bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 4
Matthew 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 5 →
1
Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisos baa nꞌọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.
2
Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, Jisọs nọrọ na-erighị nri ọ bụla. Agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
3
Mgbe ahụ ekwensu bịara nwaa ya ọnwụnwa sị ya, “Ọ bụrụ nꞌezie na ị bụ Ọkpara Chineke meenụ ka nkume ndị a ghọọrọ gị nri.”
4
Ma Jisọs sịrị ya, “Lee, akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ nanị site nꞌirube isi nꞌokwu Chineke ka mkpụrụ obi mmadụ ga-eji dị ndụ, ọ bụghị site nꞌiri nri.”
5
Ọzọ, ekwensu duuru ya gaa guzo nꞌebe dịkarịsịrị elu nke ụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem sị ya,
6
“Site nꞌebe a tụda onwe gị igosi na ị bụ Ọkpara Chineke. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọta gị. Ha ga-echebe gị, ka ị ghara ịmerụ ahụ.’ ”
7
Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ”
8
Ọzọ, ekwensu kpọọrọ ya gaa nꞌelu ugwu dị elu, gosi ya ụwa nile na ịma mma ya.
9
Ọ sịrị Jisọs, “Aga m enye gị ha nile ma ọ bụrụ na ị daa nꞌala kpọọ isi ala nye m.”
10
Ma Jisọs zara sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ nanị Onyenwe gị Chineke ka ị ga-akpọ isi ala nye, nanị ya kwa ka ị ga-efe.’ ”
11
Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere Jisọs inyere ya aka.
12
Mgbe Jisọs nụrụ na e jidela Jọn omee baptizim, ọ hapụrụ Judia laghachi Galili gaa biri na Nazaret.
13
Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm. Kapanọm bụ obodo dị nꞌakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nꞌoke ala Zebulọn na Naftali.
14
Nꞌụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sị,
15
“Ala Zebulọn na Naftalị, nke dị nꞌakụkụ osimiri Jọdan na Galili, ebe ọtụtụ ndị mba ọzọ bi. Nꞌebe ahụ,
16
ndị nọ nꞌọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị nọ nꞌala ọnwụ ka ìhè ahụ nwukwasịrị.”
17
Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, sitenụ na mmehie unu bịakwute Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe na-abịa nso.”
18
Otu ụbọchị, mgbe Jisọs na-agafe nꞌakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pita, na Anduru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ igbu azụ, ebe ha nọ nꞌụgbọ mmiri na-egbu azụ.
19
Jisọs sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
20
Ha hapụrụ ngwa ọrụ ha otu mgbe ahụ soro ya.
21
Mgbe ọ gara nꞌihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemes na Jọn, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nꞌime ụgbọ mmiri na-emezi ihe ha ji egbu azụ. Jisọs kpọkwara ha.
22
Otu mgbe ahụ ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
23
Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche.
24
Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile.
25
Ọtụtụ mmadụ na-eso ya ebe nile ọ bụla ọ na-aga. Ndị sitere Galili, na Dekapolis, na Jerusalem, na Judia, na ọ bụladị nꞌofe osimiri Jọdan, bịara soro ya.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28