bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 2
Matthew 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 3 →
1
A mụrụ Jisọs na Betilehem nke Judia nꞌoge Herọd bụ eze. Mgbe ahụ, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịara na-ajụ ajụjụ sị,
2
“Ebee ka a nọ mụọ eze ọhụrụ ndị Juu ahụ? Anyị hụrụrị kpakpando ya nꞌọwụwa anyanwụ. Ugbu a anyị bịara ka anyị kpọọ isi ala nye ya.”
3
Ajụjụ ha wutere Herọd nke ukwuu. O jukwara ndị nile bi na Jerusalem anya.
4
Herọd kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu jụọ ha sị, “Ebee ka ndị amụma kwuru na a ga-anọ mụọ Onye nzọpụta ahụ?”
5
Ha zara sị ya, “Betileham, nꞌala Judia! Nꞌihi na Maịka onye amụma dere sị,
6
‘Ọ̀ bụ ezie na ị dị nta gị obodo nta Betileham, ma ị bụ obodo dị mkpa na Judia, nꞌihi na ọ bụ site na gị ka onye ga-achị ndị m Izirel ga-esi pụta.’ ”
7
Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụọ ha oge ha hụrụ kpakpando ahụ.
8
Emesịa, ọ sịrị ha. “Gaanụ Betileham chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isi ala nye ya.”
9
Mgbe Herọd gwasịrị ha okwu ndị a, ndị amamihe ahụ pụrụ. Nꞌezi, ha hụrụ kpakpando ahụ ọzọ, nke ha buru ụzọ hụ, ka o guzo na mbara eluigwe obodo Betilehem.
10
Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu!
11
Ha jeruru Betilehem, banye nꞌụlọ ebe nwantakịrị ahụ na nne ya nọ, daa nꞌala kpọọ isi ala nye nwa ọhụrụ ahụ. Ha meghere akpa ha nye ya onyinye ọlaedo, ọkpụrụkpụ eso osisi abụọ na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na maar.
12
Mgbe ndị amamihe a chọrọ ịlaghachi obodo ha, ha esikwaghị Jerusalem ịkọrọ Herọd ihe ha hụrụ. Nꞌihi na Onyenwe anyị nyere ha iwu na nrọ sị ha site ụzọ ọzọ laa.
13
Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Chineke mere ka Josef hụ ya na nrọ. O nyere Josef iwu sị, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipti. Alọghachila tutuu ruo mgbe m ga-agwa gị, nꞌihi na Herọd na-achọ igbu nwantakịrị a.”
14
Nꞌabalị ahụ, Josef mere ngwangwa kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipti.
15
Ebe ahụ ka ha nọgidere tutuu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nꞌọnụ onye amụma mezuo, “Ọ bụ site nꞌIjipti ka m kpọpụtara nwa m.”
16
Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ alọghachighị kọọrọ ya ihe ha hụrụ. Nꞌihi ya o zipụrụ ndị agha ya ka ha gaa Betilehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị nile nọ nꞌobodo ndị a, bụ ndị gbara site nꞌafọ abụọ rịda, nꞌihi na ndị amamihe ahụ gwara ya rị na ha hụrụ kpakpando ahụ afọ abụọ gara aga.
17
E sitekwara nꞌiwu a Herọd nyere mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,
18
“Ịkwa akwa na iru uju dị nꞌobodo Rema. Rechel na-akwa akwa nꞌihi ụmụ ya. Ọ dịghị nkasịobi ọ bụla dịrị ya nꞌihi na e gburu ha.”
19
Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nꞌobodo Ijipti sị ya,
20
“Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi Izirel nꞌihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.”
21
Josef biliri malite ịlaghachi Izirel, ya na Jisọs na nne ya.
22
Mgbe ha nọ nꞌụzọ, Josef nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd bụ nwa ya a na-akpọ Akelus. Nke a mere ụjọ ji tụọ Josef ịlaghachi Betilehem. Ma na nrọ ọzọ, Chineke dọrọ ya aka na ntị ka ọ hapụ ịlaghachi Judia, kama ka ọ laa Galili.
23
Mgbe o ruru Galili, ha gara biri nꞌobodo nta Nazaret. Site nꞌụzọ dị otu a, ihe ndị amụma kwuru banyere Onye nzọpụta mezuru. Nꞌihi na ha buru amụma sị, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28