bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 27
Matthew 27
Igbo 1988
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 28 →
1
Nꞌisi ụtụtụ echi ya, ndị isi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zukọtara. Ha chepụtara ụzọ kachasị mma ha nwere ike isi kwagide Pailet ka ọ maa Jisọs ikpe ọnwụ.
2
Ha tụrụ Jisọs mkpọrọ igwe duru ya nyefee ya Pailet nꞌaka. Pailet bụkwanụ onye nọchiri anya ọchịchị ndị Rom nꞌakụkụ Judia nile nꞌoge ahụ.
3
Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, nụrụ na a mara Jisọs ikpe ọnwụ, o chigharịrị weghachikwara ndị isi nchụaja na ndị okenye ego ahụ ha kwụrụ ya.
4
Ọ gwara ha sị, “Emehiela m, nꞌihi na araara m nwoke na-emeghị ihe ọjọ ọ bụla nye nꞌaka ọnwụ.” Ma ha zara ya sị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ ihe dịrị gị.”
5
Judas tụnyere ego ahụ ha kwụrụ ya nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, pụọ gaa kwụgbuo onwe ya.
6
Ndị isi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nꞌime ụlọ ego anyị, nꞌihi na ọ bụ ego ọbara.”
7
Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara iwere ego ahụ zụta ala nꞌaka otu ọkpụite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa.
8
Nke a mere e ji akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara” ruo taa.
9
Nꞌụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nꞌọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. Nꞌihi na Jeremaya kwuru sị, “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ bụ ọnụ ahia ụmụ Izirel kpebiri na ha ga-akwụ nꞌisi onye ahụ.
10
Ha ji ego ahụ zụọ ala onye ọkpụite, dị ka Onyenwe anyị buru ụzọ gwa m.”
11
Nꞌoge a Jisọs guzo nꞌihu Pailet onye na-achị Judia nile. Pailet jụrụ ya ajụjụ sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs zara sị ya, “Ee, abụ m ya.”
12
Mgbe ndị isi nchụaja na ndị okenye boro Jisọs ebubo ụgha, Jisọs ekwughị ihe ọ bụla iji gọrọ onwe ya.
13
Ya mere, Pailet jụrụ ya sị, “Ị naghị anụ ihe ndị a nile ha na-ebo gị?”
14
Ma Jisọs ekwughị otu mkpụrụ okwu. Nke a juru Pailet anya nke ukwuu.
15
Nꞌoge mmemme ngabiga ọ bụla, ọ bụ omenala na onyeisi ọchịchị obodo na-ahapụrụ ndị Juu otu onye mkpọrọ ndị Juu chọrọ.
16
Ma nꞌoge a e nwere otu nwoke nọ nꞌụlọ mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara, onye aha ya bụ Barabas.
17
Mgbe ndị Juu nile zukọrọ, Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ̀ bụ Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Onye nzọpụta?”
18
Nꞌihi na Pailet maara nke ọma na ndị isi ndị Juu raara Jisọs nye nꞌaka ya site nꞌekworo.
19
Mgbe Pailet nọkwasịrị nꞌelu oche ikpe ya, nwụnye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nꞌisi nwoke ọma ahụ. Nꞌihi na ahụjuru m anya na nrọ nꞌabalị gara aga nꞌihi ya.”
20
Ma ndị isi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọọ Pailet ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya.
21
Pailet jụkwara ha ọzọ sị, “Nꞌime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha nile jiri otu olu sị ya, “Barabas!”
22
Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m jiri Jisọs Onye nzọpụta mee?” Ha nile tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Kpọgide ya nꞌobe!”
23
Pailet jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere?” Ma ha nọgidesịrị ike na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe! Kpọgide ya nꞌobe!”
24
Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọzọ ọ pụrụ ime o kpebiri imere ha ihe ga-eme ka ọgba aghara hapụ ịmalite nꞌetiti ha. O weere mmiri kwọọ aka ya nꞌihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nꞌebe ọbara nwoke a dị. Ihe ọ bụla unu mere ya dị unu nꞌisi.”
25
Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nꞌotu olu sị, “Ee! Ka ọbara ya dị nꞌisi anyị na nꞌisi ụmụ anyị!”
26
Mgbe ahụ Pailet hapụụrụ ha Barabas. Mgbe o tisiri Jisọs ihe o weere ya nyefee nꞌaka ndị agha Rom ka ha kpọgide ya nꞌobe.
27
Ihe isi mbụ ndị agha mere bụ iduru Jisọs baa nꞌebe ndị agha bi. Nꞌebe ahụ ndị agha nile gbara ya gburugburu.
28
Ha yipụrụ Jisọs uwe ya, yikwasị ya uwe na-acha uhie uhie.
29
Ha chịkọtara alaka osisi nwere ogwu kpaara ya okpu. Ha yikwasịrị ya okpu ogwu ahụ nꞌisi, ka ọ bụrụ okpu eze ya. Ha tinyekwara ya osisi nꞌaka, ka ọ bụrụ mkpa nꞌaka eze ya. Mgbe ha mechara ihe ndị a, ha gburu ikpere nꞌala nꞌihu ya. Nꞌọnọdụ ịkwa ya emu ha kelere ya sị ya, “Ka eze ndị Juu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
30
Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri, narakwa ya osisi ahụ tie ya nꞌisi.
