bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 19
Matthew 19
Igbo 1988
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 20 →
1
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judia, nke dị ma a gafee osimiri Jọdan.
2
Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nꞌetiti ha.
3
Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ iji ịnwa ya sị, “O ziri ezi nꞌiwu na nwoke ga-agbara nwụnye ya achọkwaghị m nꞌihi ihe ọ bụla?”
4
Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu adịghị agụ akwụkwọ nsọ? Nꞌime ya ka e dere sị, ‘Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.
5
Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya rapara nꞌahụ nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.’
6
Ya mere, ha abụọ ga-abụ otu onye. Ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ. Ya mere, ihe ahụ Chineke jikọtara ọnụ onye ọ bụla atọsala ya.”
7
Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere Mosisi ji nye iwu sị na nwoke ọ bụla nwere ohere ide akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya?”
8
Jisọs zara sị ha, “Mosisi mere nke a nꞌihi na ọ chọpụtara na obi unu siri ike ịnabata ozizi Chineke. Ma site na mbụ Chineke enyeghị iwu dị otu a.
9
Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
10
Ndị na-eso ụzọ Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwụnye ma ọlị.”
11
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ nile ga-anagide okwu a. Nanị ndị Chineke nyere ike ime ya ga-anagide ya.
12
Ụfọdụ ka a mụrụ dị ka ndị na-enweghị ike ịmụta nwa site nꞌafọ nne ha. Ndị ọzọ dịkwa, ndị jiri aka ha họrọ na ha agaghị amụta ụmụ nꞌihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla pụrụ ịnagide okwu a, ya nagide ya.”
13
Mgbe ahụ e kuteere Jisọs ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba sị, “Unu esogbula Onyenwe anyị.”
14
Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”
15
Jisọs bikwasịrị ha aka nꞌisi gọzie ha nile tupuu ọ hapụ ha pụọ.
16
Otu nwoke bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”
17
Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ banyere ihe ziri ezi? Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye. Ọ bụrụ na ị chọrọ iketa alaeze eluigwe gaa debe iwu nile Chineke nyere.”
18
Nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara sị ya, “Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.
19
Sọpụrụ nna gị na nne gị. Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.”
20
Nwoke ahụ sịrị ya, “Iwu ndị a ka m deberela siterị na mgbe m dị na nwanta. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?”
21
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuru oke nꞌezie, laa nꞌụlọ gị ree ihe nile i nwere. Nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ na ụba nꞌeluigwe. Bịakwa soro m.”
22
Mgbe nwoke ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ọ lara na mwute, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya.
23
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke.
24
Nꞌezie asị m unu, ọ dịrị inyinya mfe ịgafe nꞌanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nꞌalaeze Chineke.”
25
Okwu a Jisọs kwuru mere ka egwu tụọ ndị na-eso ụzọ ya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
26
Jisọs legidere ha anya sị ha, “E jiri anya mmadụ lee ya ọ bụ ihe siri ike. Ma nꞌebe Chineke nọ ọ dịghị ihe rara ya ahụ ime.”
27
Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe nile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?”
28
Jisọs zara sị ya, “Mgbe mụ bụ nwa nke mmadụ ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze ebube m, nꞌalaeze ahụ, nꞌezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ Izirel ikpe.
29
Onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nna ya na nne ya, na nwụnye ya, na ụmụntakịrị ya, ma ọ bụ ala o nwere, soro m, ga-anata ụgwọ ọrụ karịrị ihe ọ hapụrụ. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.
30
Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ bido ugbu a, ga-abụ ndị ikpeazụ.”
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 20 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28