bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 6
Matthew 6
Igbo 1988
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 7 →
1
“Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe.
2
Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị ogbenye onyinye, nꞌihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-achọ ka ndị mmadụ too ha.
3
Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, mmenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.
4
Chineke bụ Nna gị, onye maara ihe nzuzo nile, ga-akwụghachi gị ụgwọ zuru ezu.
5
“Mgbe ọ bụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ịhụ abụọ, ndị na-ekpe ekpere nꞌakụkụ ụzọ na nꞌime ụlọ ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha nụkwa ekpere ha, kwuo na ha bụ ndị dị nsọ. Nꞌezie, otuto a bụ nanị ụgwọ ọrụ ha ga-anata.
6
Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nꞌime ime ụlọ unu, Mechiekwanụ ụzọ unu, kpeere Chineke Nna unu ekpere na nzuzo. Ọ maara ihe nzuzo nke obi unu nile. Ọ ga-azakwa ekpere unu, nyekwa unu ụgwọ ọrụ ruuru unu.
7
“Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwkwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na Chineke ga-anụ ekpere ha nꞌihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọ bụla, Nna unu bi nꞌeluigwe mmara ihe na-akpa unu.
9
“Sinụ otu a kpee ekpere: Nna anyị nke bi nꞌeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.
10
Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nꞌụwa, dị ka e si eme ya nꞌeluigwe.
11
Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
12
Gbaghara anyị mmehie anyị, dị ka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.
13
Edubala anyị nꞌime ọnwụnwa, kama zọpụta anyị site nꞌọnwụnwa nke onye iro. Amin.
14
Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu.
16
“Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha.
17
Ma mgbe unu na-ebu ọnụ, dịnụ mma ile anya.
18
Ka mmadụ ọ bụla hapụ ịmata na unu na-ebu ọnụ. Nna unu, onye maara ihe nile, ga-akwụghachikwa unu ụgwọ.
19
“Unu akpadola akụ nꞌụwa nꞌihi na akụ a kpadoro nꞌụwa a pụrụ ịta ajarị, nla pụrụ iri ha, ndị ohi pụkwara izu ha.
20
Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
22
“Anya unu dị ka iheọkụ nke anụ ahụ unu. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, obi gị ga-ejupụta nꞌìhè.
23
Ma ọ bụrụ na echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ gị ekpuchie anya gị, gbochie ya ịbụrụ gị ìhè, ị ga-anọ nꞌọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adịkwa ukwuu!
24
“Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ.
25
“Nꞌihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ uwe unu ga-eji kpuchie ahụ unu. Ndụ karịrị ihe e ji azụ ya.
26
Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịma atụ. Ha adịghị echegbu onwe ha banyere ihe oriri. Ọ dịghị mgbe ha na-akụ mkpụrụ nꞌubi ọ dịkwaghị mgbe ha na-ewe mkpụrụ nꞌubi. Ma Nna unu bi nꞌeluigwe na-azụ ha. Ọ̀ bụ na unu adịghị oke ọnụ ahịa karịa ha?
27
Ònye nꞌetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nꞌogologo ụbọchị nke ndụ ya site nꞌichegbu onwe ya?
28
“Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ Hoge nile maka uwe? Leenụ okoko osisi ọhịa. Ha adịghị echegbu onwe ha maka uwe.
29
Ma asị m unu na ọ bụladị Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya nile, eyighị uwe ọ bụla dị mma dị ka okoko osisi ọhịa ndị a.
30
Ya mere, ọ bụrụ na Chineke sitere nꞌebere ya mee ka okoko osisi ndị a maa mma ile anya, bụ okoko osisi dị ndụ taa, nke pụkwara ịkpọnwụ mgbe chi echi bọrọ, gịnị mere unu jiri chee na ọ gaghị emere unu karịa nke a, unu ndị okwukwe nta?
31
“Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?
32
Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.
33
Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.
34
“Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere ihe na-aga ime echi. Ọ bụrụ na Chineke emee ka ị dịrị ndụ taa, ọ ga-azụkwa gị echi.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28