida, nꞌihi na a si na ọ bụ nꞌime obodo Taịa na Saịdọn ka m rụrụ ọrụ ebube nile m rụrụ nꞌime unu, ha gaara echegharị gosi nchegharị ha site nꞌiyi uwe nkịkara, na ikpokwasị onwe ha ntụ nꞌisi.
22
Nꞌezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn.
23
Ọ bụ ezie na gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, ma ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nꞌime gị nꞌobodo Sodọm, agaraghị ala ya nꞌiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa.
24
Nꞌezie, ọ ga-adịrị gị njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sodọm.”
25
Nꞌoge ahụ, Jisọs kpere ekpere sị, “Nna, Onyenwe igwe na ala, ekelee m gị, nꞌihi na i zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.
26
Ee, Nna, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nꞌụzọ dị otu a.
27
“Nna m enyefeela m ihe nile nꞌaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.
28
Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike.
29
Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site nꞌaka m. Nꞌihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nꞌobi. Unu ga-achọtakwara obi unu izuike.
30
Nꞌihi na ụzọ m dị mfe, ibu m ga-ebokwasịkwa unu adịghị arọ.”
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28