bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 28
Matthew 28
Igbo 1988
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
1
Nꞌisi ụtụtụ Sọnde, mgbe chi na-abọ nke nta nke nta, Meri Magdalini na Meri nke ọzọ, gara ile anya nꞌili ahụ.
2
Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nꞌeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ e nyibere Jisọs, nọkwasịkwa nꞌelu ya.
3
Ihu mmụọ ozi ahụ na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka ogho.
4
Mgbe ndị na-eche ili ahụ nche hụrụ mmụọ ozi a ha tụrụ oke egwu. Ha makwara jijiji, daa nꞌala, nọọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.
5
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ okwu sị ha, “Unu atụla egwu, nꞌihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nꞌelu obe ka unu na-achọ.
6
Ọ nọkwaghị nꞌebe a. O sitela nꞌọnwụ bilie, dị ka ọ gwara unu. Bịanụ lee ebe ha nyibere ahụ ya mgbe ha bubatara ya na mbụ.
7
Gaanụ ngwangwa mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na o sitela nꞌonwụ bilie. O burula unu ụzọ gaa Galili. Ebe ahụ kwa ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”
8
Ụmụ nwanyị ahụ jiri oke egwu na ọṅụ gbara ọsọ gaa izi ndị na-eso ụzọ Jisọs ozi a mmụọ ozi ahụ ziri ha.
9
Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, na mberede, Jisọs zutere ha sị ga, “Ndeewonụ!” Ha nile dara nꞌala nꞌihu ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isi ala nye ya.
10
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Kama gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nꞌebe ahụ.”
11
Mgbe ụmụ nwanyị ahụ nọ nꞌụzọ na-alọghachi, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nꞌime obodo. Ha gara kọọrọ ndị isi nchụaja ihe nile mere.
12
Emesịa, ndị isi nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ego,
13
ka ndị agha ahụ ghaa ụgha sị na ha na-arahụ ụra nꞌabalị ahụ mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs bịara buru ozu ya.
14
Ha kwekwara ndị agha ahụ nkwa sị, “Ọ bụrụ na onyeisi ọchịchị obodo anụ ihe mere, anyị bụ ndị isi nchụaja na ndị okenye obodo ga-anọchite anya unu nꞌihu ya. Unu echegbula onwe unu, nꞌihi na ihe nile ga-adịcha mma.”
15
Ya mere, ndị agha ahụ naara ego e nyere ha. Ha pụrụ kọkwaara ndị Juu nile ihe ndị isi nchụaja na ndị okenye gwara ha. Ụgha ahụ ha ghara gbasara nꞌala ndị Juu nile ruo taa. Ndị Juu nabatakwara okwu ahụ ndị agha ahụ kwuru dị ka eziokwu.
16
Ndị na-eso ụzọ Jisọs iri na otu fọdụrụ gaara nꞌelu ugwu dị na Galili, ebe Jisọs gwara ha na ha ga-achọta ya.
17
Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha kpọrọ isi ala nye ya. Ma ụfọdụ nꞌime ha nwere obi abụọ.
18
Jisọs bịara ha nso, gwa ha okwu sị, “E werela ike nile dị nꞌeluigwe na nꞌelu ụwa nye m.
19
Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.
20
Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe nile, ruo ọgwụgwụ ụwa.”
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28