bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 9
Matthew 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 10 →
1
Jisọs banyekwara nꞌụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo na Kapanọm.
2
Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”
3
Ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulukwanụ Chineke.”
4
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ jụrụ ha ajụjụ sị ha, “Gịnị mere echiche ọjọọ ji jupụta unu obi?
5
Olee nke karịrị ịdị mfe ikwu? Ọ bụ ịsị na a gbagharala nwoke a mmehie ya, ka ọ bụ ịsị ya bilie gaa ije?
6
Ma ime ka unu mata na m nwere ike ịgbaghara mmadụ mmehie ya nꞌụwa a, ana m asị gị, nwoke, bilie, chịrị ute gị laa!”
7
Onye ọrịa ahụ biliri, chịrị ute ya laa nꞌụlọ ya!
8
Mgbe ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe Jisọs mere, akpata oyi pụrụ ha nꞌahụ nꞌihi egwu. Ha toro Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ike dị otu a.
9
Mgbe Jisọs si nꞌebe ahụ pụọ ịga nꞌihu nꞌije ya, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọ nꞌụlọ ebe ọ nọ na-arụ ọrụ ịnakọta ụtụ. Jisọs kpọrọ ya sị ya, “Soro m bịa bụrụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ m.” Na-atụfughị oge Matiu hapụrụ ihe nile soro ya.
10
Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌụlọ Matiu iri nri. Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie sooro Jisọs nọdụ na-eri nri.
11
Mgbe ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị a na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”
12
Mgbe Jisọs nụrụ ajụjụ ha, ọ zara sị ha, “Mkpa dibia adịghị akpa ndị ahụ dị mma. Kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibia na-akpa.
13
Ma gaanụ chọpụta ihe akwụkwọ nsọ chọrọ ka unu mụta mgbe ọ sịrị, ‘Achọghị m aja unu, kama achọrọ m ka unu nwee obi ebere.’ Unu chọpụta ya, unu ga-aghọta na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ime ka ndị mmehie si na mmehie ha chegharịa.”
14
Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?”
15
Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “O kwesịrị ka ndị enyi onye na-alụ nwụnye ọhụrụ nọọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
16
“Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-adụkọta akwa ochie na nke ọhụrụ. Nꞌihi na akwa ahụ ga-esi nꞌebe a dụrụ ya dọwaa, mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
17
Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ochie nꞌihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-eche ha abụọ nke ọma.”
18
Mgbe Jisọs nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịara kpọọ isi ala nye ya sị ya, “Ọ dịbeghị anya kemgbe nwa m nwanyị nwụrụ. Ọ bụrụ na ị ga-abịa metụ ya aka ọ ga-ebili dịrịkwa ndụ ọzọ.”
19
Nꞌihi nke a, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya biliri soro nwoke ahụ malite ịga nꞌụlọ ya.
20
Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nꞌọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa ịgba ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nꞌazụ bịaruo Jisọs nso, metụ ọnụ uwe ya aka.
21
Nꞌihi na o kwuolarị nꞌime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ uwe ya aka ahụ ga-adị m mma.”
22
Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, atụla egwu, nꞌihi na e sitela nꞌokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nꞌoge ahụ.
23
Emesịa, Jisọs rutere nꞌụlọ onyeisi ndị Juu ahụ ebe ọ hụrụ ndị bịara ịkwa akwa na ndị na-abụ abụ olili ozu.
24
Jisọs gwara ha okwu sị ha, “Pụọnụ nꞌezi, nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra.” Mgbe Jisọs kwuru okwu a, ndị nọ nꞌebe ahụ chịrị ya ọchị.
25
Ma mgbe ndị nọ nꞌebe ahụ pụrụ dị ka a gwara ha, Jisọs banyere nꞌụlọ ebe nwanta nwanyị ahụ dina. O jidere ya nꞌaka, selite ya elu. Nwanta nwanyị ahụ dịkwara ndụ ọzọ.
26
A kọrọ akụkọ ọrụ ebube a nꞌebe nile nꞌobodo ahụ.
27
Mgbe Jisọs hapụrụ ụlọ ebe o mere ka nwanta nwanyị ahụ site nꞌọnwụ bilie, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru isi sooro ya. Ha tikuru ya na-asị, “Nwa Devidi, meere anyị ebere!”
28
Ha sooro Jisọs bata nꞌụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kweere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “Ee, Onyenwe anyị, anyị kweere.”
29
Jisọs metụrụ ha aka nꞌanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.”
30
Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha agwakwala onye ọ bụla.
31
Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe nile nꞌobodo ahụ.
32
Mgbe ndị a sitere nꞌebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere Jisọs nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nꞌime ya.
33
Mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ nꞌahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a na ndụ anyị nile.”
34
Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya ike ime ihe ndị a nile.”
35
Jisọs jegharịrị nꞌobodo nile dị nꞌebe ahụ, ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ. Ebe ọ bụla ọ gara, ọ gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche ndị mmadụ na-arịa.
36
Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ nile na-abịakwute ya, o nwere ọmiko nꞌahụ ha, nꞌihi na ha bụ ndị a na-esogbu, ndị na-enweghị onye inyeaka, ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.
37
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Lee na mkpụrụ obi a ga-eritere Chineke nꞌuru dị ukwuu. Ma ndị ga-ezisa ozi ọma bụ nanị mmadụ ole na ole.
38
Ya mere, kpeerenụ Chineke ekpere ka o zite ndị ọrụ ga-abịa nꞌubi a irite mkpụrụ obi ndị mmadụ nꞌuru.”
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28