31
Mgbe ha mechara Jisọs ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ na-acha uhie uhie, yikwasịkwa ya uwe nke aka ya. Ha duuru ya pụọ, ịkpọgide ya nꞌobe.
32
Mgbe ha du ya na-aga nꞌụzọ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini nke dị nꞌime Afirika. Aha nwoke a bụ Saịmọn. Ndị agha ahụ kwagidere Saịmọn ka o buru obe Jisọs.
33
Emesịa, ha bịarutere nꞌebe a na-akpọ Golgota, nke pụtara, Ebe okpokoro isi.
34
Nꞌebe ahụ ka ndị agha ahụ nyere Jisọs mmanya a gwara ọgwụ ka ọ ṅụọ. Mgbe Jisọs detụrụ ya ire, ọ jụrụ ịṅụ ya.
35
Nꞌikpeazụ, ha kpọgidere Jisọs nꞌelu obe. Ndị agha ahụ fere nza nke ha jiri kee uwe ya nꞌetiti onwe ha.
36
Mgbe ha mesịrị nke a, ha nọgidere nꞌebe ahụ na-eche ya nche.
37
Nꞌelu obe ahụ ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs eze ndị Juu.
38
Ha kpọgidekwara mmadụ abụọ ọzọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nꞌike nꞌobe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌakụkụ aka nri Jisọs. Onye nke ọzọ nꞌakụkụ aka ekpe ya.
39
Ndị mmadụ si ebe ahụ a kpọgidere Jisọs nꞌobe na-agafe nọgidere na-ekwulu ya. Ha na-ekwe nꞌisi na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọ nsọ ukwu Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nꞌelu obe ahụ rịdata!”
41
Ndị isi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme Jisọs ihe ọchị, na-asị ya,
42
“Ọ na-azọpụta ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ị bụkwaghị eze ndị Juu? Ọ dị mma, si nꞌelu obe rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ị bụ Onye nzọpụta.
43
Ọ na-atụkwasị Chineke obi, na-asị na ya bụ Ọkpara Chineke. Ka anyị leenụ ma Chineke ọ ga-azọpụta ya ugbu a!”
44
Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na Jisọs nꞌobe nọkwa na-akparị ya.
45
Nꞌụbọchị ahụ, site nꞌelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nꞌelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachiri obodo Jerusalem nile.
46
Nꞌoge dị ka elekere anọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Elai, Elai, lama sabaktani!” Nke a pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ nanị m nꞌebe a?”
47
Ụfọdụ ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ nụrụ mkpu akwa a sị na ọ bụ Ịlaija ka ọ na-akpọ ka ọ bịa nyere ya aka.
48
Nꞌotu oge ahụ kwa otu onye nꞌime ha gbaara ọsọ were ọza detu ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nꞌosisi, welie ya elu, ime ka Jisọs miri ya ṅụọ.
49
Ma ndị ọzọ sịrị, “Cherenụ ka anyị lee ma Ịlaija ọ ga-abịa ịzọpụta ya.”
50
Mgbe Jisọs jiri oke olu tie mkpu ọzọ, o kubiri ume, nwụọ.
51
Nꞌotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi e ji kebichie ebe nsọ site nꞌebe kachasị nsọ nke ụlọ nsọ ukwu Chineke, gbawara site nꞌelu ruo nꞌala.
52
Ọtụtụ ili meghere. Ọtụtụ ụmụ Chineke, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nꞌọnwụ bile.
53
Mgbe Jisọs sitere nꞌọnwụ bile, ndị ahụ sitere nꞌọnwụ bilie hapụrụ ili ha bata Jerusalem. Ọtụtụ ndị mmadụ hụkwara ha.
54
Mgbe ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị agha ya nọ nꞌebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe nile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nꞌezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
55
Ọ dị ọtụtụ ụmụ nwanyị si Galili soro Jisọs na-enyere ya aka. Ha nọ ebe dị anya na-ele ya anya nꞌelu obe.
56
Nꞌime ha bụ Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Josef, na nne Jemes na Jọn bụ ụmụ Zebedi.
57
Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef, onye bụkwa otu nꞌime ndị na-eso Jisọs,
58
jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere ike ka e were ozu Jisọs nye Josef.
59
Josef buuru ozu Jisọs, were ezi akwa ọcha na-enwu enwu kee ya.
60
O nyibere ya nꞌili nke aka ya, bụ nke o gwuru ọhụrụ nꞌime nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kwachie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.
61
Meri Magdalini na Meri nke ọzọ nọdụkwara ala na-ele ili ahụ anya.
62
Nꞌechi ya, nke bụ abalị isii nꞌizu ụka, ndị isi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet.
63
Ha gwara Pailet sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nꞌọnwụ bile mgbe ụbọchị atọ gasịrị.
64
Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị chee ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ahụ ya. Ka ha ghara ịsịkwa na o sitela nꞌọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”
65
Pailet zara ha sị, “Werenụ ndị nche unu, ndị na-eche nche nꞌụlọ nsọ ukwu unu, ka ha gaa chezie ili ahụ dị ka unu si chọọ.”
66
Ya mere, ha gara mechizie ọnụ ili ahụ nꞌụzọ dị iche iche. Ha kakwasịrị akara dị iche iche nꞌelu nkume ahụ. Ndị agha guzokwara nꞌakụkụ ya nile na-eche nche.
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 28 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28