bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 3
Matthew 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 4 →
1
Nꞌoge mgbe ahụ, Jọn omee baptizim bidoro ikwusa okwu Chineke nꞌọzara Judia. Isi okwu ya bụ,
2
“Chegharịanụ, bịakwutenụ Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe dị nso.”
3
Aịzaya onye amụma gbararị ama banyere ọrụ Jọn mgbe o buru amụma sị, “O nwere onye na-eti mkpu nꞌọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ Onyenwe anyị, meenụ ka okporo ụzọ ya dị larịị.’ ”
4
Jọn yi uwe e ji ajị inyinya kamel mee. O kekwara akpụkpọ anụ dị warara nꞌukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ anụ.
5
Nꞌoge ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ, ndị sitere Jerusalem na ndị si nꞌakụkụ Jọdan, na obodo ndị ọzọ na Judia, bịara ige ya ntị.
6
Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha nile, o mere ha baptizim nꞌosimiri Jọdan.
7
Ma mgbe ọ hụrụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha bịara ka e mee ha baptizim, o bidoro ịkọcha ha sị, “Unu ụmụ ajụala, onye si unu gbanarị iwe Chineke nke na-abịa?
8
Tupuu e mee unu baptizim, zipụtanụ nꞌomume unu na unu echegharịala.
9
Unu echekwala nꞌobi unu na ọ dịrị unu mfe ịsị, ‘Anyị bụ ụmụ Eberaham’, nꞌihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Eberaham ụmụ.
10
Lee ugbu a, mma iwe Chineke adịla nꞌukwu osisi ọ bụla nke na-adịghị amị mkpụrụ ọma. A ga-egbutukwa ya, kpọọ ya ọkụ.
11
Ana m eme nanị ndị chegharịrị site na mmehie ha baptizim, ma onye ka m ukwuu na-abịa. Ọ dị nnọọ ukwuu na etorughị m ibu akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.
12
Ọ ga-ekewapụ ezi mkpụrụ ọka site nꞌigbugbo ọka. Ọ ga-afụchapụ igbugbo ọka ahụ, zakọtaa ha, kpọọ ha ọkụ ebighị ebi. Ma ọ ga-edozikwa mkpụrụ ọka ndị dị mma.”
13
Mgbe ahụ, Jisọs sitere Galili bịa nꞌosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim.
14
Ma Jọn achọghị ime nke a. Ọ sịrị Jisọs, “Ọ bụghị m kwesịrị ime gị baptizim, gịnị mere i ji bịakwute m ka m mee gị baptizim?”
15
Ma Jisọs zara sị ya, “Biko mee m baptizim, nꞌihi na ọ dị mma ime ihe Chineke chọrọ.” Jọn mere ya baptizim.
16
Mgbe Jisọs sitere na mmiri ahụ pụta, lee, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ Chineke ka o si nꞌelu fedata dị ka nduru bekwasị Jisọs nꞌisi.
17
Nꞌotu oge ahụ kwa, olu sitere nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, nke m hụrụ nꞌanya. Ihe ya dị m ezi mma.”
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28