bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 18
Matthew 18
Igbo 1988
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 19 →
1
Nꞌoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ onye nꞌetiti anyị ga-enwe ọnọdụ dị ukwuu karịa ndị ọzọ nꞌalaeze eluigwe?”
2
Jisọs kpọrọ otu nwantakịrị ka ọ bịakwute ya. O mere ka nwanta ahụ guzo nꞌetiti ha.
3
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị abata nꞌime alaeze eluigwe.
4
Onye ọ bụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.
5
Onye ọ bụla naabatara nwantakịrị dị otu a nꞌihi m, bụ onye nabatara m, na onye lezikwara m anya.
6
Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee ka otu nꞌime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, daa mba nꞌokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume nꞌolu, tụnye ya nꞌoke osimiri ka mmiri rie ya.
7
“Ahụhụ dịrị ụwa nꞌihi mmehie nile dị nꞌime ya. Ọnwụnwa na-eduba mmadụ ime ihe ọjọọ na-adị oge nile. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ na-ewetara ibe ya ihe ọnwụnwa.
8
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị ga-eme ka i mehie, gbupụ ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-abanye nꞌalaeze eluigwe na-enweghị ụkwụ na aka, karịa na ị ga-enwe aka na ụkwụ ma banye nꞌọkụ ala mmụọ.
9
Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị ga-eme ka ị mehie, ghụpụta ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-eji otu anya banye alaeze eluigwe karịa na ị ga-enwe anya abụọ, banye nꞌọkụ ala mmụọ.
10
“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile.
11
Nꞌihi na mụ, Nwa nke mmadụ, bịara ịzọpụta ndị furu efu.
12
“Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nꞌime ha akapfuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị ahapụ iri atụrụ toolu na toolu fọdụrụ pụọ jegharịa nꞌugwu na ndịda nile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?
13
Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-aṅụrị ọṅụ nꞌihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ toolu na toolu ndị nọ nꞌụlọ.
14
Otu a ka ọ dịkwa nꞌebe Nna m nọ; ọ bụghị ọchịchọ ya na otu nꞌime ndị a dịkarịsịrị nta ga-ala nꞌiyi.
15
“Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.
16
Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya.
17
Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke.
18
Nꞌezie, asị m unu, na ihe ọ bụla unu kere agbụ nꞌụwa, e keela ya rị agbụ nꞌeluigwe. Ihe ọ bụla kwa unu tọpụrụ, a tọpụkwala ya rị nꞌeluigwe.
19
“Ana m agwa unu nke a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nꞌetiti unu ekwekọọ nꞌụwa banyere ihe ọ bụla unu na-arịọ nꞌekpere, Nna m bi nꞌeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.
20
Nꞌihi na ebe ọ bụla mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara nꞌaha m, mụ onwe m nọ nꞌetiti ha.”
21
Mgbe ahụ Pita bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onywenwe anyị, ọ bụ ugbo ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ̀ bụ ugbo asaa?”
22
Jisọs zara sị ya, “Ọ dịghị, ọ bụghị ugbo asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa uzọ asaa.
23
“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị na-ejere ya ozi gụzie ego ya ha ji.
24
Mgbe ha malitere na-apịazi, a kọtaara eze ahụ otu nꞌime ndị ohu ya ji ya ụgwọ ruru nde naịra abụọ.
25
Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Eze ahụ nyere iwu ka e refuo ya na nwụnye, na ụmụ ya, na ihe nile o nwere, nꞌihi ụgwọ o ji.
26
“Ma nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu eze ahụ, gbuokwa ikpere ya nꞌala rịọọ eze ahụ arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachi obi nꞌebe m nọ. Aga m akwụghachịkwa gị ụgwọ nile m ji gị.’
27
“Eze ahụ jupụtara nꞌọmiko nꞌebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.
28
“Ma mgbe ohu ahụ sitere nꞌihu eze ahụ pụọ, o jekwuuru otu nwoke ji ya ụgwọ otu puku naịra. O jidere ya nꞌaka ike, machie ya aka nꞌakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a!’
29
“Nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Biko enyi m, nwee ntachi obi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’
30
“Ma nwoke ahụ e ji ụgwọ achọghị ichere! O jidere nwoke ahụ, tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji ya.
31
“Mgbe ndị enyi nwoke ahụ e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụrụ ihe mere enyi ha, ha jekwuuru eze ahụ, kọọrọ ya ihe nile ha hụrụ.
32
Eze ahụ kpọrọ nwoke a, nke ọ gbaghara ụgwọ nile o ji na mbụ sị ya, ‘Ajọ ohu! Nꞌebe a ka m nọ gbaghara gị.
33
Ebe m gbaghara gị ụgwọ i ji m, o kwesịghị ka i nwee obi ebere nꞌebe ndị ọzọ nọ, dị ka m si nwee obi ebere nꞌebe ị nọ?’
34
“Mgbe abụ, eze ahụ oke iwe juru obi, zipụrụ nwoke ahụ ka a taa ya ahụhụ, tutuu ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji, na-afọdụghị otu kobo.
35
Otu a ka Nna m bi nꞌeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị ụmụnne unu.”
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 19 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28