bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 20
Matthew 20
Igbo 1988
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 21 →
1
“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nꞌisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nꞌubi ya.
2
Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha naịra abụọ nꞌihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nꞌubi ya.
3
“Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, nꞌihe dị ka elekere toolu ụtụtụ, o sitere nꞌebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro na-eche onye ga-akpọ ha ọrụ.
4
Ọ kpọrọ ha ziga ha nꞌubi ya sị ha, ‘Ihe ọ bụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu, mgbe unu rụsịrị ọrụ.’
5
Nꞌelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie ụbọchị ahụ, ọ hụkwara ndị ọzọ, ziga ha nꞌubi ya.
6
“Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu arụghị ọrụ taa?’
7
“Ha zara sị ya, ‘Nꞌihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ Ọ gwara ha sị, ‘Gaanụ soro ndị ọzọ rụọ ọrụ nꞌubi m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’
8
“Nꞌabalị ụbọchị ahụ, nwoke a gwara onye na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ ka ọ kwụọ ha nile ụgwọ. O mekwara ka onye na-akwụ ụgwọ malite nꞌonye ikpeazụ bịara ọrụ nꞌubi ahụ ruo na ndị buru ụzọ bido ọrụ nꞌụtụtụ.
9
Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nꞌelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha naịra abụọ, naịra abụọ.
10
Nꞌihi ya mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nꞌisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha nile naịra abụọ abụọ.
11
“Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamụrụ ntamụ megide nna nwe ụlọ sị,
12
‘Ndị a rụrụ ọrọ nanị otu awa, ma ị kwụrụ ha ụgwọ dị ka anyị bụ ndị rụrụ ọrụ site nꞌụtụtụ ruo anyasị.’
13
“Nna nwe ụlọ zara otu nꞌime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọ bụla. Ọ̀ bụghị gị kwere na ị ga-arụ ọrụ ụbọchị taa nile? Ọ̀ bụghị gị kwekwaara na ị ga-anara naịra abụọ?
14
Were ego gị laa. Ọ bụrụ na m akwụọ mmadụ nile otu ihe ahụ,
15
ọ̀ dị iwu megidere m, nꞌihi na m nyere ego m dị ka m si chọọ? Ị̀ na-ewe iwe nꞌihi na m meere ndị mmadụ ebere?’ ”
16
Jisọs kwukwara sị, “Otu a ka ọ ga-adị, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”
17
Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya gaa nꞌotu akụkụ,
18
kọọrọ ha ihe nile ga-adakwasị ya mgbe ha ruru Jerusalem. Ọ sịrị ha, “A ga-arara m nye nꞌaka ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ha ga-amakwa m ikpe ọnwụ.
19
Ha ga-arara m nye nꞌaka ndị mba ọzọ ndị ga-eji m mee ihe ọchị, ndị ga-apịakwa m ihe, kpọgide m nꞌobe. Ma aga m esite nꞌọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gafere.”
20
Emesịa, nne Jemes na Jọn, ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya bịakwute Jisọs, kpọọ isi ala nye ya, rịọọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha.
21
Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ zara sị, “Nꞌalaeze gị, mgbe ị ga-abụ eze, ị ga-ekwe m nkwa na ụmụ m abụọ ga-anọdụ nso ocheeze gị, otu nꞌaka nri gị, nke ọzọ nꞌaka ekpe gị?”
22
Jisọs zara sị ya, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ ka m meere unu.” O chigharịrị lee Jemes na Jọn anya, jụọ ha ajụjụ sị, “Ùnu pụrụ ịṅụ site nꞌiko a dị oke egwu nke m ga-aṅụ?” Ha zara sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.”
23
Ma Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie unu nwere ike ịṅụ site nꞌiko ahụ, ma ọ dịghị nꞌike aka m ịsị na unu ga-anọ nꞌaka nri m, ma ọ bụ nꞌaka ekpe m. Ọnọdụ dị otu a, nke unu na-arịọ, bụ nke Nna m debere iche nye ndị ọ họpụtara.”
24
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs fọdụrụ nụrụ ihe Jemes na Jọn na-arịọ ka Jisọs meere ha, ha were iwe nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a.
25
Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara ọ gwara ha okwu sị, “Nꞌetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndị isi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nꞌuche. Ndị ukwu nꞌetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nꞌokpuru ha.
26
Ma nꞌetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọ bụla nꞌetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-eburu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu nile ozi.
27
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye dị ukwuu karịa ndị ọzọ, ị ga-ebu ụzọ jeere ha ozi dị ka onye ọrụ e goro ego.
28
Omume unu kwesịrị ịdị ka nke m. Nꞌihi na mụ, Nwa nke mmadụ, abịaghị ka e jeere m ozi, kama abịara m ijere ndị ọzọ ozi na inye ndụ m dị ka aja mgbapụta nꞌọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”
29
Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụsịrị Jeriko, igwe mmadụ sooro ya nꞌazụ.
30
Ndị ìsì abụọ nọ nꞌakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nꞌoke olu na-asi, “Onyenwe anyị, Nwa Devidi, biko meere anyị ebere!”
31
Igwe mmadụ ahụ so Jisọs gbọchiri ha ọnụ, sị ha mechie ọnụ ha. Ma ndị ìsì ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, meere anyị ebere!”
32
Mgbe Jisọs bịaruru nꞌebe ha nọ, o guzoro nꞌụzọ kpọọ ha, jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
33
Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.”
34
Jisọs nwere ọmiko nꞌahụ ha. O metụrụ ha aka nꞌanya. Ngwangwa ha malitere ịhụ ụzọ, bidokwa iso Jisọs.
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28