bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 14
Matthew 14
Igbo 1988
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 15 →
1
Ọ bụ nꞌoge a ka Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs.
2
Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. Ọ ga-abụ na o sitela nꞌọnwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube ndị a.”
3
Nꞌihi na, na mbụ, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ, maka ime ka obi tọọ nwụnye ya Herodias ụtọ. Herodias bụ rịị nwụnye Filip nwanne Herọd. Ma Herọd mere ka Herodias site nꞌaka Filip gbapụta bịa bụrụ nwụnye nke ya.
4
Herọd jidere Jọn nꞌihi na Jọn gwara ya na o zighị ezi ka ọ lụọ Herodias nwụnye nwanne ya.
5
Herọd chọrịrị igbu Jọn, ma ọ tụrụ egwu na obi agaghị atọ ndị Juu ụtọ, nꞌihi na mmadụ nile kweere na Jọn bụ onye amụma.
6
Ma otu ụbọchị, mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herọd, nke Herodias mụtara, tere egwu nꞌihu nna ya Herọd, na nꞌihu ndị ọbịa bịara nꞌụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu.
7
Nke a mere o ji ṅụọ iyi gwa ada ya okwu sị, “Ana m aṅụ iyi na-asị na m ga-enye gị ihe ọ bụla ị rịọrọ m.”
8
Nwagbọghọ ahụ gara jụọ nne ya ihe ọ ga-arịọ nna ya. Mgbe nne ya gwasịrị ya ihe ọ ga-arịọ, ada Herọd lọghachiri gwa nna okwu sị ya, “Achọrọ m ka i nye m ugbu a, nꞌime efere, isi Jọn omee baptizim.”
9
Arịrịọ a wutere Herọd, nye ya nsogbu nꞌobi. Ma ebe ọ bụ na ọ ṅụrụ iyi nꞌihu ndị ọbịa ya nile, ọ chọghị ịla azụ nꞌokwu ya. O nyere iwu ka e meere ada ya ihe ọ chọrọ.
10
Ya mere, a gara nꞌụlọ mkpọrọ gbupụ Jọn isi.
11
E tinyere isi ya nꞌefere bunye nwagbọghọ ahụ. Ada Herọd naara ya bulaara nne ya.
12
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn omee baptizim nụrụ otu o si nwụọ, ha bịara buru ozu ya gaa lie ya. Emesịa, ha gara gwa Jisọs ihe nile dị ka o si mee.
13
Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma igwe mmadụ ndị si obodo dị iche iche nụrụ ya soro ya, kama ha si ụzọ elu ala jeruo ebe ọ nọ.
14
Mgbe Jisọs sitere nꞌụgbọ mmiri ahụ wụda, ọ hụrụ igwe mmadụ ndị a ka ha nọ na-eche ha.
15
Nꞌoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji, ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nꞌọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nꞌime obodo zụọra onwe ha nri.”
16
Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.”
17
Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụ nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ ka anyị nwere.”
18
Jisọs sịrị ha, “Wetara m ha.”
19
Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nꞌahịhịa. O weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu, rịọ Chineke ka ọ gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ.
20
Onye ọ bụla rijuru afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe beredi dara nꞌala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ.
21
Ọ bụkwa puku dimkpa ise ka Jisọs nyere nri nꞌụbọchị ahụ. A gụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụaka nile, ndị soro rie nri a.
22
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbụ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ.
23
Mgbe ndị a lara, Jisọs rigooro nꞌugwu ikpe ekpere, nanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, Jisọs nọkwa nꞌugwu ahụ na-ekpe ekpere, nanị ya.
24
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs ruru nꞌetiti osimiri, ebili mmiri dị egwu malitere ịmali elu, na-ebugharị ụgbọ mmiri ahụ, nꞌihi na ifufe na-efesi ike.
25
Ma ihe dị ka site nꞌelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, ma ọ bụkwa nꞌelu osimiri ahụ ka ọ na-aga ije.
26
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-abịa, oke egwu jidere ha. Ha tiri mkpu sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha chere na Jisọs bụ mmụọ.
27
Ma Jisọs sịrị ha, “Unu atụla egwu! Ọ bụ m.”
28
Mgbe ha hụrụ na ọ bụ Jisọs nꞌezie, Pita pụtaziri gwa Jisọs okwu sị ya, “Onyenwe anyị, ebe ọ bụ gị nꞌezie, biko, nyenụ iwu nke ga-eme ka m bịakwute gị.”
29
Onyenwe anyị sịrị Pita, “Bịaa!” Pita sitere nꞌụgbọ pụta bido ịga ije nꞌelu mmiri ijekwuru Jisọs.
30
Ma mgbe Pita hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị, ụjọ tụrụ ya. O bidokwara imikpu nꞌime mmiri ahụ. Nꞌihi nke a o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!”
31
Na-atụfụghị oge, Jisọs setipụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ gwara Pita okwu sị ya, “Lee ka okwukwe gị siri dị nta! Gịnị mere i ji nwee obi abụọ?”
32
Ha abụọ banyere nꞌụgbọ mmiri ahụ. Ma mgbe ha banyere nꞌụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara.
33
Ndị ahụ ya na ha so nọdụ nꞌụgbọ ahụ kpọrọ isi ala nye ya sị, “Nꞌezie, ị bụ Ọkpara Chineke!”
34
Ha gafere osimiri ahụ jeruo Genesaret.
35
Ngwangwa akụkọ ọbịbịa ha gbasara ebe nile nꞌobodo ahụ. Ndị mmadụ bidoro ịgbagharị na-agwa ibe ha ka ha dute ndị ọrịa ha ka Jisọs gwọọ ha Ọtụtụ mmadụ kpọtara ndị ahụ na-esighị ike.
36
Ha rịọrọ Jisọs ka o kwenye ka ndị ọrịa a metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị nile metụrụ ya aka ka a gwọrọ.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28