bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 23
Matthew 23
Igbo 1988
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 24 →
1
Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ nile na ndị na-eso ụzọ ya okwu sị,
2
“Ndị ozizi iwu na ndị Farisii bụ ndị e nyere ike ịkọwa iwu Mosisi.
3
Ya mere, meenụ ihe nile ha si unu mee. Ma nke kachasị nke, unu esokwala omume ha. Nꞌihi na adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ.
4
Ha na-ebokwasị unu iwu nke mmadụ na-apụghị idebe, ma ha onwe ha adịghị agbalị idebe iwu ndị a.
5
“Ihe nile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ too ha. Ha na-ejegharị dị ka ndị dị nsọ. Leenụ ka igbe ha kekwasịrị nꞌegedege ihu ha na nꞌaka ha siri buo ibu. Igbe ebe ha tinyere amaokwu ha depụtara site nꞌakwụkwọ nsọ!
6
Ha hụrụ ịnọdụ nꞌisi oche nꞌoge oriri nꞌanya.
7
Ọ na-atọ ha ụtọ mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche, nꞌakụkụ ụzọ ma ọ bụ nꞌahịa. Ọ na-atọkwa ha ụtọ mgbe a na-akpọ ha ‘Onye ozizi, Onye ozizi.’
8
Unu ekwela ka onye ọ bụ kpọọ unu aha dị otu a. Nꞌihi na ọ bụ nanị Chineke bụ onye ozizi unu nwere. Unu nile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu.
9
Unu akpọkwala onye ọ bụla nꞌụwa a Nna, nꞌihi na ọ bụ nanị Chineke dị nꞌeluigwe ka unu nwere dị ka Nna unu.
10
Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nꞌihi na ọ bụ nanị otu onyendu ka unu nwere, onye bụ Onye nzọpụta ahụ.
11
“Onye dị ukwuu nꞌetiti unu kwesịrị ịbụ onye na-ejere unu ozi.
12
Ma onye ọ bụla mere onwe ya onwe ukwu ka a ga-eweda nꞌala. Ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.
13
“Ahụhụ dịrụ unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha gasi bata nꞌalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata, unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ịbata. Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-eme dị ka ndị dị nsọ site nꞌikpe ogologo ekpere nꞌakụkụ ụzọ nile ka mmadụ hụ unu. Ma unu na-eripịa akụ dị nꞌụlọ ndị inyom di ha nwụrụ. Unu ga-anata ikpe ọmụma.
15
Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-agbalsị ike nꞌụzọ nile, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee onye ahụ ka ọ jọọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
16
Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru isi! Nꞌihi na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla jiri ụlọ nsọ ukwu Chineke ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọ bụla jiri ọlaedo dị nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ ṅụọ iyi kwesịrị imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’
17
Ndị nzuzu kpuru isi! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọ nsọ ahụ e debere ya ime ya ka ọ bụrụ ihe dị nsọ?
18
Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ nụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọ bụla ga-eji onyinye dị nꞌelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ nụrụ.’
19
Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ̀ bụ onyinye dị nꞌelu ebe ịchụ aja ka ọ̀ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ?
20
Ya mere, mgbe onye ọ bụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nꞌelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ.
21
Otu a kwa, onye ji ụlọ nsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọ nsọ ahụ na Chineke bi nꞌime ya na-aṅụ iyi.
22
Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nꞌelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.
23
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri unu ruo nꞌakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nꞌubi unu, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na ikwesị ntụkwasị obi ihe dị mkpa. Ee, unu kwesịrị inye onyinye unu. Ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe kachasị mkpa.
24
Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda inyinya!
25
“Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nꞌike na ọchịchọ ọjọọ nile.
26
“Gị onye ìsì na-akpọ onwe gị onye Farisii! Buru ụzọ mee ka ime iko na efere gị dị ọcha, mgbe ahụ ha ga-adị ọcha ihu na azụ.
27
“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe mara mma, ma ime ha jupụtara nꞌọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe rere ure nile.
28
Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie.
29
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-ewu ili ndị amụma ahụ nna unu ha gburu, na-atụkwasị okoko osisi nꞌili ahụ e liri ndị ezi omume ahụ nna unu ha gburu.
30
Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nꞌoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wụfuo ọbara ndị amụma.
31
“Site nꞌokwu ọnụ unu unu na-ezipụta onwe unu na unu bụ ụmụ ndị ajọ omume ahụ gburu ndị amụma.
32
Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ọjọọ ahụ ha malitere.
33
Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe ịba nꞌọkụ ala mmụọ?
34
“Ya mere, ana m agwa unu sị, aga m ezitere unu ndị amamihe nd ndị ozizi. Ụfọdụ nꞌime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nꞌobe. Ndị ọzọ kwa ka unu ga-eyipụ uwe ha, tie ha ihe otiti nꞌazụ, nꞌime ụlọ ekpere unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nꞌotu obodo gaa nꞌobodo ọzọ.
35
Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nꞌihi ọbara ndị amụma Chineke nile unu kwafuru, site nꞌọbara Ebel ruo na nke Zakaraya nwa Barakaya, onye unu gburu nꞌetiti ụlọ nsọ na ebe ịchụ aja unu.
36
Nꞌezie, asị m unu, ikpe banyere ihe ndị a nile, nke na-amụba site nꞌoge gara aga, ga-abịakwasị ọgbọ a.
37
“Oo Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị nile Chineke ziteere gị nkume. Ugbu ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị ọnụ dị ka nne ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya nꞌokpuru nku ya ichebe ha, ma ị chọghị ka m mee otu a!
38
Lee ugbu a, a ga-ahapụrụ gị ụlọ gị ka ọ tọgbọrọ nꞌefu!
39
Nꞌihi na asị m gị, na ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ tutuu ruo mgbe i jikeere ịnabata m na ịsịkwa, ‘Ngọzi na-adịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.’ ”
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28